Nnamdi Kanu: Lee ihe ndị Archbishop, Bishop, nakwa eze ọdịnaala ala Igbo na-eme iji kpọpụta nwamadi a

Otu jịkọtara ndị igwe nakwa ndị nnọchite anya ndị Archbishops and Bishops n'ala Igbo egosila nwute ha gbasara enweghị ezi nchekwa n'ọwụwa anyanwụ ugbua nke ha kwuru buterela oke ihe isike nye ndị bi ebe ahụ.
N'akwụkwọ ozi ha nyere ndị ntakụkọ taa, ha na-arịọ ka gọọmenti etiti na ndị ọnụ na-eru n'okwu jiri mkparịtaụka wee dozie okwu ọbụla dapụtara nso nso a na mpaghara ahụ ka udo wee chịa.

Ebe foto si, BBC /Valaria na Opoko Facebook
Ihe ndị ọzọ ha kwuru gụnyere:
- Anyị ka na-ekwukwa ka atọhapụ Nnamdi Kanu ma kpọnye anyị bụ otu "South East Council of Traditional Rulers and the Representatives of Igbo Archbishops and Bishops.". Ha kwuru na mkpọpụta Kanu ga-eme ka ọgbaghara na-eme n'ala Igbo belata.
- Ha kwuru ka onyeisiala Muhamadu Buhari wepụ aha otu Indigenous People of Biafra(Ipob) dịka otu na-eyi ndụ egwu ma kpọpụta ndị otu ahụ e ji n'ụlọmkpọrọ dị iche iche na Naịjirịa.
- Ha kwuru ka gọmenti etiti wepụ ndị agha na mpaghara ọwụwa anyanwụ makana o nweghị uru ọnọdụ ha ebe ahụ bara ugbua kama ọ na-ebute ọtụtụ nsogbu.
- Ha kwuru ka gọọmenti etiti lebanye anya n'etu e si emegbu ndị Igbo. Ha kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti etiti emeghị ndị Igbo ihe ha mere ibe ha, ndị ntoroọbịa ka ga na-enye nsogbu n'ala Igbo.
- N'ọnụ ha, " anyị ga-agakwuru onyeisiala Naịjirịa maka mparịtaụka ka e wee mara etu a ga-esi wee kpọpụta Nnamdi Kanu
- Ha kwuru na ha na-ekwe ndị ntorobịa nkwa na ha anụla olu ha ma na-arịọ ha ka ha kwụsị ihe na-ebute ọgbaghara iji wee mee ka mkparịtaụka ha na onyeisiala Naịjirịa gaa nkeọma.
- Ha kwuru ka Ipob ghara ime ọbụla ga-egbochi ntuliaka nke gọvanọ na-abịanụ n'Anambra steeti ma kagbuo iwu nnọrọ n'ụlọ ọbụla ha tinyere maka ihe isi ike nke a buterela.
Na nchịkọta, ha riọrọ ndị nille na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti ka ha gbara mkpaso ọgbaghara ọsọ ma gbado anya na ntụliaka na-enweghị ntụpọ ọbụla.
Lee ndị niile binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ.
H.M. Igwe Charles Mkpuma
Chairman,
Ebonyi State Trad. Rulers Council &
Chairman,
South East Council of Traditional Rulers.
H.M. Eze Joseph N. Nwabeke
Chairman,
Abia State Trad. Rulers Council
H.M. Obi Nnaemeka Achebe, CFR
Chairman,
Anambra State Trad. Rulers Council
H.M. Igwe Amb L. O. C. Agubuzu, OON
Chairman,
Enugu State Trad. Rulers Council
H.M. Eze Dr. E. C. Okeke
Chairman,
Imo State Trad. Rulers Council
Most Rev. Dr. Anthony J. V. Obinna
Catholic Archbishop of Owerri
Most Rev. Dr Emmanuel O. Chukwuma, OON
Anglican Archbishop of Enugu
Most Rev. Dr. Chibuzo R. Opoko, TFG, DOB, JP
Methodist Archbishop of Umuahia
Most Rev. Dr. Valerian M. Okeke
Catholic Archbishop of Onitsha
Most Rev. Dr Uma A. Onwunta
Past Principal Clerk Presbyterian Church Nigeria
Bishop Obi Onubogu
Pentecostal Fellowship of Nigeria
Rev. Dr. Abraham Nwali
Chairman, CAN, South East Zone









