Sunday Igboho: Ihe e jibu kpụpụ onye ndu Yoruba Nation ụlọikpe Benin Republic dị iche na ihe ha ji tinye ya na nga- Salami, ọkaiwu ya

Sunday Adeyemo na Ibrahim Salami, ọkaiwu ya.

Ọkaiwu Sunday Igboho bụ Ibrahim David Salami, ekwuola na okwu agbanweela na ihe e jiri jidebuo Sunday Igboho na mba Bene na ihe ndị ọkpaike mba ahụ ji tunye ya na mkpọrọ ugbua.

O kwụkwara na ikpe a bịara n'ụlọikpe Bene ụbọchị Monde (26/7/20121), o nweghị onye nọchitere anya Gọọmentị Naijiria na ikpe onye ndu otu 'Yoruba Nation' bụ Sunday Adeyemo a ma dịka Sunday Igboho.

Salami, onye bụkwa ọnụ na-ekwuru Igboho kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Yoruba nwere ụbọchị Tuzde.

"Naijiria enweghị onye ha zitere n'ụlọikpe. Anyị ahụghị akwụkwọ ọbụla sị Gọọmentị Naijiria nke sị ka a kpụlata Sunday Igboho. Nanị ihe anyị hụrụ bụ ikpe Sunday na mba Bene."

Salami kwuru na ọ bụ ndị ọkaikpe atọ bụ ndị a kpụpụtara Sunday Igboho n'ihe ha; nke mbụ bụ ọkpaikpe butere ikpe nke Bekee kpọrọ 'prosecutor; nke abụọ bụ Ọkpaikpe na-eme nnyocha na ọkaikpe nwere ikpe ikwu ma a ga-ebute mmadụ n'ụlọmkpọrọ maọbụ tọhapụ ya.

Kedụ iwu ha sị na ọdara n'ezie?

"Ihe gbagwojuru m anya bụ ụdị ihe m ahụbeghị mbụ n'ọrụ dịka ọkaiwu bụ na oge mbụ ha jidere ya (Sunday Igboho), ihe ha kwuru ha ji jide ya bụ na ọ daara iwu na Naijiria, sị na ọ bụ iwu ọ dara mere ka Gọọmentị Naijiria ji sị ka e jide ya. Nke a bụ ihe anyị gbadoburu ụkwụ were na-arụ ọrụ."

"Mana oge anyị rutere n'aka ọkaikpe butere ikpe, o kwuru na o nweghị iwu Bene Igbogho dara na Bene, na ọ daghị iwu asambodo njirimara adịgboroja."

"Na ihe mere ha ji jide ya bụ iwu ọ dara na Naijiria na Gọọmentị Naijiria sị ka e jide ya."

"Mana mgbe anyị ruru n'aka ọkaikpe nke na-eme nnyocha, ya sị na ọ bụghị ihe a nke 'Prosecutor' kwuru bụ iwu ọ daara."

" Na ya na ndị ekperima kpara nkata o were si ụzọ azụ ụlọ bata na Bene nakwa na ọ chọrọ ibute ọgbaghara n'obodo ha."

"Mana Sunday Igboho gwara ha na Naijiria akpọnụghị ya n'ụlọikpe, n'otu aka ahụ na ya ejebeghị na mkpọrọ ndị uweojii."

" Na ihe ya mere bụ ịkpọ ọgbakọ iji hazi esemokwu dị n'etiti na ndị Yoroba na ndị Fulani ọchịehi."

Salami kwuru na ọ gbara ha gharị na ọ bụghị okwu ha ji aka gawa ịnọchite Igboho na Bene bụ ihe e jizi tụnye ya na mkpọrọ mba ahụ.

Ọ kọwara na ọkaikpe ahụ jụrụ Sunday Igboho mgbe o jiri bia Bene, ya asa ya sị, na ya hapụrụ Naijiria n'abalị ụbọchịụka, rute Bene ụbọchị Monde.

"Ọ bụ n'abalị Monde ahụ ka ya gara ịzụta akwụkwọ njem ị ga mba Jamini.

"Ọkaikpe ahụ jụrụ ya, kedụ be onye ọ lahụrụ, onye bugara ya ọdọụgbọelu?"

Ọkaikpe ahụ kwuru na ya na ndị mmadụ jịkọrọ aka mee mpụ na mba Bene.

"Ihe ọhụrụ ha ji jide ya bụ na o daara iwu na Bene, ya mere ka ha ji enyocha ihe o mere nakwa ndị ya na ya jikọrọ aka."

"Ha ji jide ya ma nye iwu ka etinye ya na mkpọ iji nyochaa ihe o mere nakwa ndị ya na ya kpara nkata ahụ."

"Ọ gbawara anyị gharịị n'ihi na ọ bụ naanị otu abalị ka ọ nọrọ dịka o si Bene na-aga Jamini."

"Ihe anyị kwadoburu ịgba mbọ ịhụ na Sunday Igboho agaghị mkpọrọ maka ebubo na ihe mere na Naijiria mana ugbua anyị hụrụ na ọ bụghị ihe anyị chere na ọ bụ ihe ọzọ ka a na-ebo ya."

O kwuru na ọ bụ ma ọkaikpe nnyocha chochaa okwu ahụ ka a ga-ebizi ikpe n'okwu ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: