Sunday Igboho released: Atọhapụla Sunday Igboho nwa mgbe nta

Ebe foto si, Sunday Idogho
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na atọhapụla Sunday Igboho nke ezigbo aha ya bụ Sunday Adeyemo, bụ onye e ji eji kemgbe na Benin Republic.
Dịka akụkọ si kwuo, a tọhapụrụ ya nwa mgbe nta ka o nwee ike ịga ụlọọgwụ nweta ọgwụgwọ, ma hanye ya n'aka Banji Akintoye bụ onyeisi Ilana Omo Oodua Worldwide - otu n'ime otu ndị na-achọ nnwereonwe ndị Yoruba.
Wale Adeniran bụkwa osote Akintoye sokwa na ndị nabatara Igboho bụ onye ha kwekọrịtara na ọ gaghị ahapụ ụlọọgwụ maọbụ Cotonou gawa ebe ọzọ maọlị.
Yomi Aliyu (SAN) bụ ọkaiwu nke Sunday Igboho gwara BBC na ọ bụ eziokwu na atọhapụla ya, otu onye sokwa mee ka ntọhapụ ya dị ire bụ Ọkammụta Wole Soyinka.
Cheta na ụlọọrụ DSS wakporo Igboho na ụfọdụ ndị otu ya n'ụlọ ya n'Ibadan, Oyo steeti, n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị afọ 2021.
Igboho bụ onye na-achọ nnwereonwe Yoruba Nation n'aka Naịjiria, gbapụrụ gbaga mba Benin Republic - dịka ndị DSS kwuru na ha na ọ bụ onye a na-achọ achọ maka "ịtụkọ ngwaagha ọ ga-eji kwasaa udo Naịjiria" - bụ ebe a nwụchiri ya n'ọdọụgbọelu ka ọ na-achọ ịba ụgbọelu na-aga mba Germany, n'ụbọchị 19 nke ọnwa Julai afọ 2021.
Igboho agọọla ụkwụ na aka ya na enweghi mgbe o ji tụkọ ngwaagha ọbụla.
A tụbara ya na mkpọrọ na Benin Republic dịka a na-ekpe ya ikpe maka ihe gbasara ịda iwu njem nakwa ihe ndị ọzọ.
A na-etinye ihe ọhụrụ n'akụkọ a mere ugbua mana a ga-egosipụta ya n'uju n'oge nadighị anya. Biko mepegharịa ihuakụkọ a maka akụkọ zuruoke.









