Aloy Ejimako: 'Akwụkwọ gosiri ndị Ipob e gburu n'Emene bụ eziokwu'

Aha onyonyo, Ipob Emene: 'Akwụkwọ 'Intersociety' wepụtara maka ndị Ipob e gburu bụ eziokwu'

Ndị ọrụ Orthopaedic Hospital Enugwu ekwuola na enweghị onye ọbụla nọ n'ọnọdụ gbata gbata ekedoro n'elu bed.

BBC gara njem na ya bụ ụlọọgwụ iji chọpụta ma ọ bụ eziokwu na ndị uweojii kedoro otu nwa ikorobia a na enyo enyo na ọ bụ onye IPOB.

Nke a na-bia dịka ozi na efegharị na soshal midia kwuru na ya bụ nwata nwoke bụ Augustine Ani bụ otu na ndị agbara egbe n'ụbọchị August 23 oge ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị uweojii, DSS na IPOB n'Emene Enugwu.

Ọkaiwu Ipob nabatara aha ndị ekwuru nwụrụ n'Emene ewepụtara ọhụrụ a

Ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimako sị na o kwenyere n'akwụkwọ otu a kpọrọ 'International Society for Civil Liberties & the Rule of Law' wepụtara maka ndị Ipob nwụrụ n'Emene.

Ọ sị na otu a bụ otu a ma ama dịka ndị na-eme nyocha nke ọma tupu ha a pụta kwuo maọbụ dee ihe ọbụla.

Ejimako sị na ọ na-atara ozi ahụ n'akara e-mail ma leba ya anya, na ihe niile ha dere bụ eziokwu kama na o zuchabeghi ezu.

Ọ sị na o kwenyere na ya ma kpọọ oku ka ndị Igbo na Naịjirịa niile kwenyere n'akwụkwọ a.

Ọ gara n'ihu katọọ ogbugbu ụmụafọ Igbo n'Emene ma kwuo na ndị aka ha dị na ya ga-ata ahụhụ mgbe oge ruru.

Otu a kpọrọ 'Intersociety' na-ahụ maka ikike dịrị onye wepụtara akwụkwọ ozi bu aha gụnyere aha ndị ha sị na e gburu, a nwuchiri nakwa a na-achọ achọ n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị nchekwa na ndị Ipob n'Emene, Enugwu Steetị.

Akwụkwọ ha a gosiri aha mmadụ isii e gburu egbu nakwa ndị ọzọ ha sịrị na a nwuchiri na ndị na-efu efu.

BBC Igbo ka na-agba mbọ ị chọpụta ihe ndị uweojii nwere ikwu maka aha ndị a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: