UK advises Citizens: 'Unu agakwala na steeti 21 ndị a na Naịjirịa'

Sajid Javid
Nkọwa foto, Sajid Javid bụ nnukwu odeakwụkwọ na-ahụ maka ihe gbasara ndị mbịara mbiara

Steeti ruru iri abụọ na otu na Naịjirịa ka ụlọọrụ 'Common Wealth' nke mba UK gwara ndị be ha bụ agaga maka enweghị ezi nchekwa ebe ndị ahụ.

Ụlọọrụ ahụ depụtara ozi ahụ n'elu webụsiati ha ma kwụkwa na arụrụala ndị oyiegwu agbalitela n'ugwu Hausa Naịjirịa, ekperima na ọdịda anyanwu, nakwa ikpaike na Naija Delta.

State ndị ha gụnyere bụ agaaga ugbua bụ:

  • Borno
  • Yobe
  • Adamawa
  • Gombe
  • Delta
  • Rivers
  • Akwa Ibom
  • Cross River
  • Kilio mita iri abụọ n'oke Niger na Zamfara
  • Bauchi
  • Zamfara
  • Kano
  • Jigawa
  • Katsina
  • Kogi
  • kilo mita iri abụọ kewara Niger dị na Sokoto nakwa Kebbi
  • Bayelsa
  • Abia
  • Kaduna

N'ime ndụmọdụ a, ha gwakwara ndị mba UK nọ Naịjirịa ha agala ebe ndị mmadụ gbakọjuru, ọgbakọ ebe a na-ekpe ekpere , ụlọ ahịa, ụlọ oriri na nkwari, ebe a na-agba ụgbọala nakwa ogige ebe ndị na-agba ọsọ ndụ bi.

Ha kwuru na oke ntọ na-eme na steeti ndị ahụ na-abụkarị maka ego maọbụ ndọrọndọrọ ọchịchị.

N'ọnụ ha, "ị ga-ebe ndị a bụ agaaga ,gba mbọ hụ na ị kpọ ndị nchekwa zuruoke."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: