Ipob/ESN commander arrest: Ọ bụghị isi a hụrụ kwaba okpu na ESN ka ndị agha nwụchiri - Ipob

Ebe foto si, AFP
Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ndị agha nwụchiri otu isi a hụrụ kwaba okpu na Eastern Security Network (ESN) n'Anambra steeti dịka ha si kwuo.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na nwoke ahụ a ma dịka Udubuan Sage Chibueze bụ onye Ipob, mana ọ bụghị onye otu ESN nke o ji abụ otu n'ime ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ime ya dịka ndị agha na-ebo ya.
N'ozi Emma Powerful ziputara, o boro ndị agha Naịjiria ebubo na ha gara ebe Chibueze na-eme emume akwamozu nne ya, gbaa ya egbe n'ụkwụ ma nwụrụ ya pụọ.

Ebe foto si, Getty Images
O bokwara ndị agha ebubo ịmanye Chibueze ka o yiri uwe ndị agha ka ọ dị ka ọ bụ ihe o yi mgbe ha nwụchiri ya, ma bokwa ha ebubo ikwu na ha chọtara egbe n'aka ya.
Emma Powerful kwuru na ndị otu ESN anaghị eyi uwe ndị agha maọbụ ndị uweojii ma ya fọdụzịa ibu egbe 'pump action'.
Nke a na-abịa dịka ya bụ akụkọ fegharịrị na soshal midia na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri Udubuan Sage Chibueze maka ịbụ onye ESN.
Cheta na ndị agha Naịjiria eziputabuola ozi na Facebook ha sị na uche ha dị ya n'etu ndị Ipob/ESN si efesa akụkọ ụgha iji me ka ha bụrụ ndị a ka kpụ n'ọnụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Ha sị na n'agbanyeghi na ndị agha Naịjiria anaghị atụpụrụ ụdịrị akụkọ ụgha a ọnụ, na
Mbọ BBC Igbo gbara inweta Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti nakwa Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjiria amịtaghị mkpụrụ dịka ha ebughi ekwentị ha.










