Zuckerberg Facebook Meta: Ihe mere Facebook jiri gbanwe aha ya

Ebe foto si, Meta
Ọ ka na-agba ndị mmadụ gharịị ihe mere Facebook jiri gbanwe aha ụlọọrụ ha mana ihe anyị ma mere ha jiri wee gbanwe aha ụlọọrụ ha.
Facebook kwuru si na ha gbanwere aha ụlọọrụ ha ka ọ bụrụ Meta, dịka ha na-agbanwe etu ndị mmadụ si ahụta ha maka na ụlọọrụ a kọwara na aha a bụ 'Meta' metụtara ihe niile ha chọrọ ịgbaso n'ọdịnihu.
Ha sị na Meta ga-eso na mpaghara teknụzụ ọhụrụ a na-akpọ 'virtual reality' (VR) ha chọrọ.
Mgbanwe aha a emetụtaghị igwe soshal medịa dị icheiche ụlọọrụ ahụ nwere, dịka Facebook, Instagram na Whatsapp, kama ọ pụtara na ha ncha bụzị ụmụ ebe 'Meta' bụ nne ha.
Ihe ndị a na-abịa dịka otu onye ruburu ọrụ na Facebook, aha ya bụ Frances Haugen, boro ebubo na o nweghị ihe Facebook ji nchekwa ndị mmadụ kpọrọ.
Hauhen kwuru na Facebook anaghị agba mbọ ịkwụsị akụkọ ịkpọasị nke ndị mmadụ na-eji ya agbasa, kama ihe ka ha mkpa bụ ọmụrụnwa ha na-enweta kwa afọ.
Nke a abụghị nke mbụ nnukwu ụlọọrụ Tekịnụzụ na-agbanwe aha ha.
N'afọ 2015, Google gbanwekwara aha ụlọọrụ ya ka ọ bụrụ Alphabet, mana ọtụtụ ndị mmadụ amataghị nke a.
Aha a bụ 'Meta' sitere n'asụsụ Greek nke pụtara ihe dị omimi.

Ebe foto si, EPA
Mark Zuckerberg na ndị enyi ya anọ malitere ụlọọrụ Facebook n'afọ 2004 oge ha ka nọ n'ụlọakwụkwọ Mahadum 'Havard' nke mba Amerịka.
Aha mmadụ anọ ndị a bụ Eduardo Saverin, Andrew McCollum, Dustin Moskovitz, na Chris Hughes.
Mana ugbua, ọ bụ naanị ya nwezi ya dịka ọ kwuru ndị nke ọzọ ụgwọ.
N'afọ 2012 nakwa 2014, Zuckerberg zụghaara ụlọọrụ Instagram nakwa Whatsapp ka ha bụrụzie nke ya.
Ugbua, ọ chọrọ ịrụ akụrụngwa a kpọrọ 'Metaverse' bụ nke o kwuru na ọ ga-ejikọ mmadụ niile bi n'ụwa.
Ọ bụrụ na a rụchaa 'Metaverse', ọ gaghị adị mkpa iji ekwentị maọbụ kọmputa tupu mmadụ na ibe ya akparịta ụka, n'agbanyeghị ebe ọbụla onye ahụ nọ n'ụwa.














