Biafra and Oduduwa Volunteer Force: Ipob na ndị otu Oduduwa ehibela otu nchekwa ọhụrụ

ESN/Oduduwa

Ebe foto si, Screengrab of ESN /

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru ndị Indigenous People of Biafra ekwuola na ndị otu ya na ndị otu Oduduwa na-achọ nwereonwe ndị Yọrụba ejịkọla aka n'iweta nchekwa n'ọdịda anyanwụ.

Powerful kwuru na otu abụọ ahụ si Biafra na Oduduwa azụwala ndị ọrụ nchekwa nke ha.

O kwuru na aha otu nchekwa a ha jịkọtara aka hibee bụ "Oduduwa and Biafra Volunteer Force." , o kwukwara na ha mere ọzụzụ mbụ ụnyahụ bụ ụbọchị iri na ise

N'ọnụ ya, ọrụ otu nchekwa ọhụrụ a anyị gbakọtara aka hibee bụ ichekwa mpaghara ọdịda anyanwụ n'aka ndị oyi egwu na mwakpo ndị ọzọ sị n'aka ndị iro."

Aha onyonyo, 'Asari Dokubo enweghị ike imegheri anyị anya n'inweta Biafra'- Ipob

Powerful kwuru na otu "Oduduwa and Biafra Volunteer Force." na-ekwusike na oke ogbugbu nakwa ntọrị na-eme n'ala Igbo nakwa ala Yoruba bie ugbua."

O kwuru na mwakpo ọbụla mere n'ala Yọrụba metụtara ala Igbo, nakwa mwakpo ọbụla mere ala Igbo metụtara ala Yọrụba.

" Ndị agbụrụ ọhụrụ Biafra nakwa nke Oduduwa ejịkọtala aka ọnụ ichekwa ogbe ha, anyị ga-anwụkọta ọnụ ebe anyị na-eche ogbe anyị."

Mgbe BBC Igbo kporọ ụlọọrụ Koiki bụ nke na-agbasara otu na-achọ nwereonwe Oduduwa ozi n'ekwenti, ha azabeghị anyị ruo ugbua.

Aha onyonyo, Onions traders: 'Anyị ahụbeghị ego Nnamdi Kanu kwuru ọ ga-akwụ anyị maka ịyabasi ha n'Imo'

Ohaneze ndị Igbo kwuru uche ha maka atụmaatụ a

Igboayaka O Igboayaka bụ onyeisi ndị ntoroọbịa 'Ohaneze Youth Council' kwuru ka ndị Igbo nọrọ onwe ha na-achọ Biafra ha na-achọ ma hapụ ndị Yọrụba ka ha chọwa ihe ha na-achọ.

O kwuru na nke a bụ makana agbụrụ abụọ a nwere ndịche n'agwa na omenala.

Igboayaka kwuru na ọ dịghị mma ka otu na-ekwu okwu nwereonwe na-ekwu okwu maka nwereonwe n'otu oge makana o ga-emebi ihe.

"N'ọnụ ya, ọ bụrụ na otu na-achọ nwereonwe chọwa ewepụta otu nchekwa, gọọmenti ga-ahụta ya dịka ihe ima aka."

Kedụ ihe ndị uweojii nọ na mpaghara ndịda anyanwụ kwuru maka njịkọ aka otu abụọ a

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah kwuru na n'eziokwu ọ nụbeghị maka otu ọhụrụ a.

O kwuru na otu Ipob bụ nke gọọmenti etiti machịri kamgbe afọ 2017 , ya mere na o nweghị otu ha hibere iwu kwadoro.

O kwuru na ha gaa n'ihu gosi onwe ha n'Ebonyi steeti, ndị uweojii ga-anwụchị ha.

Ikenganyia Tochukwu bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii ọnụ n'Anambra kwuru na ọ maghị maka otu "Oduduwa and Biafra Volunteer Force.", ya mere o nweghị ihe o ga-ekwu ugbua.

Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu kwuru na ọnụbeghị maka ya bụ otu ọhụrụ.

Bright Edafe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta steeti zara, " enweghị m ike ịza ndị ma amaghị maka ha okwu."

BBC Igbo ka na-agba mgbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: