Gịnị na-esere ndị Ipob na ndị Afara-Ukwu? Lee ihe anyị ma

Aha onyonyo, Gịnị na-esere ndị Ipob na ndỊ Afara-Ukwu?

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna ekwuola na ndị uweojii amaghị maka akukọ na-efegharị na soshal midia banyere obodo Afara-Ukwu na ọgbaghara metụtara ezinaụlọ Nnamdị Kanụ.

BBC kpọrọ Maazị Ogbonna ịmata etu obodo ahụ si kwụrụ dịka ihe onyonyo pụtara na Facebook ụbọchị Satọde nakwa Sọnde rụtụrụ aka na nsogbu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị dara n'etiti Emmanuel Kanu bụ nwanne onyeisi otu a kpọrọ Indegineous People of Biafra (Ipob) na ụfọdụ ndị obodo ha bụ Afara-Ukwu.

N'agbanyeghị ihe ndị uweojii kwuru, Eze Okwulehie bụ onye eji Eze Afara mara, gwara BBC na ọgbaghara dara n'obodo Esiama Afara Ukwu ụbọchị Satọde nakwa Sọnde dịka Emmanuel Kanu batara obodo ahụ malite iyi ndị mmadụ egwu.

Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na soshal midia na-arụtụ aka na ụfọdụ ọgbaghara a mere, mana ha egosighị ebe Kanu mere ihe ọbụla maọbụ wakpoo onye ọbụla.

Ihe onyonyo "Facebook Live" Eze Okwulehie tinyere n'akara ya na Facebook dị ka o gosiri ebe ụfọdụ ndị Afaraukwu na-eme ngaghari iwe maka okwu ha na ndị ha kpọrọ aha dị ka "Ipob".