Nnamdi Kanu Facebook ban: Ndị otu Ipob etiela mkpụ maka etu e si wetuo akara Facebook onye ndu ha

Nnamdi Kanu Facebook ban: Ndị otu Ipob etiela mkpụ maka etu e si wetuo akara Facebook onye ndu ha
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu Facebook ban: Ndị otu Ipob etiela mkpụ maka etu e si wetuo akara Facebook onye ndu ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ Facebook ekwuola na ha weturu akara Nnamdi Kanu n'ihi na ọ dara iwu ọgbakọ otu ha, nke a kpọrọ 'community standards'.

Nke a bụ azịza ha nyere maka ajụjụ BBC Igbo jụrụ ha gbasara ihe kpatara ha ji chụọ Nnamdi Kanu ọsọ ụkwụ eru ala.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu anọghị na nga na Singapore - Aloy Ejimakor

Ha kwuru na Facebook na-enye onye ọbụla ohere ikwu okwu mana ha nwekwara iwu dị icheiche na-achị ọgbakọ ahụ nke onye ọbụla kwesịrị idebe.

Nnamdi Kanu Facebook ban: Azịza Facebook nyere BBC maka ndọtu akara Facebook Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu Facebook ban: Azịza Facebook nyere BBC maka ndọtu akara Facebook Nnamdi Kanu

Cheta na Nnamdi Kanu kwuburu na onweghị ihe ga-eme ka ọ kwụsị ihe ọ na-eme ganye mgbe a kpọrọ ya n'ụlọ ikpe 'International Criminal Court' dị na 'The Hague'.

Nke a nwere ike ịrụtụ aka na o doro Nnamdi Kanu anya na ihe ọ na-ekwu ezighị ezi n'iwu.

Lee ihe anyị ga-eme iji weghachi akara Facebook Nnamdi Kanu - Paul Achalla

Aha onyonyo, Ihe mere Facebook ji machie Nnamdi kanu

Paul Achalla bụ ọkaiwu na mba ofesi ma bụrụkwa onye otu Ipob ekwuola atụmatụ ha ga-agbaso iji weghachi akara Facebook onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Achalla kọwara na o nwereike ịbụ maka otu ihe maọbụ nke ọzọ ka e ji wetuo akara facebook Nnamdi Kanu, mana Facebook kwesịrị inye ya ohere ka ọ zara ọnụ ya.

Achalla gara n'ihu kwuo na ha ga-edegara Facebook akwụkwọ mkpesa, jụọ ha ihe kpatara ha ji wetuo akara Nnamdi Kanu, ma nwekwaa olileanya na ha ga-eweghachi ya.

Facebook ewetuola akara Nnamdi Kanu

Aha nkeananụānụ, Mmụ na Nnamdi Kanu ahụbeghị anya

Ọnụ na-ekwuru onye ndụ Nnamdi Kanu na soshal midia bụ Carolyn Uchenna Okorafor ekwuola na eweturu akara Facebook Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị Indigenous People of Biafra.

O depụtara nke a n'akara twitter ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

O kwuru na nke a bụ ọrụ aka ndị iro chọrọ ịkwụsị ozi ha na-agbasa.

Ọzọ o kwuru bụ na Facebook ji omenaala ndị ọcha enyocha ihe ndị ha hụrụ maọbụ nụ n'elu facebook , ịma atụ iwu ndị ọcha megidere ogbugbu ọkụkọ maọbụ ogbugbu ehi mana ụmụ ihe ndị ahụ bụ ihe a na-emeri emeri na Naịjirịa maọbụ Afịrịka.

Achalla kwukwara na o nwekwara ike ịbụ onyonyo ndị na-egosi oke ogbugbu mmadụ maọbụ anụmanụ ụmụ Naịjirịa na-etinyegasi n'akara facebook kanu kpatara mmachi a.

BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Facebook mana ha azabeghị anyị.

Cheta na Facebook weturu akara Facebook Nnamdi Kanu ụnyahụ bụ ụbọchị February 3,2021 mgbe ọ na-eme live broadcast dịka kepukepu si kwu.

Gịnị ga-emezi ugbua?

Aha onyonyo, Ipob: Nnamdi Kanu ga-abata mgbe Naịjirịa dị njikere

Achalla kwuru na iwu kwunyere Kanu idegara Facebook akwụkwọ maka ịweghachị peeji ya. ọ bụzi Facebook ka ọ dịrị ị ma ma ha a ga-eme nke a.

N'ọnụ okwu ya, " ị ga-egbu mmadụ si ya ekpena ọnụ ya."

O mekwara ka anyị mata na o nweghị ihe gbasara nwetu Facebook Page Nnamdi Kanu na Radio Biafra makana ihe niile ha ji agbasa ozi zuru oke.

Tupu Facebook ewetuo peeji gị, lee usoro ọ ga-ewe

1.Facebook ga-amalite site na ị na-ewepụ ihe ndị atụmaatụ ha anabataghị na peeji mgbe ọ bụla itinyenyere ha. Mgbe ọbụla ha wepụrụ ya, ị ga-enweta ihe ha kpọrọ 'strikes' na bekee.

2.Ọ bụrụ na peeji gị nwetekarịa 'strikes' buru ibu, Facebook ewetuo peeji gị kpam kpam.

3.Ọ bụrụ na ihe i tinyere maọbụ ọgbakọ iso na ya esichaghị ike , Facebook nwereike ịmechinata peeji ahụ nwantiti oge , mana ọ bụrụ na ihe ahụ etinyere dị oke njọ ha ga-emechi peeji gị kpamkpam.

4.Facebook kwuru depụtara na ha anaghị agwa ndị mmadụ ugboro ole ị ga-enweta 'strikes' tupu ha ewetuo peeji gị ka ghara ji ịdọ aka na nti ha mere ihe egwu.

5.Facebook ga-agwa gị ma ha wepụcha peeji gị ma kọwara gị ihe kpatara ha ji wepụ ya

6.Akara facebook mebie iwu facebook ugboro ugboro, Facebook ga-agbachịtụ ya mana ọ bụrụ na ọ bụ peeji, ha ga-eme ka ọ ghara ịnọzị na facebook kpam kpam.

7.Facebook kwuru na ha nye ndị mmadụ ohere ka rịọ ka eweghachi peeji ha makana o nwereike ọ bụrụ na ha zọghiere ụkwụ. Mana ihe mbụ ha na-eme bụ ime ka aghara ị na-afụ peeji onye ahụ na Facebook mana ọ bụrụ na onye ahụ arịọghị, ha ewepụ peeji ya kpamkpam.

Akụkọ ka na-abịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra - Asari Dokubo