Biafra: Ndị Ipob asaala Chris Ngige maka ọchịchị Naijirịa

Ọnụ na-ekwuchitere ndị otu Ipob bụ Emma Powerful agwaala Chris Ngige na ọ bụ ya chọrọ ọchịchi Naijirịa na ihe ndị Ipob chọrọ bụ mwereonwe Biafra.
Ọ bụ dịka Ngige kwuru okwu were sị na-enye ndị Igbo ọkwa onyeisiala Naijirịa na ọ ga-eme ka ndị Igbo die ufu agha Biafra na mmegbu a na-emegbu ha.
Emma Powerful kwuru sị, "Anyị achọghị ọchịchị dịka onyeisiala Naijirịa, ihe anyị chọrọ bụ mwereonwe Biafra".
Ọ gara n'ihu kwuo sị, " Ngige na-ekwuchitere akpa ya, anyị na-ekwuchitere obodo iri na otu mezuru Biafra".
Powerful rụtụrụ aka na ọbụghị nani Ipob na-achọ mwereonwe Biafra kama na-enwekwara otu ndị ọzọ ndị mmadụ amaghị na-achọ kwa ya.
Alex Ogbonnaya and Ohaneze: Mgbe ekpebiri na ndị Igbo kwesịrị ịchị Naịjirịa eruola

Otu jịkọrọ ndị Igbo bụ Ohanaeze Ndị Igbo ekwuola na ha kwadoro ihe Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Naijirịa bụ Chris Ngige kwuru were sị na ịnye ndị Igbo ọkwa onyeisiala Naijirịa ga-eme ka obi ha pụọ n'echiche mmegbu n'aka gọọmentị Naijirịa.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ya bụ otu bụ Alex Ogbonnaya gwara BBC Igbo nke a.
Ọ kọwara sị na ọ bu n'afọ 1998 ka e nwere nzụkọ were kweta na ọchịchi ga-erute mpaghara niile aka na Naijirịa.
Ọ kwuru sị, " Ọ bụ Chuba Okadigbo kwuchitere ndị Igbo na ya bu nzụkọ nke emere dịka Sani Abacha nwụchara".
Ogbonnaya kwuru si na ọ bụ ya mere ọchịchị ji were ruo Olusegun Obasanjo aka were mechaa ruo onye ugwu bụ Musa Yaradua aka.
Ọ kọwara sị, " Dịka ọchịchi sitere n'aka Yaradua ruo Goodluck Jonathan aka, dịka ndị Saụt saụt chịgoro, Saụt Westị achịa, ọkwesiri ka o ruo ndị Igbo aka ugbu a".
Ogbonnaya kwukwara sị ," ụmụ ntoroọbịa anyị na-eche na a na-elehara ndị Igbo anya, enye ndị Igbo ọchịchị Naijirịa mkpọtụ niile ndi Igbo na-eme ga-akwụsị".
Ọ kwuru sị, " Chris Ngige agaghị ekwu okwu megide otu ndọrọndorọ ochịchị, agbaharaa m ya maka na ọ bụ onye ọrụ goọmentị".
Ogbonnaya kwuru sị, " Chris Ngige bụ ezigbo mmadụ, o na-ekwu na Buhari na emeta ndị Igbo ofụma kama Ohaneze na-ekwu na Buhari anaghị emeta ndị Igbo ọfụma".
Chris Ngige: Ihe ga-agwọ ọrịa Biafra n'obi ndị Igbo

Ebe foto si, Nigeria Government
Chris Ngige bụ minista na-ahụ maka ọrụ ekwuola na ndị bi na mpaghara ala Igbo na-eche na a na-emegbu ha.
N'okwu ya, ọ bụrụ na e mere ya site n'isa ha isi maọbụ okwu ụgha nke ahụ abụghị okwu ugbua.
Ngige kwuru na o na-ewute ya n'akwụkwọ iwu Naịjiria nke afọ 1999 enyeghị ohere ka onye si mpaghara ndịda anyanwụ nweta oche onyeisiala.
O kwuru na o kwenyere n'akwụkwọ iwu nke Abacha chiburu Naịjirịa hibere n'afọ 1995 makana o nyere ohere ka ndị si na mpaghara isii nọ na Naịjirịa nwee ohere ichị mba ahụ ruo afọ ise.
N'okwu ya, e kwetere m ka anabata akwụkwọ iwu nke Abacha hibere n'afọ 1995 nyere ohere ka ndị si na mpaghara isii nke Naịjiria ichị afọ ise ofu ugboro ga-eme ka ndị mmadụ chefuo maka ụfụ agha Biafra nakwa nke June 12.









