IPOB/ESN: Lee nwaamadị a sara asịsa etu o si banye ESN
Otu nwaamadị so na ndị anwụchiri mgbe ha gara ịwakpo ụlọorụ ndị uweojii n'Owere akụwaala akụoyibo nsugbe.
Ọ kọwara na ọ bụ onye otu Eastern Security Network nke Nnamdi Kanu hibere, ma kwukwaa etu o si banye ya.
Ọtụtụ n'ime ndị otu ya lara mmụọ oge ha wakporo ụlọọrụ ndị uweojii ahụ, mana e jidere ya onwe ya na ndụ.
Nwoke a kwuru na ọ na-akwa m gara mara ugbu gbasara isonye ndị ESN, ma kwuo na ọ bụ nghọgbu ka a ghọgburu ya.
'Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa enweghi ike iru ebe ogige ESN nọ' - Emma Powerful
BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị otu Ipob bụ Emma Powerful gbasara nwoke a sara asịsa, o wee kwuo na nwaamadị ahụ abụghị onye ESN.
Ọ gwara BBC Igbo na "ihe ọbụla ị nụrụ n'olu ndị gọọmentị Naịjirịa bụ asị ọcha".
Ọ sị na "ọbụghị taa ka anyị hụwara asị ndị ụweojii na ndị agha Naịjiria".
Powerful sị na ndị ahụ na-asa asịsa bụ ndị amara ikpe ọnwụ ka ha kpọpụtara sị ha sawa asịsa n'ike, "ka ọ dị ka ọnwere ihe ha na-arụ".
Ọ sị na ndị agha Naịjriịa enweghị ike ịbanye ebe ogige ndị ESN nọ, "ha enweghị ike ya".
Powerful sị na akụkọ a niile ha na-ewepụta maka igbu ndị ESN bụ ka ndị mmadụ were sị na ha na-anwa.
"Ọnweghị ihe ha bụ. Ọnweghịkwa ihe ha pụrụ ịme".
Ọ kwukwasara na afọ 2021 abụghị afọ 1967.
Powerful kwusiri ike na agha ha na-anụ maka mwereonwe Biafra bụ nke ha ga-enweriri mmeri.
O boro na ihe ndị uweojii na ndị agha na-eme bụ igbu ụmụntọrọ bịa tụkwasa ha egbe n'akụkụ sị na ha bụ ESN.
Gee ihe o kwuru n'uju: