Hope Uzodimma: Ihe ga-eme ka Ipob gbaghara gọvanọ Imo steeti - Emma Powerful

Ipob na govanọ Hope Uzodimma

Ebe foto si, Getty Images/Hope Uzodimma Facebook

Otu Indigenous People of Biafra ekwuola na ọ bụghị ha ka gọvanọ Imo steeti na-akpọ oku ịkpa udo.

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru Ipob gwara BBC Igbo na gọvanọ Uzodimma akpọghị aha Ipob kpọm kwem mgbe ọ na-eseti aka ịnwe mkparịtaụka udo maka steeti ya.

"Ọ bụghị Ipob ka ọ na-agwa makana aha Ipob abụghị onye ọbụla, Hope Uzodimma emejọghị onye ọbụla, ọ bụ naanị Ipob ka o mejọrọ."

Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ihe ga-eme ka Ipob gee gọvanọ Hope ntị maka mkparịtaụka udo ,Emma Powerful kwukwara sara:

"O nwere ndị na-edunye gọvanọ Uzodimma ozi ibuso ndị ntoroọbịa steeti ya agha."

O kwuru na ikpe ha na Uzodimma abụghị abụghị nke a ga-ekpezinwu kwam kwam makana ọ bụ gọvanọ mbụ kpọtara ndị agha ka ọ wakpoo otu Eastern Security Network Nnamdi Kanu hibere.

Cheta na gọvanọ Hope Uzodimma setiri aka udo ụbọchị ọ na-agụpụta ozi ncheta nwereeonwe Naịjirịa na June 12, 2021.

N'ozi ahụ, Uzodimma kwuru na ọ dịla njikere ịnabata mkparịtaụka udo ga-eme ka ezi nchekwa na udo zuo oke n'Imo steeti.

Ọnwa atọ agara aga ahụla tigbuo na zọgbuo na steeti ahụ nke a na-ebo ndị "unknown gunmen."

Aha onyonyo, 'Asari Dokubo enweghị ike imegheri anyị anya n'inweta Biafra'- Ipob

Hope Uzodimma ewetuola obi, gbatia aka udo

Hope Uzodimma

Ebe foto si, Hope Uzodimma Facebook page

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na ya ga-anabata mkparịtaụka ọbụla ga-ame ka tigbuo zọgbuo kwụsị na steeti ya.

Gọvanọ Uzodimma kwuru nke a mgbe ọ na-agụpụta ozi emume ụbọchị ncheta nwereonwe Najirịa n'ụbọchị satọde bụ June 12, 2021.

O kwuru na ọdịghị mma ka Imo steeti were obere akụ na ụba ha nwere na-ahazi nsogbu ogbaghara na-ebute maka nchekwa.

Uzodimma kwuru na udo na-eweta ọganihu ya mere o ji di mma ka onye ọbụla tinye mma n'ọbọ ka e jiri nwayọ chọwa ihe dabara na mmiri.

Cheta na kamgbe ọnwa atọ gara aga ka mkpa mkpa a ndị o ji egbe na-akpa n'Imo steeti.

Mkpa mkpa a gụnyere ịgba egbe aghara aghara, ịmụnye ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ nakwa ụlọọrụ gọọmenti nakwa igbu ndị mmadụ ụfọdụ oge.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: