Cultism in Anambra State: Etu aka si kpara ndị otu nzuzo ahụ na-akpa ike n’Awka

Aka akparala ndị otu nzuzo na-akpa ike n'Ifitte, Awka.

Ebe foto si, Anambra State Police

Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na aka ha akpara ndị otu nzuzo na-akpa ike n'obodo Awka nakwa gburu gburu ya.

Nke a dị n'ozi kọmishọna uweojii bụ Echeng Echeng wepụtara n'ụbọchị 16 Maachị, 2022 dịka ọ na-agba ha n'anwụ n'ụlọọrụ ha dị n'Awka.

Ụdịrị arụ ha sị ndị otu a kparala

Ụgbọala a natara ndị otu nzuzo a.

Ebe foto si, Anambra State Police

Echeng mere ka a mata na ndị otu nzuzo a akpaala arụ dị iche iche kamgbe afọ ọnwa Disemba 2021 rute n'ọnwa Maachị nke afọ 2022.

Ọ sị n'ụbọchị 14 Disemba afọ 2021, na ha wakporo onyeisi otu jikọtara ndị ọgbatumtum Keke n'Awka, gbuo ndị uweojii abụọ nọ nso ebe ahụ ma nara ha egbe AK47 abụọ.

"Ọzọkwa bụ n'ụbọchị 26 ọnwa Febụwarị, 2022 na ndị otu ahụ wakporo ebe a na-eli ozu n'obodo Ebenebe dị n'Awka ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ.

Echeng sị na kamgbe izuụka abụọ gara aga na a nwụchiela ọtụtụ n'ime ndị otu nzuzo a site na mgbakọ aka ndị ụweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ.

Ngwa ọgụ a natara ndị otu nzuzo

Ebe foto si, Anambra State Police

"Mana n'ụbọchị Tuzde 15 Maachị, anyị natara ozi na ndị otu nzuzo na ndị ọrụ nchekwa 'Unizik Vigilantee Group' kwakọrịtara egbe n'ebe a kpọrọ Miracle Junction dị n'Ifitte Awaka".

Ọ sị na ndị uweojii chechiri ndị otu nzuzo ahụ n'ụzọ nke mere ha ji gbagbuo onye ndu ha bụ Uchenna Nwobu e ji 'Anali' maara ma nwuchie ndị ọzọ.

Echeng sị na ihe ndị ha napụtara ndị a gụnyere egbe AK47 abụọ, egbe ndị ọzọ ruru isii, ọtụtụ mgbọ egbe, ọtụtụ mma na egbugbu, otu ụgbọala na ihe ndị ọzọ.

Ọ sị na nyocha ka na-aga n'ihu ịnwụchi ndị fọrọ afọ ma rịọ ndị Anambra ka ha dere jụụ na-aga mkpa dịịrị ha n'ụzọ udo.

Ọ gakwara n'ihu katọọ ihe onyonyo gosiri ka ndị mmadụ gburu ma kpọọ otu onye a sị bụ onye otu nzuzo ọkụ.

Etu ndị otu nzuzo na ndị nchekwa si kwakọrịtaa mgbọ n'Ifitte

Ọgụ ndị nche na ndị otu otu nzuzo

Ebe foto si, Screen grab

Akụkọ sị na ọ bụ mmadụ anọ lara mmụọ mgbe ahụ ndị otu ozuzo na ndị ọrụ nchekwa a kpọrọ 'Anambra Vigilante Service (AVS)' kwakọrịtara mgbọ n'ụbọchị 15 Maachị, 2022.

Nke a mere n'ebe a kpọrọ 'Miracle Junction' n'Ifitte Awka, n'ụbọchị Tuzde, abalị iri na ise nke ọnwa Maachị afọ 2022, n'ihe dịka elekere iri maọbụ elekere iri na otu nke ụtụtụ.

Otu onye nkuzi na Mahadum Nnamdi Azikiwe bi nso mpaghara ahụ gwara BBC Igbo na o ruola abalị abụọ ha na-anụ ụda egbe aghara aghara n'ogbe ha.

"Mana unyaahụ ka ndị nche pụtara buso ndị ahụ a na-eche bụ ndị otu nzuzo agha," onye nkuzi a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru.

Dịka onye a si kọọrọ BBC Igbo, ndị nche ahụ gbagburu mmadụ abụọ n'ime ndị a e chere na ha bụ ndị otu nzuzo, ebe ha gbagbukwara otu onye nche a na-akpọ 'iron man'.

O kwukwara na ndị mmadụ jidere otu onye n'ime ndị ahụ a na-ebo ebubo ịbụ ndị otu nzuzo, ma were iwe na ọnụma gbaa ya ọkụ.

Onye ọzọ bikwa na mpaghara Ifitte Awka, mana ọ chọghịkwa ka a kpọọ aha ya, kwuru na ya bụ ihe mere n'eziokwu.

O kwuru na nke a abụghị nke mbụ maọbụ nke abụọ ụdị ihe a na-eme na mpaghara ahụ.

"Ya bụ ihe amarala anyị ahụ. Oge ọ bụla ị nụrụ ụda egbe, ị lakpuo n'ime ụlọ kpọchie ụzọ. Ụjọ anaghị atụzi m maka na ndị ahụ ma ndị ha na-achọta," ka nwaada a kwuru.

Mana onye nke mbụ gwara anyị okwu kwuru na ndị ekperima na-awakpokwa ụlọ ndị mmadụ oge ụfọdụ na-ezu ohi.

"Kama ya bụ ihe ebelatatụla kamgbe ngwụcha ọnwa Febụwarị, 2022 oge ndị nche malitere ọrụ n'okirikiri a," ka o kwuru.

Ọtụtụ onyonyo na-efegharị na soshal midịa ugbua banyere mwakpo a merenu na Miracle Junction.

Nsogbu ndị otu nzuzo n'Awka

Ọ dịzi ka a ga-asị na nsogbu ndị otu nzuzo na-enye n'Awka, isi obodo Anambra steeti, bụzi ihe amaghị ka a ga-esi mee ya.

Ugboro ugboro ka akụkọ na-apụta gbasara nkwafu ọbara nke sitere n'ọgụ dara n'etiti ndị otu ozuzo na ibe ha.

Ọtụtụ oge kwa ka ndị uweojii Anambra steeti kwurula na ha anwụchiela ụfọdụ ndị ntoroọbịa e boro ebubo ịnọ n'otu nzuzo, mana ihe na-eme ka na-emekwa.

Isi mmiri mmụbawanye ndị otu nzuzo a malitere na mahadum dị ịcheịche na Naịjirịa.

Dịka mahadum Nnamdi Azikwe malitere ọrụ kamgbe afọ 1991 n'Awka mgbe mkpamkpa na mmụbanwanye ndị otu nzuzo na mahadum sarara ọkụ, Akwa so ebe ndị akụkọ mwakpo n'aka ndị ntorobịa bụ ụmụakwụkwọ mahadum si apụta.

A na-arabanye ọtụtụ ụmụakwụkwọ mahadum n'ime otu nzuzo dị ịcheịche na Naịjịrịa.

Ndị ọrụ nchekwa ekwuola kwa mgbe kwa mgbe na ndị otu nzuzo ndị a na-eme ihe ike, ezu ohi, awakpo ndị mmadụ ma na-emekwa mpụ ndị ọzọ n'obodo.

Nke a mere e ji ha ji ebuso ha agha ma na-agbasa ozi na mahadum dị ịcheịche arịọ ụmụakwụkwọ ka ha hapụ isonye otu ndị a.

Oge BBC Igbo kpagharịrị n'Awka ịjụ ndị mmadụ ihe ha na-atụ anya n'aka Chukwuma Soludo, bụ onye ga-amalite ọrụ dịka Gọvanọ Anambra steeti n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị 2022, ọtụtụ n'ime ha kwuru na ha chọrọ ezi nchekwa n'Awka nakwa n'Anambra niile.