DSS na Ipob: Anyị achọghị iji maka Biafra na-akwafu ọbara - Igwe Emene

Aha onyonyo, O nweghị onye Emene so na ndị e gburu n'Emene - Igwe Emene

Igwe Felix Ugwu, bụ eze odịnmala nke obodo Emene dị n'Enugwu steetị gwara BBC ihe ọ ma maka ọgbaghara dara n'etiti ndị DSS na ndị Ipob nke butere ogbugbu mmadụ.

Igwe Ugwu kwuru na ọ nweghị onye Emene so na ndị e gburu na nsogbu ahụ.

Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha jiri nwayọ eso ihe nwere onwe maka ọ bụ ihe ejibu kwafuo ọtụtụ ọbala na gboo.

Ọ sị: "Ya bụrụ na ọ bụ uche Chukwu, anyị ga enweta nkewa Naịjirịa. Ya bụrụ na Chuwku ekweghị, anyị ka ga-anọkwa ebe anyi nọ."

Gee ihe o kwuru n'uju: