Jerry Rawlings: Ezinaụlọ ya ekwupụtabeghị ihe gburu ya

Jerry Rawlings

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jerry Rawlings
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Dịka akụkọ gbasara ọnwụ onye chịburu mba Ghana bụ Jerry Rawlings pụtara n'ụbọchị Tọzde, ọtụtụ akụkọ na-efegharị ugbua gbasara ọrịa gburu ya.

Ọtụtụ na-ekwu na o butere ọrịa coronavirus nke mere ka ọrịa ọ na-arịabu kawanye njọ.

Akụkọ ndị ọzọ na-ekwukwa na ọ bụ obi mgbawa, nke Bekee kpọrọ 'heart attack' gburu ya.

Mana ozi si n'aka ndị ezinụlọ Rawlings ekwughị kpọmkwem ihe gburu ya, kama ha kwuru na ọ nwụrụ dịka ọrịachara obere ọrịa.

Ha rịọkwara ka onye ọbụla nyetụ ha ohere ka ha ruo uju nna ha.

Ozi si n'aka ezinụlọ Jerry Rawlings

Ebe foto si, Rawlings family

Nkọwa foto, Ozi si n'aka ezinụlọ Jerry Rawlings

Ihe ndị ọchịchị Afrịka kwuru maka ọnwụ Jerry Rawlings

Dịka Igbo si atụ n'ilu, oke osisi daa, ụmụ nnụnụ ehu n'ime ọhịa.

Ọnwụ Jerry Rawlings bụ okwu a kpụ n'ọnụ n'Afrịka niile n'ụbọchị Tọzde nke mere ka ozi iti aka n'obi si n'elu na ala na-abịara ndị ezinụlọ Rawlings.

Lee ihe ụfọdụ ndị ọchịchị Afrịka kwuru maka dike a:

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọ gaghị adị mfe ịhụ onye ọchịchị ọzọ dịka Rawlings n'Afrịka:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah kwuru na Rawlings gbara mbọ iweta udo na mba ha:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Atiku Abubakar bụ osote onyeisiala Naịjirịa kwuru na Rawlings bụ dike Afrịka ji eme ọnụ, onye gbara mbọ maka ịdịnotu n'Afrịka:

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Bukola Saraki bụbu onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa kwuru na Jerry Rawlings bụ onye okwu ọnụ ya na omume ya bụ otu ihe:

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Onye bụ Jerry Rawlings?

Jerry Rawlings

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jerry Rawlings chịrị Ghana site 1981 to 2001

Jerry Rawlings weghaara ọchịchị n'ike na mba Gana ugboro abụọ tupu o nyefee ọchịchị n'aka ndị nkịtị

Aha onyonyo, Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya

Nke mbụ ọ gbalịrị weghaara ọchịchị n'ike, a mara ya ikpe ọnwụ mana ọ gbapụrụ were kwaduo ọchịchị ndị agha na mba ahụ.

Ka afọ abụọ gachara, Rawlings kwaturu onyeisiala a họpụtara site na ntuliaka ma zọọ ọkwa onyeisiala merie.

Na mbụ ọ bụbụ onye 'socialist', o webatara ohere azụmahịa enweghị mgbochi gọọmenti nke Bekee kpọrọ "free market" ma mekwa ka mba Gana sonye na mba ndị agha ha sonyesiri ike n'ịakpa udo nke otu United Nations.

A mụrụ Jerry John Rawlings n'ACCRA n'abalị 22 nke ọnwa Juun afọ 1947. Nna ya bụ onye Scọtland, ebe nne ya bụ onye Gana.

Ọ gara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ 'Achimota Secondary School,' ebe o mere ọfụma n'egwuregwu Polo. Ụmụakwụkwọ ibe ya na-ahụta ya dịka anụntị nakwa onye anaghị atụ egwu ikwu uche ya.

Jerry Rawlings na-agwa ndị na-akwado ya okwu n'afọ 1982

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jerry Rawlings na-agwa 'Armed Forces Revolutionary Council' na-akwado ya okwu na nso Accra n'afọ 1982

Tupu o rute oge e bugoro ya n'ọkwa "flight lieutenant" n'afọ 1978, Rawlings abụrụla onye tinyere ezi uchu n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

Gana , mba mbụ nwere onwe ha site n'aka Briten na-enwe nsogbu ụkọ nri, oke ọnụahịa nakwa ọnọdụ ndakpọ akụnaụba.

Rawlings zisara iwe ya n'ihe ọ hụrụ dịka mpụ , nrụrụaka nke ọchịchị ndị agha mgbe ahụ.

Jerry Rawlings

Oge a maghara mmachi etinyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 1979, Rawlings ritere mmerị dịka onye a ma ama na-akatọ gọọmentị, ma na-ekwu ka ha mee ihe ga-enyere ndị ogbenye aka.

Ọ bụ nke a gbara ya ume ịgbalị iweghara ọchịchị n'ike n'afọ 1979. Mbọ ahụ kụrụ afọ n'ala, e jide ya ma ma ya ikpe ọnwụ.

Mkpocha na nzacha

Rawlings si n'ụlọmkpọrọ gbapụ dịka ndị agha ndị obere na ndị ọzọ nyere ya aka. O chụdara onyeagha bụ onyeisiala mba Gana bụ Generalụ Fred Akuffo.

O weghaara ọchịchị dịka onye ndu otu ndị agha 'Armed Forces Revolutionary Council" (AFRC), nke kpalite otu akwụkwọ akụkọ mba Briten jiri ya mee isiakụkọ ha sị, "Onye bụ ọkara onye Scọt na-egwu egwuregwu polo ewegharala ọchịchị na Gana".

Jerry Rawlings n'afọ 1987

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jerry Rawlings n'afọ 1987

Otu agha "AFRC" n'oge ọchịchị ya ṅụrụ iyi ijide ndị niile chịarala ọchịchị na mba ahụ ka ha zara ọnụ ha, nke mere ka ha gbuo Akuffo na ndị ọchịchị ndị agha ndị ọzọ.

E gburu ọtụtụ ndị ọkpaikpe nakwa ndị agha nwere agba n'oge ahụ.

Kama ijisi ọchịchị ike, Rawlings haziri ntuliaka ka ọ gachara naanị ọnwa anọ o jiri kwadaa ọchịchị ndị agha.

Otu pati 'People's National Party' nke Hilla Limann bụ onye ndu ha batara n'ọchịchị.

Ọtanisi

Mana, ọtụtụ na-ahụta Liman dịka mmaṅwụ Rawlings na-akwa aka. Ọnyụpa ọ gbara na ịtụgharị ọnọdụ akụnaụba mba Gana mere ka ọchịchị ya bịa na njedebe.

Ụgwọ Gana ji mba ndị ọzọ gbalitere karịa, ọnụahịa ihe na-ada nke Bekee kpọrọ 'inflation rịrị rue pasent 140., iwena ọnụma so ya butere ọgbaghara.

N'abalị 31 nke ọnwa Decemba afọ 1981, Rawlings weghakwara ọchịchị n'ike nke abụọ ya nke webatara ọchịchị ọhụrụ, nke otu "Provisional National Defence Council" (PNDC), nọ n'isi ya.

PNDC nke Rawlings bụ onye ndu ya gbaliri iweghachi Gana n'ọchịchị ebe gọọmenti na-ahazị akụnaụba nakwa ihe e ji emepụta akụnaụba nke Bekee kpọrọ 'maxist state'.

Ọ dịka Rawlings nwere nghọta na otu Soviet Union na-achọ kpụ afọ n'ala, o were zọpụ ụkwụ ịgbaso atụmatụ ihe-ahịa- kwuru- sị-ree.(free market.)

O wedatara ihe ego Gana n'ada n'ahịa, kwụsị iwe ndị ọrụ n'ọrụ gọọmentị, na resị ndị nkịtị ụlọọrụ gọọmentị nwechara nke gụnyere ugbo koko na kọfị.

Mmeri were anya

Na agbanyeghị na mgbanwe o wetara tọrọ Ụlọakụ mbaụwa bụ International Monetary Fund(IMF), na ndị mba mepere emepe (West) ụtọ, ọtanisi so ya butere ọgbaghara n'ụlọ.

Bido afọ 1983 rue 1987, ndịe nwere ndị gbalịrị ịnapụ Rawlings ọchịchị n'ike.

Ihe kachasị mebie okwu nụ mgbe e nyere ọtụtụ ndị Gana bi Naijiria ọsọ.

Akwụkwọ achụmta vootu Rawlings n'afọ 1996

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Rawlings meriri ntuliaka onyeisiala ugboro abụọ doro anya

Mana ka a banyere mmalite agbata afọ 1990s, mgbanwe o wetara bidoro mitawa mkp.ụrụ ọma dịka ọnọdụ akụnaụba Gana dịara mma.. N'afọ 1992 o meriri na ntuliaka onyeisiala mba Gana.

O meriri mmeri were anya dịka o nwetara vootu 58% n'ime ihe a tụkọtara na ntuliaka ahụ nke 'Commonwealth' nakwa otu "Organisation of African Unity" kwuru na o nweghị nrụrụaka dị ya.

O merikwara ọzọ n'ụzọ were anya n'afọ 1996.

O welitere etu e si ahụta mba Gana na mba ụwa dịka Gana na-esiga ndị agha ha maka ọrụ ịkpa udo ọkachasị Liberia, Sierra Leone, Lebanon nakwa Iraq.

N'afọ 2001, ka ọ chịchara agba nke abụọ ya, Rawlings mere ihe ahụbeghị onye ndu n'Afrịka mere ya, itinye akwụkwọ arụkwaghịm n'ọchịchị.

N'ụwa mgbede ya, Rawlings na-ekwu pụta kaa a kpagbu ụgwọ mba dị n'Afrịka ji na mba ụwa.

N'afọ 2010, e mere ya onyennochiteanya 'African Union' na mba Somalia.

Ihe e ji e cheta Rawlings dị na ndabe na ndebe; ndị ihe ya anaghị amasị na-ebo ya ebobo mkpagbu nakwa nrụrụaka mana ndị hụ®ụ ya n'anya -na-ahụ ya dịka onye wetara udo, nchekwa na ọganihu na mba Gana nke mere ọtụtụ ndị Gana na-akpọ Rawlings "obere Jeszọs"

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị: