Ị nụla maka ọrịa 'Bovine Tuberclosis' na-arịa ehi n'Abia?
Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo n'Abia bụ Ikechi Mgboji adọọla ndị Abia aka na ntị ha ghara iri anụ ngụgụ ehi ọbụla nọ na steeti ahụ ugbua.
O kwuru na ọ bụ ka ha ghara ibute ọrịa ọ kpọrọ "Bovine Tuberclosis" nke a chọpụtara na steeti ahụ ọhụrụ a.
Ọkammụta Mgboji kwuru na ya bụ ọkwa adịla mkpa maka nchọpụta etu ọrịa ahụ si metụta ehi ndị a.
Gịnị bụ 'Bovine Tuberclosis'?

Ebe foto si, Getty Images
Nke a bụ ọrịa otu nje a kpọrọ "Mycobacterium bovis" nke metụtara nje na-ebute ụkwara nta (Tuberculosis) a na-ahụ n'ahụ mmadụ maọbụ nke nnụnụ.
Mgboji kwuru na a chọpụtara ya bụ nje n'izuụka abụọ gara aga n'Aba.
Njirimara ọrịa a
Mgboji kwuru na njirimara ọrịa a bụ ntitu ahụ niile , oke ụkwara na ọnwụ.
Mgboji kwuru na ọrụ ha bụ i site n'aka ndị dọkịta na-elekọta anụmanụ mee nyocha ehi ọbụla akpụpụtara maka ogbugbu nakwa iresi ọha.
N'okwu ya" o nweghị ka ị ga-esi mata ehi orịa a ji karịa igbu ya maọbụ nyochaa ehi ahụ."
"Nke a mere anyị ji sị ndị mmadụ ka ha ghara iri ngụgụ anụ ehi ugbua mana ha nwereike iri akụkụ ndị ọzọ.
Mgboji kwuru na ụlọọrụ ya agwaala ndị dọkịta na-elekọta anụmanụ na-anọ n'ebe a na-egbu anụ ka ha kee nkwụcha ma chọpụta ehi ọria a ji ma ghara ikwe ka e resi ya ọha.
Ihe ministri ahụike Abia steeti kwuru maka ọrịa a
Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n'Abia steeti bụ Jonathan Osuji kwuru na o nweghị ihe o nwere ikwu maka ya bụ ọrịa ji anụ ehi na steeti ya.
O kwuru na kọmishọna ọrụ ugbo ma ihe mere o ji kwupute ọkwa ahụ ọ mara maka ngụgụ anụ ehi mana o mebeghi ka ngalaba ahụike steeti Abia mara maka ya.
N'iza ajụjụ, Oriaku Nwadiuto Nwankwu onye bụ onyeisi oru ahụike n'ebe a na-egbu anụ n'Ubakala di n'ọchịchị ime obodo Umuahia South siri na ha na-arụ ọrụ ha nke ọma ịhụ na-echekwara ndụ ndị nata anụ ehi n'akụkụ steeti Abia ebe ha na-elekọta.
Ọ kọwara na ha na-enyocha ehi ọbụla tutu egbu ya nakwa mgbe egbuchara ya, ma nakwa etufu anụ ọbụla ahụrụ na o bu nje ọbụla.
Ndị n'egbu anụ na ndị nrekwa anụ ndị tinyere ọnụ na okwu a siri na ọmama ọkwa ahụ gọọmentị mara isi ka aghara iri akụkụrụ anu ehi Awusa, adoghachila eke ekekere azụ na mgbere anụ ha n'atu.
Ihe ndị na-egbụ anụ kwuru

Dika onye ọrụ nchekwa ahụike ogbe ahụ siri na ha na-eme ezi nyocha tutu, nakwa mgbe egbuchara anụ niile na ọdọ ebe ahụ ana egbu ehi n'Ubakala, onye ode akwụkwọ ndị otu na-egbu ehi n'ebe ahụ bụ Maazi Jacob Uwalaka, kwenyere na-ọbụ eziokwu, ebe ọ nọkwa na ekwusi ike na ọdịghịi mgbe ọbụla ha ga-ekwe ka ebubatara ndị obodo anụ ọbụla bu oke rie ọ nwụọ.
Ọ bụ ezie na Kọmịshọna na-ahụ maka ọrụ ụbị n'Abia steeti anọghị n'oche ya, otu onye ọrụ gbapụtara ihe n'ụlọ ọrụ ahụ, siri na ọ dịghị ihe dịka ndị ọrụ ọtawaike ha tinyere iji hụ na ndị n'egbu anụ ehi Awusa rubere isi igbu nakwa ire nani ehi Awusa nke na-enweghi nsogbu ahụike ọbụla.Onye a na-achọghị ka akpopụta aha ya sikwara na ọ bụ ezie na-achọpụtala ọrịa Bovine Tuberculosis n'ime steeti Abia, ma sikwa na ọ bụ nani n'obere ọnụ ọgụgụ.










