Ubong King: Nwa afọ Naịjirịa e ji okwu mkpalite mmụọ mara, a laala mmụọ

Ubong King

Ebe foto si, Instagram/unyimeivyking

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ na-efegharị ugbu a na-ekwu na Ubong King alaala mmụọ.

Ụlọọrụ ntaakụkọ TVC kwuru na Ubong King nwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Disemba afọ 2020.

Ọ gbara afọ iri anọ na asatọ tupu ọnwụ ya, dịka TVC si kwuo.

ọkụ

Ebe foto si, Facebook/Amb Unyime-Ivy King

Nkọwa foto, Foto nwunye Ubong King tinyere n'akara facebook ya

Nwunye ya bụ Unyime-Ivy King gbanwere foto ya na Facebook ma tinye ọkụ 'candle' na-enwu n'etiti ọchịchịrị iji gosi onye na-eru ụjụ

O zipukwara ozi iji rịọ ndị mmadụ ka ha nyetụ ya ohere ma kwụsị ịkpọ ya n'ekwentị.

O kwuru sị: "Aga m anọrọ onwe m ka mụ na ụmụ were nwayọọ gbarie ihe a na-emenụ."

"Naanị ihe m nwere ikwu bụ na Ọdịmnobi Ubong King arụzuola ọrụ Chukwu zitere ya ka ọ rụọ n'afọ iri anọ na-asatọ ọ nọrọ n'ụwa, ugbua ọ nọ n'udo."

Onye bụ Ubong King?

Ubong King

Ebe foto si, Instagram/Ubong King

Ubong Thompson King bụ onye a ma ama na Naịjirịa niile maka okwu mkpalite mmụọ nke Bekee kpọrọ 'motivational speaking'.

Ọ bụ onye na-akpagharị n'ebe dị iche iche na-agwa ndị mmadụ okwu ga-enyere ha aka ịgbanwe ndụ ha.

Ọ na-agakwa n'ụlọọrụ dị icheiche inyere ndị mmadụ aka ma kuziere ha ụzọ ha ga-esi mee ka ụlọọrụ ha na-abawanye, nakwa etu ndị ọrụ ha ga-esi kawanye mma.

Bekee na-akpọ ụdị ọrụ a 'Business coach' maọbụ 'Life Coach'.

Ihe ọzọ e ji mara Ubong King bụ 'Trouble Maker'

Ihe gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ Ubong King

Ubong King

Ebe foto si, Twitter/Ubong King

Ubong King kọrọ akụkọ ụwa ya n'ihe onyonyo o tinyere n'akara Youtube ya. Lee etu o si kọọ ya:

  • A mụrụ ya n'afọ 1972 na mpaghara Obanikoro dị na Legọs, mana ọ bụ onye Akwa Ibom steeti
  • Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na 'Federal government College' Ijaniki na Legọs
  • Ọ dị afọ iri na abụọ oge nna ya nwụrụ
  • Ọ gụrụ akwụkwọ Mahadum na 'University of Calabar' ebe ọ nwetara ọzụzụ na ngalaba 'Agric Education'
  • Dịka ọ na-agụ akwụkwọ, ọ na-arụkwa ọrụ n'ebe dị icheiche
  • N'ihi nke o nwetara nzere '3rd class' na Mahadum
  • Ọrụ mbụ ọ rụrụ bụ ọrụ nche n'otu ụlọụka dị na Calabar
  • Otu egwu tụgharịrị ndụ ya bụ egwu R.Kelly a kpọrọ 'I believe I can fly'
  • Ọrụ nche ahụ ọ rụrụ nyeere ya aka ịmalite ụlọọrụ nche ya nke ọ kpọrọ GuardIt nke nyeere ya aka nwa mgbe nta
  • Ọ lụrụ nwaanyị oge ọ gbara afọ iri atọ (30)
  • Ọ mụtara ụmụ anọ; otu nwoke na ụmụ nwaanyị atọ
  • O mechara nweta ọrụ na 'Pahek Security Services', 'Alarm Centre', Halogen, na Excel Management Services ebe ọ ji ọkwa 'General Manager'
  • N'afọ 2009 ka ọ malitekwara ụlọọrụ ọzọ a kpọrọ 'Protection Plus Services' nke o kwuru na ọ malitere n'ime ụlọ be ya

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Ubong King

Kate Henshaw onye na-eme ejije kwuru na Ubong bụ ngọzị nyere ya

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

Ọgba egwu a ma ama bụ Kaffy kwuru na Ubong King metụrụ ndụ ya aka n'ụzọ pụrụ iche

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2