A na-ebo onye nwe ụlọọrụ onye na-enyere ndị mmadụ aka enwete visa ebubo nrụrụaka na ohi

Nnyocha BBC na Premium Times mere na-egosi na aha nwaamadị nwe ụlọọrụ ahụ na-enyere ndị chọrọ ịnwete visa Naịjịria aka site na mba ofesi nọ n'akwụkwọ ndị Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) maka ebubo ibuba ego ọha nakwa ibufe ya ofesi.
N'ezie, ahụghị aka ya bụ ụlọọrụ na-enye visa maọbụ ndị ọru ya na ya bụ nnyocha emere, mana EFCC na-ebo onye nwe ya bụ ụlọọrụ bụ Mahmood Ahmad na ụlọrụ ya bụ Drexel Tech ebubo ọnụ abụọ maka ibu ego ọha nakwa ebubo ọnụ atọ maka ibufe ya bụ ego mba ofesi.
Aha mmadụ atọ ndị ọzọ dịkwa na ya bụ ikpe, dịka Abba Moro, onye bụbu Minista na-ahụ maka nchekwa ime Naịjirịa Bekee kpọrọ 'Interior Minister' n'oge Goodluck Jonathan bụ onye EFCC boro ebubo ibuba ego ọha nakwa ịda iwu usoro eji egote ihe gọọmenti.
Ndị niile eboro ya bụ ebubo gụnyere Abba Moro na Ahmadu sị na aka ha dị ọcha.
Ahmadu so na ndị a na-akwanyere ugwu na Naịjirịa nke mere eji nye ya otu n'ime nturuugo kacha elu na Naịjịrịa akpọrọ "Order of the Niger" na Bekee na 2014 oge Jonathan na-achị.
Ndị ọkaiwu ya na-agọ na-ọnweghị mgbe Ahmadu ji nwee ajụjụ ọbụla ọ na-aza n'ụlọikpe ọbụla.
Ndị azọgburu na ọgbọ egwuregwu n'Abuja

Ebe foto si, AFP
Mana akwụkwọ EFCC na-egosi na aha Ahmadu so na ndị eboro ebubo maka ihe ha kpokobara maka iwee ọrụ nke ọtụtụ mmadụ nwuru n'ime ya na Naịjirịa.
Ụlọọrụ ya mbụ bụ Drexel Tech bụ ha kpokọbara emume iwee ya bụ ọrụ nke ha sị na "Nigeria Immigration Services" (NIS) chọrọ iwe ihe ruru mmadụ puku anọ (4,000) n'ọrụ.
Mana ndị NIS gọrọ na ha amaghị maka ya bụ ọrụ Drexel chọrọ iwe.
Mmadụ dị puku isii, ịrị asaa na isii na narị iri isi, iri asaa na ise (676,675) tinyere akwụkwọ maka ya bụ ọrụ.
Ndị nchịpkọta ya bụ emume nara otu onye ndị chọrọ ya bụ ọrụ otu puku naịra.
Ndị mmadụ na-achọ ọrụ zogburu ibe ha n'ama egwuregwu nke Abuja bụ ebe ha mere ya bụ ihe nke ha sị na ọ bụ Ministrị "Interior" kpokobara ya.
Onyeisi ụlọọrụ ndị "Immigration" mgbe ahụ bụ David Paradang zara n'ụlọikpe ukwu n'Abuja, "ya bụ ihe mere na ya bụ ama egwuregwu turu m n'anya maka na amaghị maka ya".
Akwụkwọ ebubo ndị EFCC sị na ya bụ nwaamadị a na-achọ achọ bụ Ahmadu nwetere ego ruru nde narị naira isii na iri asaa na asaa (N677m) site n'otu puku ha nara ndị bịara ịchọ ya bụ ọrụ.
Akwụkwọ ebubo ahụ sị na Ahmadu na ụlọọrụ ya bụ Drexel tinyere ụfọdụ ego ha nwetere na'ụlọ ha gogasiri n'Abuja.
Ha gbanwekwara ụfọdụ ya na dọla bụ nke Ahmadu na onwe ya riri.
Ka ọ dị ugbua, mmadụ niile eboro ya bụ ebubo ibuba ego nke gụnyere Abba Moro na-azara ọnụ ha n'ụloikpe mana ahụbeghị ukwu Ahmadu ebe ahụ kemgbe ahụ.

N'afọ 2016 ka ọnụ na-kwuru EFCC mgbe ahụ bụ Wilson Uwujiaren turuọnụ sị "anyị ga-ejideriri Mahmood Ahmadu, ebe ọsọrọ ya gbagaa. Anyị nụrụ na ọ nwere ụlọọrụ na mba Uk. Anyị ga-eji Interpol ga kpụta ya. Onye nwere ebe nzuzo. Aha ya abanyelarị n'akwụkwọ ndị anyị na-achọ achọ".
Izu gara aga, ọnụ na-ekwuru EFCC ugbua bụ Tony Orilade gwara BBC na Ahmadu ka nwere ikpe ọ ga-aza n'aka ha.
"Akwụkwọ ebubo ka na-egosị na ana achọ ya bụ nwaamadị achọ" Ndị ọrụ anyị ka na-ekwusi ike na iwu megidere ya bụ ọgbakọ okpokobara maka ịwe ọrụ".
Ọbaozi, 'website' ndị ụlọọrụ ya bụ Online Integrated Solutions (OIS) ka na egosi na ha ka nọ na mba iri abụọ na ise dịka Nigeria, China, Lebanon, UAE, Malaysia, Italy, Netherlands, South Africa, USA , France, Germany, UK, India, na Canada ebe ha na-arụchitere gọọmenti Naịjirịa ọrụ.
Ụlọọrụ ahụ sị na ọ bụ ha bụ ọkachamma n'ime ka ndị mmadụ nweta akwụkwọ njem ha ngwangwa n'ụwa gbaa gburugburu.
BBC gbara mbọ ịkwuru ndị Interior Ministry nakwa ndị High Commission mana ha ekweghị etinye ọnụ na ya bụ okwu.
Ụlọọrụ ndị Department for Business, Energy and Industrial Strategy nke UK sị na "onye mbịarambịa amara ikpe na mba ọzọ nwere ike ịchụnta ego na mba UK na-enweghị nsogbu".










