Biafran National Guard: Otu BNG e jrila 'ogbunigwe' majaa ndị agha Naijiria

Ebe foto si, BNG/Facebook
Otu kpọrọ onwe ha Biafra National Guard(BNG) ewepụtala igwe ha sị bụ ọgbụnigwe 'BNG Red Devil 01 rocket' bụ nke ha ga-eji chere ndị agha Naijiria aka mgba.
N'ihe onyonyo otu ahụ wepụtara n'akara Facebook ha n'abalị Tuzde, ha gosiri igwe e tere uhie ndụndụ, mmeemmee, edoedo nakwa ojii bụ uhie e jiri mara Biafra.
N'ozi ya n'ihe onyonyo ahụ, onyeisi otu BNG bụ Innocent Orji sịị, " Anyị ekwupụtala nnwereonwe Biafra ọzọ. Anyị etinyela ọkọlọtọ anyị."
"Mụ na ndị otu m ga agbara Biafra ọgụ rue n'ọnwụ."
"Anyị ga-azọta ala anyị na-okeala anyị. Egwu ndị agha anaghị atụ anyị. Anyị ga-eme ihe ndị dị mkpa. Nkwado ndị be anyị ga-eneyere anyị aka ịzọ ndụ ọtụtụ."
Nkwụpụta a na-abịa abalị ole na ole ndị agha Naijiria kwuchara na ha gburu otu onye otu Biafra National Guard.
Otu ahụ gara n'ihu kwuo na "ihe a abụghị 1967, anyị nwere ụzọ anyị ga-eji mee ihe anyị chọrọ ime".
Kedụ ndị bụ ndị 'Biafra National Guard' ha na ndị agha kwara mgbọ na Tọzde?

Ebe foto si, Nigerian Army
Ndị agha Naịjiria na-ekwu na ha egbuola otu n'ime ndị otu kpọrọ onwe ha 'Biafran National Guards'.
Onyema Nwachukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha, kwuru na ọ bụ n'obodo Amaekpu dị n'Ohafia ka ya bụ ihe mere n'ụbọchị Tọzde.
Nwachukwu kwuru na oge ndị otu ahụ hụrụ na mgbọ nke ndị agha akarịala nke ha, ha riri mbọmbọ ọsọ.
"Mana oge ha gbara ọsọ pụta n'obodo Eda dị n'Ohaozara, Ebonyi Steeti, ndị agha malitekwara ịkwa ha mgbọ," Onyema Nwachukwu na-ekwu.
"Nke a mere ka ha bihapụ ụgbọala ha ma were ụkwụ gbafuo."
"Ndị agha natara ndị ekperima a ụgbọala atọ, otu egbe 'pump action', ma nwuchikwaa otu onye n'ime ha."
Biafra National Guard, ole ndị ka ha bụ?

Ebe foto si, Screengrab
E nwere ọtụtụ otu na-azọ nnereonwe Biafra, mana Biafra National Guard bụ aha ọhụrụ.
Dịka onyonyo na-efegharị na soshal si kwuo, aha onyeisi ndị otu a bụ Innocent Orji.
O kwuru na ha si n'Izrel lọta iji lụọ ọgụ dịka ndị ọchịchị Naịjirịa nwuchiri onyeisi Redio Biafra bụ Nnamdi Kanu, nakwa oriaku Onyekachi Orji.
Orji Kwuru na n'ihi nke a, ha ga-ekwupụta nnwereonwe Biafra n'abalị iri atọ nke ọnwa Ọkụtoba 2021.

Ebe foto si, Screenshot
"Ego Igwe, Biafra pounds, a ga-eri ya n'Ọkụtoba 30," Innocent Orji kwuru.
Onyonyo ahụ gosiri ebe ndị otu a bụ Biafra National Guard gara ịgabnye mmanụ ụgbọala n'ọtụtụ ụgbọala ha bu.
O doghị anya n'onyonyo ahụ ma ha akwụkwara ndị na-ere ya bụ mmanụ ụgwọ.
Kama ya bụ onyonyo gosikwara ebe onyeisi ha bụ Innocent Orji banyere n'ime ụlọahịa dị ebe ahụ, chịtị mkpọ achịcha biskit ise, mana ha enyeghị ndị na-ere ya ego.
Etu ndị agha na ndị Biafra National Guard siri kwaa mgbọ

Ebe foto si, Nigerian Army
Ndị agha wepụtara akwụkwọ ozi na ha na ndị Biafra National Guard kwakọrịtara mgbọ.
Ha gosikwara otu onye nke ha gbagburu, onye nke ha nwuchiri, nakwa ụgbọala atọ ha natara ndị ahụ.
Ụgbọala atọ ahụ ndị agha gosiri yitekwara ụgbọala atọ a hụrụ n'onyonyo ahụ ndị BNG wepụtara oge ha na-agbanye mmanụ ụgbọala.
Ndị otu a bụ BNG sekwara ihe nkiri ebe ha na ndị agha na-akwa mgbọ.














