Sunday Igboho: Ihe ụlọikpe kpebiri maka mmadụ 12 ndị otu ya e ji eji

Ebe foto si, Sunday Adeyemo/Insta
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ụlọikpe Ukwu n'Abụja atọhapụla ụmụazụ Sunday Adeyemo bụ onye ana etu Sunday Igboho.
Ọkaiwu ukwu bụ Obiora Egwuatu sị ka DSS hapụ mmadụ iri na abụọ ahụ ka ha sị n'ụlọ na-abịa ikpe na mkpanaka dị iche iche.
Ndị a atọhapụrụ bụ ndị ya na Sunday Igboho na-azọ nwereonwe ndị Yoruba.
Ụlọikpe sịrị na mmadụ asọtọ ndị nke mba ga-eji nde Naịra ise (N5,000,000) gbara isi onwe ha ebe mmadụ anọ ana ekpe ikpe ọchụ ga-eji nde Naịra iri (N10,000,000) gbara isi onwe ha.
DSS nwuchiere ndị a mgbe ha wakpọrọ ụlọ Sunday Igboho n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julai bụ ebe ha gbagburu mmadụ abụọ ndị otu ha n'Ibadan, isiobodo Oyo steeti.
Cheta na Ọkaikpe Obiora Egwuatu nyere DSS iwu ka ha kpọpụta ndị ụlọikpe maka ịmalite ikpe ha.
N'ụlọikpe taa, DSS kwere ụlọikpe nkwa na ha ga-ahụ mmadụ asatọ n'ime ndị a ma rịọkwa ka mmadụ anọ ndị ọzọ ka nọrọgodi n'ụlọmkpọrọ ha dịka ha na-enyocha ha.
Ka ana ekwu nke a, ụlọikpe ọzọ n'Oyo steeti nyere iwu machiri DSS ịnwuchi Sunday Igboho bụ onye nọ n'isi agha nwereonwe ndị Yoruba.
Ụlọikpe ahụ nyekwara DSS na Onyeisi ndị ọkaikpe Naịjriịa iwu ka ha ghara ịmachi ụlọakụ ya maọbụ majaa ya n'ụzọ ọbụla.









