Constitutional Amendment : Okwu pụtara n'ọgbakọ ileba anya n'iwu Naịjirịa e mere n'Owerri, Enugu

Uzodinma,Orji Uzo Kalu na ndị ọzọ bịara ọgbakọ mmegharị iwu

Ebe foto si, Imo State Government

Okwu gbasara inwe ndị uweojii nke steeti; nke steeti ọbụla chụtara, ha rie; inyekwu steeti ikikie na inye ụmụnwaanyị oke n'ọchịchị obodo bụ ihe ọtụtụ kpụ n'ọnụ n'ọgbakọ ịnụ olu ọha dịka o si metụta mbọ imegharị Iwu Naijria.

N' ọgbakọ ahụ nke e mere n'Owere ụbọchị Wenezde, abalị 26 nke ọnwa Mee afọ 2021, Osote Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu mabụrụkwa onyeisisoche kọmiti e hiwere maka imezi iwu Naijiria bụ Sịnetọ Ovie Omo-Agege kpọrọ oku ka ndị Igbo pụta n'igwe tinye ọnụ n'ihe ha chọrọ ka a gbanwe n'iwu Naijiria.

Omo-Agege, onye kwuru nke a site n'ọnụ Sịnetọ Orji Uzo-Kalu onye nochitereanya ya sị na ọgbakọ ahụ bụ ụzọ Igbo ga-esi nweta ezi mgbanwe ha chọrọ dịka o si metụta etu e si eke ọchịchị n'ala Naijiria.

Aha onyonyo, Restructuring: Okwu a ka na-agbawoju anya - Ikenga Nnewi

O kwuru na ọgbakọ ahụ bụ inye ọtụtụ ndị Naijiria na-ekwu na iwu Naijiria nke 1999 bụ nke ndịagha wepụtara, na ọ bụghị nke ọha Naijiria, ohere iweta echiche ha ka e tinye ya n'ọru ihazighari iwu.

Nke a bụ ohere ndị Ọwụwa Anyanwụ kwu iwe ha- Uzodinma

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Imo Government

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwuru na ihe na-akpa ndị Ọwụwa-Anyanwụ gụnyere; okwu ị na-eke ọkwa onyeisiala na mpaghara, na mpaghara ndị uweojii steeti na inyekwu steeti ikike ọchịchị na mpaghara inwe ego nke akpata ha.

Uzodinma kwuru na ihazigharị iwu Naijiria pụrụ igbo mkpa ndị a niile.

Ọ dụrụ ndị nwere ihe na-ewe ha ka ha were ohere a kwupụta iwe ha, sị na ọ bụghị tigbuo, zogbuo ka ha ga-eji nweta ihe ha chọrọ.

Ndị nwere agba nọ n'ọgbakọ ahụ mere n'Owere gụnyere; Hope Uzodinma (gọvanọ Imo steeti), Okezie Ikpeazu (gọvanọ Abịa steeti) Orji Uzo Kalu (sịnetọ nke Abia North, Enyinnaya Abaribe (sịnetọ na-anọchite Abia South).

Etu ọgbakọ ahụ si gaa n'Enugwu

Ike Ekweremadu,Uche Ekwunife na ndí ọzọ nwere agba
Nkọwa foto, Ike Ekweremadu,Uche Ekwunife, na ndí ọzọ nwere agba gaara

Sịnetọ Ike Ekweremmadu na ndị omeiwu ibe ya zukọrọ ugbua n'Enugwu iji nụrụ olu ndị mmadụ dịka o si metụta akwụkwọ iwu na-achị Naijiria ha chọrọ ka agbanwee.

Ya bụ ọgbakọ malitere n'ụtụtụ Wenezde ga-adịkwa na Tọsde ga-enye otu dị iche iche nakwa ndị nkịtị ohere ikwupụtacha ihe ha chọọrọ ka a gbanwee na ya bụ iwu obodo.

Aha onyonyo, 'Restructuring' ka mma karịa referadum

Ndị otu na-abụghị nke gọọmentị ji ohere ahụ kwupụta ihe ha chọrọ.

Onyeisi otu na-ahụ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị a kpọrọ 'WACOL' bụ Joy Ezeilo kwuru na ya na ndị otu dị iche iche na-akwado ka e wepụtara ụmụnwaanyị oche nke naani ha ga na-anọ n'Ụlọomeiwu Ukwu na nke nta.

Onye ọzọ nọchitere anya otu ntuliaka a kpọrọ 'Transition Monitoring Commitee' bụ Miriam Menkiti kwuru ka a hazigharịa usoro okpuru ọchịchị n'ihi na ọ bụ ya bụ ebe mmepe ga-ebido.

Aha onyonyo, Ihe Ohaneze jiri kwụnyere Atiku - Nnia Nwodo

Otu ndị ọzọ karịrị narị nọkwa ebe ahụ kwupụtara ka a ga-esi mee ka obodo dịwanye mma.

Ọtụtụ ndị bịara emume ahụ gụnyere Sịnetọ Ike Ekweremmadụ, Sịnetọ Chukwuka Utazi, Sịnetọ Uche Ekwunife, Sịnetọ Ifeanyi Uba, Dr Sam Egwu, Hon Chukwuka Utazi na ndị ọzọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: