Communal Clash: Olee mgbe igbu mmadụ na ịgba ụlọ ọkụ ga-akwụsị n'Oruku Enugwu Steeti?

Oruku dí na steeti
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service

Oruku bụ obodo dị na okpuru ọchịchị Nkanụ East nke dị n'Enugwu Steeti.

O ruola ihe karịrị afọ iri na atọ Obodo Oruku na agbata obi ha bụ Ụmụode nọ na ịzọ ala na ịlụ ọgụ nke tagoro ọtụtụ isi mmadụ ma mebikwaa ọtụtụ ụlọ obibi.

Mana ọgụ a na-ada ugbua n'Oruku abụghị nke ha na Umuode kama ọ bụ ọgụ ha na-alụ n'ime onwe ha.

Nsogbu ikpeazu a bidoro na December 2019 oge Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyi nyere Chief Emmanuel Mba akwụkwọ dịka eze na-achị Oruku.

Nkea mere ụfọdụ ndị obodo jiri mebe ngaghari iwe na ha ekweghị na gọmenti Igwe Emma Mba.

Nkpa nkpa kpazịrị na ụbọchị December 26, 2021 oge ndị uwe ojii si Abuja bịara Ịkpụrụ Igwe Emma Mba, ọgbawara ọsọ, nke mere ha jiri gbagbuo ya. Ndị Uwe Ojii ahụ buziri ozu onye Eze ahụ dọta na Mortuary ụlọ ọgwụ Park Lane Enugwu.

Ngwa ngwa Igwe Emma mba nwụrụ ka mgbe December afọ gara aga, ịlụ ọgụ na ịgba ụlọ ọkụ bụzị omenala n'Oruku.

Aha onyonyo, Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ

Ọrụ izizi kọmishịọna uwe ojii ohụrụ Mohammed Aliyu bịara Enugwu na ọnwa January 27, 2021 rụrụ bụ iga njem nleta na obodo ahụ, were anya ya hụrụ na agbaala ụlọ karịrị iri atọ na ọnụ ogụ ọkụ n'Oruku.

Onye jibu ọkwa onyeisi okpuru ochịchị Nkanu East ma bụrụ onye Oruku bụ Ejike Ani gwara kọmishịona Uweojii na ọ bụ ndị na agbaso Igwe Emma mba ngba kpatara ọnwụ ya.

Aliyu kwezịrị nkwa na ya ga -achọpụta ndị gbagburu igwe Emma mba.

Mana ndị ntorobịa ahụ na-akpa ya bụ ike ka gakwara n'ihu na agba ụlọ ọkụ ka ha sịri chọọ.

Ụbọchị wenezde feb 24, 2021 egburu onye ji ọkwa 'vice chairman Oruku town union n'ụlọ ya.

Dịka nchọpụta siri gosi awakporo ya bụ nwoke Samuel Ani n'ụlọ ya were egbe gbagbuo ya.

Aha onyonyo, ‘Mkpamkpa ndị uweojii mere e jiri gbaa ụgbọala ha ọkụ’

N'mbụ rịị gọvanọ Enugwu Steeti Ifeanyị Ugwuanyi ewepụtala kọmetee mmadụ asaa ga emere ya nchọpụta ka a ga-esi kwọọ onye ukwu wara na nsogbu Oruku.

Kọmetee ahụ ka nọ n'Ọrụ ugbua tupu egbuo chief Samuel Ani.

Ka ọ dị ugbua gọvanọ Enugwu bụ Ifeanyị Ugwuanyị atinyela mmachi ngaghari n'obodo Oruku mailte na elekere isii nke ngbede ruo na elekere isii nke ụtụtụ.

Ya bụ mmachị ngagharị malitere na ụbọchị tọzde 25th February 2021.

Otu nwoke onye oruku a na-akpọ Benjamin Odo ya na BBC kpara nkata gwara anyị na ọ bụ ndị kwenyere na ha bụ ndị otu Igwe Emma mba egburu egbu na-agba ụlọ ndị ha hụtara dịka ndị esoghị igwe ahụ ọkụ.

Ọtụtụ ndị Oruku kwara arịrị na ndị bịara be ha gbuo Igwe Emma Mba kwuru na ha bụ ndị uwe ojii mana ha amaghịzị ihe mere ndị ntorobịa ji agba ụlọ ọkụ na-egbu mmadụ na echeghịzị ka ndị otu nchọpụta gọmenti guzobere rụchaa ọrụ ha.

Ị bịa n'Oruku ugbua, ọdịzị ka ebe agbara ọsọ agha makana Oke nọ n'ọsọ, Ngwere nọ n'ọsọ.