Nnamdi Kanu: Oteela ndị otu nzuzo wakporo Ipob malitere ịkpa ike n'Oba - President General
Onyeisi nzukọ Oba nke Bekee kpọrọ "President General" tinyere ọnụ n'okwu Nnamdi kanu kwuru ụnyaahụ banyere mwakpo a wakporo ndị Ipob na-eme ọgbakọ n'obodo ahụ ụbọchị ụka.
Clifford Elenu sị na ihe ụmụ ntọrọrọbịa ụfọdụ a na-eche na ha bụ ndị otu nzuzo mere n'Oba ụbọchị Ụka jọgbụrụ onwe ya.
Mana Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu nkewapụta na Naịjirịa bụ "Indigenous Peoples of Biafra" (Ipob) etinyela ọnụ na mwakpo e mere ndị otu ya na-eme nzụkọ n'Ọba di n'okpuru ọchịchị Idemili, Anambra Steeti.
Maazị Kanu sị na awakporo ndị otu ya ebe ha nọ n'ọgbakọ ụbọchị ụka bụ nke 12 n'ọnwa julai 2020.
Okwu ya pụtara na mgbasaozi o mere n'akara Twitter ya nke ọ sị bụ ọpụrụiche maka na ọ mere ka ọkwụsị ekpere ọ nọ n'ime ya.
"Awakporo anyị n'Oba. Ha mere m jiri chabie ekpere m pụta. Ọ bụ ndị na-arụrụ ndị si ugwu ọrụ mere mwakpo a. Ọ bu ndị Fulani mụrụ na-enye Ipob nsogbu n'Oba."
Maazị Kanu sị: "Ndị kpara ike gbara akwara n'oba".
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ọ sị na Ezigbote iwe ihe mere na-ewe ya nke mere o jiri sị na ya "amaghị etu ha ga-esi gawa n'ihu".
Kanu sị na ya agaghị ekwupụtenwụ iwe dị ya n'obi maka na e nwere onye Oba bụ ezigbote onye otu Ipob.
"Ọ bụ maka Maazị Obienu mere agaghị m ekwu ihe m na-ekwubu maka obodo enweghi isi. Maka akwụkwọ nso gwara anyị na ya bụrụ na a ga-achọ otu onye kwụ aka ya ọtọ iwe Chukwu agaghị adakwasị ha".
Maka okwu mwakpo a, Kanu sị na otu iwe ya bụ na ndị Oba emeghi ihe ọbụla oge a na-eme mwakpo n'Oba na n'obodo Uli.
"A na-awakpo ụmụwannyi n'ike n'Uli mana onweghi ihe anyị nụrụ n'ọnụ ndị ntoroọbịa Oba".
Kanu sị na ha na-eme nyocha na-achọpụta na ọ bụ ndị otu nzuzo na-arụrụ otu onye ndọrọndọrọ n'Abuja ọrụ gara tisasia ebe ụmụ nwaanyị anyị na-eme nzukọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara bụ Mohammed Haruna gwara BBC na ha nụrụ na o nwere ihe mere n'Oba ụbọchị ụka.
"Anyị na-eche na ọ bụ ndị otu nzuzo aụuọ mere ọgbahara n'Oba. Anyị na-eme nchọpụta banyere ya."
Maazị Haruna gakwara n'ihu kwuo na ha anụghị maka ọgbakọ ọbụla ndị Ipob nwere n'Oba.
Nnamdị Kanu sị na onwereike bụrụ makana ha anụghị ọnụ ha mere ha jiri chee na ha nwereike mee Ipob ihe masiri ha.
"Ha amaghị na m nọ n'ime ezigbote ekpere. Ekwughi m na mụ agaghị ịnọ. Anyi chọrọ ihu etu ndị mmadụ ga-esi kpaa agwa, anyị ahụla ha ugbua."
Ihe ndị ọzọ dị ọkpụrụkpụ Kanu kwuru
- Ya bụrụ na anyi enweteghị Biafra n'afo a, o si anyị n'aka
- Kama iwakpo ndị Fulani na-awakpo ụmụnwaanyi anyị, ọ bụ Ipob ka ha kpebiri ịwakpo
- Ihe ha mere bụ ihe anyị agaghị agbaghara
- Ndị niile so mee mwakpo a agaghị adi ndụ hụ Biafra
- Anyị ga-achụ nta ha ma nwete ha ebe ọbụla ha nọ. Ha ga-akwụ ezigbote ụgwọ maka ihe ha mere
- Ndị a mere ihe a egosila anyị na ha na ndị "janjaweed" kwụ."
- Etu m si chụọ ndị "Janjaweed" n'Ebonyi ka anyị ga-esi chuọ ndị mere ihe a n'Oba
- A na m ata onyeisi ndị ntoroọbịa n'Oba nakwa "president General" ụta maka ihe a mere
- Ya bụrụ na nwanne gị nwoke maọbụ nwa gị so mee ihe, gbara ọsọ bịa gwa anyị
- Ihe niile unu mebiri unu ga-akwụ ụgwọ ya kpa kpam kwa abụọ
- A ga-echeta ndi ntoroọbịa Oba dika e si echeta Ifeajuna na dị ọzọ
- Ndị chọrọ ikwuchi ọkụ Ipob agaghi emeri
- Ihe a ndị Oba mere na-ewute m karịa mwakpo ndị agha wakporo be n'ọnwa Sepụtemba 2017 ma gbuo ndị otu mmadụ 28 nakwa nwanne m na nkịta m
- Onye ọbụla bụ onye otu nzuzo n'Oba bụ "ọnwụrụ anwụ na-aga ije"
- Ndi Oba mụrụ ndị enweghi isi abụrọ ụdị ndị anyị chọrọ na Biafra.
Anyị ma maka ihe Nnamdi Kanu kwuru - Uweojii
Haruna Mohammed sị na ha ma maka ihe Kanu kwuru banyere ihe mere n'Oba.
"Anyị dị njikere ihu na udo dị n'Oba nakwa ebe niile na Naịjirịa."
Ọ sịkwa na Ipob bụ otu akagbụrụ na Naịjirịa nke mere ha ejighi nwee ike inye iwu ọbụla na Naịjirịa
BBC Igbo kpọrọ Okaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejioffor ịmata ihe o nwereike ikwu banyere ihe onye ọ na-anọchite anya ya na-ekwu mana ọ sị ka akpọghachi ya.















