Nnamdi Kanu anyị na-eche gị na ọkụ mmụọ gị - Arewa

Ebe foto si, Getty Images
'Arewa Youth Consultative Forum' akatọọla okwu onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu kwuru na ọ ga-eji "ọkụ mmụọ" lọghachite na Naịjirịa.
N'okwu onyeisi ha bụ Yerima Shettima gwara ndị ntaakụkọ, o kwuru na Naịjirịa etofeela ụdị mmaja ụmụaka ahụ.
Cheta na Kanu mgbe ọ na-agbasa ozi mbụ ya kamgbe ọpụtagharịrị ihe kwuru na ọ ga-eji "ọkụ mmụọ" lọghachite Naịjirịa.
Mana Arewa akatọọla okwu ahụ, ma kwuo na ịdị n'otu Naịjirịa abụghị ihe otu onye maọbụ otu ga-eleda anya.
Shettima kọwara iyi egwu Kanu dịka "ịgbọ ụja n'efu", maa ya aka n'ihu ka ọ lọta Naịjirịa bịa kwuo ụdị okwu ahụ.
N'okwu ya "Anyị etofeela nke a, Naịjirịa etoola ma gbapụtakwa ihe mmadụ iyi ya egwu. Ihe a bụ obodo otu onye agaghị eleli ịdị n'otu ya anya.
"Echeghi m na Kanu nọ na Jerusalem n'ihi na ahụrụ m ozi mba Izrel wepụtara.
"Mana ọ bụrụ na ọ nọ ebe ahụ, ọbaghị uru ị nọ ebe ahụ ekwu okwu, ya lọta Naịjirịa bịa kwuo ya ka anyị mara na o siri ike."












