Gịnị na-esere ndị Ipob na ndị Afara-Ukwu? Lee ihe anyị ma

Aha onyonyo, Gịnị na-esere ndị Ipob na ndỊ Afara-Ukwu?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna ekwuola na ndị uweojii amaghị maka akukọ na-efegharị na soshal midia banyere obodo Afara-Ukwu na ọgbaghara metụtara ezinaụlọ Nnamdị Kanụ.

BBC kpọrọ Maazị Ogbonna ịmata etu obodo ahụ si kwụrụ dịka ihe onyonyo pụtara na Facebook ụbọchị Satọde nakwa Sọnde rụtụrụ aka na nsogbu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị dara n'etiti Emmanuel Kanu bụ nwanne onyeisi otu a kpọrọ Indegineous People of Biafra (Ipob) na ụfọdụ ndị obodo ha bụ Afara-Ukwu.

N'agbanyeghị ihe ndị uweojii kwuru, Eze Okwulehie bụ onye eji Eze Afara mara, gwara BBC na ọgbaghara dara n'obodo Esiama Afara Ukwu ụbọchị Satọde nakwa Sọnde dịka Emmanuel Kanu batara obodo ahụ malite iyi ndị mmadụ egwu.

Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na soshal midia na-arụtụ aka na ụfọdụ ọgbaghara a mere, mana ha egosighị ebe Kanu mere ihe ọbụla maọbụ wakpoo onye ọbụla.

Ihe onyonyo "Facebook Live" Eze Okwulehie tinyere n'akara na Facebook dị ka o gosiri ebe ụfọdụ ndị Afaraukwu na-eme ngaghari iwe maka okwu ha na ndị ha kpọrọ aha dị ka "Ipob".

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

BBC kpọrọ Maazị Kanu ịmata ihe ọ ma banyere okwu ahụ na ebubo a na-ebo ya, mana ọ sị na o nweghị ihe na-eme, ma kwukwa na ya nọ n'obi nna ya n'oge ahụ a kpọrọ ya.

Mbọ niile BBC gbara ime ka o tinye ọnụ n'ebubo Eze Okwulehie boro ya amịtaghị mkpụrụ karịa ya ikwu na o nweghị ihe ya bụ okwu bụ karịa "asịrị".

Ọ sị: "Ya bụrụ na mmadụ kpọrọ unu kọọrọ unu asịrị, amaghị m maka ya. Sịnụ onye ahụ ya kwuo ihe ọ ma."

Eze Okwulehie na onwe ya gwara BBC na ọ bụ ụmụnna anọ nọ n'Eziama Afara, nke pụtara na ha anọ nwere ikike ịhọpụta onye ga-abụ onyeisi oche nke ha.

'Ha ji Ipob eyi anyị egwu'

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: "Ụjọ ndị agha ka na-atụ ụmụaka n'obodo a" - Ezinaụlọ na agbatobi ya

"Ihe mere bụ na ya bụrụ na ị bụghị onye Ipob, Emmanuel Kanu agaghị ekwe ka ị nọdụ n'ọkwa."

Okwulehie sị na nsogbu bụ na "onye ọbụla agaghị esorịrị n'otu Ipob".

Ọ sịkwa: "Ihe anyị bịara bụ etu anyị ga-esi dozie obodo anyị, ọ bụghị ihe Ipob."

'Okwu Python Dance'

Ndị agha Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria

Okwu a na-abịa dịka o mere afọ atọ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ji ngwa agha gaa obodo Afara-Ukwu nke butere ọnwụ ọtụtụ mmadụ a na-eche na ha bụ ndị Ipob.

Nnamdi Kanu pụtara kwuo na ọ bụ mmadụ 28 lara mmụọ n'ụbọchị ahụ site n'ihe ọ sị bụ "mwakpo ndị agha Naịjirịa".

Ndị agha na onwe ha na-agọ na ha egbughi onye ọbụla.

Ruo ugbua, ndị ọrụ nchekwa ka na-eme ngagharị na ya bụ obodo kwa mgbe kwa mgbe.

Dịka Okwulehie siri kọwaara BBC, ọ sị na nsogbu ha na Emmanuel Kanu malitere "kemgbe ndị agha bịachara Egwu Eke were gbuchaa ndị mmadụ n'Afara-Ukwu".

"Ka ihe ahụ mechara, ndị okorobia mere nzukọ sị na ha achọghịzị ndị ha amaghị ịbata Afara-Ukwu. Anyị hụ onye ọbụla, anyị ajụwa ya ebe o si bịa. Obere oge, ị chọpụta na ọ bụ be ha ka ha bịara."

Okwulehie sị na ngagharị a ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-eme bụ ịhụ na ndị ha amaghị abataghị n'obodo ahụ.

"Ihe ndị ọrụ nchekwa na-eme bụ ịhụ na o nweghị nsogbu ọbụla dị, nakwa na o nweghi onye e merụrụ ahụ. Ị ga-eru Afara ị hụ ndị ị maghị ihu ha. Ị hụ ndị na-akpagharị. Anyị na-ekwu maka ndị a, na-achọ ịma ebe ha si, nwanne Nnamdi kanu akpọrọ ha na-agagharị na-achọ onye ha ga-eti ihe."

Aha onyonyo, Nwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche