Abiola Ajimobi: E liela Abiola Ajimobi chiburu Oyo steeti

Ajimobi

Ebe foto si, Abiola Ajimobi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

E liela gọvanọ chịbụrụ Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi taa bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun n'Ibadan Oyo steeti.

Enwebeghị onye ma ebe ha liri ya kama e kpeere ya ekpere pụrụ iche n'elekere iri na abụọ nke ehihie iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun.

Ọtụtụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu bịara ekpere nakwa mgbaru maka ọnwụ ya.

Ganduje
Nkọwa foto, Abdullahi Ganduje bụ ọgọ Ajimobi nakwa gọvanọ Kano steeti, gọvanọ Jigawa steeti nakwa osote gọvanọ Legọs steeti so na ndị bịara olili Ajimobi
Ndị gbakọrọ
Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ maka olili Ajimobi

Dịka ọtụtụ ndị Naijiria ọnụ na-eru n'okwu na-atụ arịrị maka ọnwụ Ajimobi, Gọọmenti Legọs steeti agbaala ama na ọ bụ ọrịa Covid-19 gburu ya.

Abiola Ajumobi

Ebe foto si, Ajumobi/Instagram

Ajimobi, onye bụbu Gọvanọ Oyo steeti nwụrụ ụbọchị Tozde (June 25, 2020) n'ụlọọgwụ First Cardiologist Consultant, dị na Legọs bụ ụlọọgwụ ebugara Abba Kyari tupu ọ nwụọ.

N'ozi nke Kọmishona ahụike na steeti ahụ bụ Akin Abayomi wepụtara n'abalị Tọzde na Twitter, o kwuru na Ajimobi nwụrụ n'ụlọọgwụ nọrọ onwe ya a mapụtara maka ileta ndị bu ọrịa coronavirus.

O kwuru na "Aka chịburu ọyo steeti nwụrụ dịka ọrịa coronavirus kụchara akụkụ ahụ ya dị oke mkpa ịnjini."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akụkọ ọnwụ Ajimobi bụ ihe a na-atụpụ murmuri n'ehihie Tozde dịka ọ pụtara ihe n'ihi egwu idahie dịka akụkọ na ọ nwụrụ wuburu na soshal midia izu ole na ole gara aga, o mechaa ọ bụrụ akụkọ ụgha.

Ọ bụ nwunye nwa ya bụ Fatima Abiola bụ onye gwara BBC na ọ bụ ezie na ọdachi ahụ mere eme.

Dịka ozi pụtara si kwuo, a gaghị elikwa Ajimobi onye gbara afọ 70 n'obodo ya bụ Ibadan, Oyo steeti taa bụ Fraide dịka e higharịrị ya dobe ya ụbọchi Satode (Juun 27,2020).

Cheta na izu ole na ole ghara aga, akụkọ fegharịrị bụ na Ajimobi, onye otu APC họpụtaburu na nsonso a dịka onyeisioche ha n'etiti nwụrụ.

Nke a na eme dịka akụkọ wuru na soshal midia n'abalị ise nke ọnwa Juun na ọ na-arịa nnukwu ahụ, e buga ya ụlọọgwụ mana o doghị anya ihe na-arịa ya.

Aka chiburu Oyo

Ebe foto si, ajumobi/Twitter

Ihe aga- eji echeta Ajumobi:

  • Ajumobi rubụrụ dịka onyeisi na ụlọọrụ na-ere mmanụ a kpọrọ 'National Oil and Chemical Marketing Company' bụ alaka ụlọrụ 'Shell Petroleum,'tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị.
  • Ọ bụbu Senetọ n'aha otu AD tupu ọzọ ọkwa Gọvanọ Oyo steeti n'aha ANPP mana o nwetaghị ya.
  • O mechara zọọ dịka gọvanọ n'aha APC nweta ya n'afọ 2011 nakwa 2015 bụ agba nke abụọ ya.
  • E mere ya onyeisioche pati APC na nsonso a mana ọ banyeghị ọkwa ahụ na-apụ ụka tupu ọ laa mụọ
  • Ajimobi dịka Gọvanọ wepụtara amụma,'YES-O' (Youth Empowerment Scheme of Oyo state) bụ amụma inye ndị ntorobịa ruru 20,000 enweghị ọrụ ọrụ.
  • Ajimobi bụ onye ndị ya na ya tọkọrọ n'Ibadan oge ọ dị na nwata kwuru na ọ maa akwụkwọ bụ onye anaghị ata ntị ya ata
  • Ụfọdụ maa ya dịka 'Constituted Authority' bụ aha ụmụakwụkwọ mahadum 'Ladoke Akintola University of Technology' (Lautech) nyere ya.
  • Oge ọ bụ onye nyere iwu akutuo ụlọ otiegwu ụka a ma ama bụ Yinka Ayefele.
  • Ọ gbablịrị ịnapụ 'Olubadan' nke Ibadan, Oba Saliu Adetunji, ugwu dịrị ya dịka Eze ndị Ibadan site na ịmapụtara ndị ọba ọhụụ dị iri abụọ nna otu n'Ibadan mana ụlọikpe mechara napụ ha ikike.
  • Ajimobi lụrụ nwaanyị aha ya bụ Florence, ha mụta ụmụ ise.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: