Weight Loss: I buru oke ibu? Nrị ndị a ga-enyere gị aka

Nri dị iche iche

Ebe foto si, Iwaria/Chefmide

"Achọrọ m ịta ahụ, achọrọ m ịta ahụ" bụ ekpere ọtụtụ mmadụ na-ekpe ọkachasị na Naịjirịa ugbua.

Ha na-eme ihe ndị dịka mmega ahụ, ibu ọnụ, ikechi afọ dgz iji hụ na ha tara ahụ ma kwụrụ chịm.

Mana ndị ahụ sị na mmega ahụ mebiga ya oke nwere ike igbu mmadụ, ibu ọnụ nwereike igbukwa mmadụ n'otu aka ahụ.

Ha kwuru na ụzọ dị ezi mkpa e ji agbanarị oke ibu bụ site n'iri nri ndị kwesịrị, etu kwesịrị nakwa n'ọge kwesịrị.

Onye okachamara n'ihe banyere nri bụ Collins Akanno nwee ụlọọrụ diet234 kpọpụtara ụfọdụ nri ndị na-eme ka onye buru ibu taa ahụ.

Akanno sị na nri ndị a gụnyere;

Mkpụrụosisi

Mkpụrụosisi

Ebe foto si, Iwaria

Ọ sị njem ịta ahụ amalitebeghi ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị aracha mkpụrụosisi nke ọma.

Mkpụrụosisi bụ nri nwere shuga nkịtị nke dị mma karịa shuga arụrụ arụ. Ha na-eme ka afọ juu mmadụ ruo oge dị anya na-enweghi oke kalori.

Ọ sị na mkpụrụosisi nwere akụrụngwa vitamin di iche iche na-eme ka mmadụ taa ahụ.

Ha gụnyere; Apụl, unere, anyụ mmiri, kukumba, ube bekee, mkpụrụ greepu, oroma, oroma nkịrịsị dgz.

Akụkwọ nri

Akwụkwọ nri

Ebe foto si, Iwaria

Ọ sị na akwụkwọ nrị so n'otu n'ime nri kachasị akpa ike n'ime ka mmadụ taa ahụ n'ihi akụrụngwa ndị ha nwere.

Akụrụngwa dịka fiba, vitamin na minaralụ bụ ndị na-enyeaka ịmịkpọsị abụba dị mmadụ n'ahụ.

Ụfọdụ akwụkwọ nri ndị a gụnyere; Ụgụ, olugbu, mgbọrọdị, beets, kabeji, ntụrụkpa dgz.

Akwa e siri esi

Akwa e siri esi

Ebe foto si, Iwaria

Akanno sị na ndị mmadụ chere na akwa na-eme ka mmadụ buo ibu mana eziokwu bụ na ọ na-eme ka mmadụ taa ahụ.

Ọ sị na akwa nwere obere kalori ma nwee akụrụngwa ndị ọzọ dị mma n'ahụ.

Na ọ bụrụ na i rie otu akwa n'ụtụtụ, na ọ ga-ekechi gị afọ ruo oge dị anya ka ịghara i na-eri oke nri.

Agwa (Beans Porridge)

Agwa (Porridge)

Ebe foto si, Chefmide

Ọ sị na agwa bụ ihe ọzọ jupụtara na 'protein' na-enweghi kalori ma na-emezi kwa ahụ.

Ngaji agwa abụọ i riri n'ehihie dị mma ime ga-ahụ mmadụ kụrụ chịm ma belata oke ibu.

Nri ndị ọzọ Akanno kpọrọ aha bụ;

Mmiri 'tea' kọfị

Ebe foto si, Getty Images

Nduku dị ụtọ (Sweet Potato) nke nwere obere kalori, nnukwu potassium,vitamin A na Fiba.

Nri oat (Oatmeal) bụ nri e ji 'oat' mee nwere fiba ga-ekechi gị afọ ruo ogologo oge ma i rie ya.

Kọfị - Otu iko kọfị kwa ụbọchị na-eme ịta ahụ ọkachasị nke na-enweghi 'caffeine' (Decaffeinated).

Collins Akanno gara n'ihu nye ndụmọdụ ma kwuo na-agbanyeghi na nri ndị a na-eme ka mmadụ taa ahụ mana ọ dịghị mma ka e ribiga ha oke.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: