Jeff Bezos: Ihe mere o ji pụọ dịka onyeisi ụlọọrụ Amazon

Ebe foto si, Getty Images
Onye bidoro ụlọọrụ Amazon ma bụrụkwa onye nke abụọ kacha nwee ego n'ụwa niile bụ Jeff Bezos ekwụọla na ọ ga-arịtu dịka onyeisi ụlọọrụ Amazon ma bụrụzịa onye na-achịkọta ndị isi ọrụ ụlọọrụ ahụ.
Nkọwa ya bụ na nke a ga-enyere ya aka ịtinye uchu n'ihe ndị ọzọ dị ya n'obi.
O kwuru sị, "Nke a ga-enye m ohere itinye anya n'atụmatụ ọhụrụ ụlọọrụ Amazon ma nye kwa m ike itinye uchu n'ihe ndị ọzọ na-amasị m. Anaghị m ala ezumike nka, ike ga dị m karịa".
Dịka Bezos kwuru na ọ ga-arịtụ dịka onyeisi ụlọọrụ, lee ihe ọzọ ọ ga-eme :

Ebe foto si, Reuters
N'Akwụkwọ mgbasa ozi Bezos degara ndị ụlọọrụ Amazon niile ka o kwuru na ọ ga-etinye ịgba mbọ ya n'atụmatụ Day One Fund o bidoro n'afọ 2018 ma kewapụta ijeri dọla abụọ ịkwalite agụm akwụkwọ.
O kwukwara na ya ga-ebido atụmatụ Bezos Earth Fund iji kwalite mbara ezi na eluigwe nke ọ wepụtara ijeri dọla iri. Ọ ga-eji ya bụ atụmatụ kwado ndị okammụta na eme nycoha ma na-agba kwa mbọ ịkwalite mbara ezi na eligwe.
Bezos nwekwara ụlọọrụ Blue Origin nke na-akwado iji ụgbọelu pụrụ iche ezipụ ndị mmadụ mbara igwe.
Bezos kwukwara na ọ ga-etinye uchu n'ụlọ ntaakụkọ Washington Post nke ọ zụtara nde dọla narị abụọ na iri ise n'afọ 2013.
Onye bụ Jeff Bezos?
Jeff Bezos onye gbara afọ iri ise na asaa bụ onye bidoro ụlọorụ Amazon nke na-ere ihe n'ịtaneti n'afọ 1994 n'ebe ụgbọala na anọ n'ụlọ.
Ụlọọrụ Frobes ekwuola na ọnụego Jeff Bewzos bụ ijer dọla otu narị na iri itolu na isii na ụma anọ.

Ebe foto si, Reuters
Tupu ya na nwunye ya agbasaa, ha mụrụ ụmụ anọ.








