UK Biafra Asylum: Gọomentị Briten akọwala okwu gbasara inye nchekwa

Getty Images/Boris Johnson Twitter

Ebe foto si, Getty Images/Boris Johnson Twitter

Gọọmenti mba UK ekwuola na otu Indigenous People of Biafra abụghị otu oyi egwu nke bekee kpọrọ 'terrorist' na mba ha.

Ha kwuru na akụkọ na-efegharị na gọọmenti UK etinyela otu Ipob n'akwụkwọ ebe ha depụtara ndị oyi egwu bụ akụkọ ụgha.

O kwuru na akụkọ ụgha ahụ gbadoro ụkwụ n'ozi ha depụtara na webusait ha nke isiokwu ya bụ 13 April 2022 publication by the UK Government of

a revised Country Policy and Information note (CPIN) on separatist groups in SE Nigeria, nke gụnyere otu Ipob.

Dean Hurlock bụ onụ na-ekwuru UK High Commission dị n'Abuja depụtara nkọwa ọhụrụ n'akwụkwọ ozi o zitere BBC Igbo.

Gọọmenti UK kọwara ozi ahụ n'ụzọ atọ a

  • Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na Country Policy and Information note(CPIN) bụ atụmaatụ nke gọọmenti Britein ji ahazi udi nchekwa nakwa mkpesa mmegbu dị iche iche.

"Mba UK na-elebanya na mkpesa ọbụla metụtara ịgba ọsọ ndụ nakwa nke mkpagbu n'otu n'otu n'usoro UN Refugee Convention and European

Convention on Human Rights kwadoro, mabụrụkwa n'obi ozi maọbụ etu iwu mba ọbụla si dị," bụ ihe akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

  • CIPN nke metụtara otu ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ gụnyere Ipob , pụtara nlebanya na mkpagbu dị iche iche ndị niile nọ n'otu ahụ na-agabiga.
  • CIPN kwetere na gọọmenti Naịjirịa amachiela otu Ipob dịka otu na-eyi egwu, ụfọdụ ndị otu Ipob bụ ndị ji ụzọ tigbuo zọgbuo so mba ha nakwa ndị bi na ya ma na-enye ndụmọdụ na onye ọbụla kpagburu mmadụ ibe ya agaghị enweta nchekwa ọbụla.

Lekwa akwụkwọ ozi nkọwa ahụ ebe a

Screengrab

Ebe foto si, Screengrab

Ihe gọọmenti Briten hazigharịrị ọhụrụ a na websaiti ha maka inye 'Asylum'

Ọkọlọtọ mba Uk

Ebe foto si, Getty Images

Cheta na gọọmentị mba Briten deghariri usoro ha si enye ndị otu Indigenous Poeple of Biafra (Ipob), otu Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (MASSOB) nakwa ndị niile ha na ha nwere mmekọ 'asylum' na mba ha.

Ha depụtara nke a n'ọbaozi websaịt ha n'ọnwa Maachị bụ nke ha degharịrị n'ụbọchị atọ nke ọnwa Mee.

Mkpebi ha gbadoro ụkwụ n'Iwu mbaụwa niile a kpọrọ '1951 Refugee Convention' nke gbochiri onye ọbụla megidere ikike ruru mmadụ n'ịgba ọsọ ndụ.

Mana ha kwuru na ndị mmadụ ghọtaghiere ha, nke mere ka gọọmenti UK depụta akwụkwọ ọzọ na-akọwa okwu ahụ n'ụzọ doro ewu na ọkụkọ anya.

Foto dị n'okpuru ebe a gosiri mkposa okwu ahụ n'uju ya.

Iwu mba UK tinyere maka ndị Ipob

Ebe foto si, UK GOV/ Screenshot

N'ime ozi ahụ, ha sị na "onye ọbụla a chọpụtara na o so n'otu Ipob, Massob nakwa otu Biafra ndị ọzọ na-agbasa ozi ga-ebute ịkpaoke, tigbuo zogbuo agaghị enweta 'asylum' na be ha".

Ha kọwara na otu Ipob bụ oru nke gọọmentị Naịjirịa denyere dịka otu na-eyi ndụ egwu dịka ha na-egosi ihe ndị mere ha ji machie ndị otu ha ịgbata ọsọ ndụ na mba ha.

Odobeghi anya ma iwu a ọ ga-emetụta ndị otu Ipob na Massob bi na mba Briten, maọbụ metụta ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ chọrọ ịga zụọ ahia, gụọ akwụkwọ maọbụ mee otu ihe na nke ọzọ na mba Briten.

Gịnị bụ Asylum?

A họpụtala Boris Johnson ka Praim Minista Briten ọhụrụ

Ebe foto si, @BorisJohnsonTwitter

Asylum bụ mkpuchi pụrụiche mmadụ maọbụ otu na-enwete n'aka mba ọzọ mgbe gọọmentị mba nke ha si na ya na-akpagbu ha.

Ndị a na-enye 'asylum' bụ ndị gbara ọsọ ndụ site na mba ha gaa mba ọzọ n'ihi ọdachị dịka agha, maọbụ ọnọdụ ndị nwereike itinye onye ahụ n'ihe ize ndụ.

Atụmatụ a malitere na mba Ijipt, Greek nakwa Hebrew tupu ọ gbasaa na mbaụwa ndị ọzọ.

Iwu United Nations nke afọ 1948 kwuru na "onye ọbụla nwere ikike ịchọ mkpuchi 'asylum' site n'aka mba ọzọ".

Mana mba ahụ ga-eme nyocha ma chọpụta ma aka onye ahụ ọdị ọcha, ma ọ bụ eziokwu na mba ha na-akpagbu ha.

Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ha ga-enye onye ahụ ohere ịbịa biri na mba n'aha mkpuchi 'asylum'.

Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ejirila atụmatụ 'asylum' gafee mba Briten nakwa mba ofesi ndị ọzọ.

Ihe mere mmachi a jiri metụta Ipob, Massob na ndị ọzọ?

Ndị nkwado Biafra

Ebe foto si, Getty Images

N'akwụkwọ ozi a gọọmentị Briten wepụtara, ha kọwara na gọọmentị Naịjirịa kpọpụtara aha Ipob na ngalaba ọgụ ha bụ Eastern Security Network (ESN) dịka otu na-eyi ndụ egwu (terrorists).

Ma sị na otu ndị a ebuola agha ọtụtụ oge megide ikike dịịrị onwe na Naịjrịa.

Ha kọwakwara Massob dịka otu gọọmentị Naịjirịa machiri amachi mana a kpọghị ha ndị na-eyi ndụ egwu dịka Ipob ma sị na ha ebusokwala gọọmentị Naịjirịa agha ọtụtụ oge.

Ha kwuru n'ihi nke a na "onye ọbụla ya na Ipob, massob maọbụ otu ọbụla chọrọ nwereonwe Biafra nwere mmekọ nke butere ọgbaghara na onye ahụ agaghị enwete mkpuchi ọsọndụ a kpọrọ 'asylum' na mba ha.

Ihe i kwesịrị ịma maka Ipob na Massob

Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ otu Nnamdi Kanu hiwere n'afọ 2012 iji zọta mwereonwe Biafra n'aka Naịjirịa.

Kanu malitere mgbasaozi na Redio Biafra ebe ndị ọtu ya nọ na Naịjirịa na-eme ngagharịiwe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Nkw a mere ka gọọmenti Naịjirịa nwuchie Kanu mgbe ọ batara Naịjirịa n'afọ 2015 ma mecha n'afọ 2017 ebe ikpe ya ka na-aga n'ihu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.

N'ọnwa Sepụtemba 2017 Kanu si Naịjirịa gbafuo mgbe ndịagha wakporo ụlọ ya dị n'Afara Ukwu Ibeku Umuahia nke Abia Steetị.

N'otu afọ 2017 ahụ, ka Gọọmentị Naịjirịa kpọrọ otu Ipob dịka otu ndị "na-eyi ndụ egwu".

Ndị uweojii nzuzo Naịjirịa bụ DSS mechara nwuchigharịa Kanu na mba Kenya n'ọnwa Juun 2021 ma kpọlata ya Naịjirịa bụ ebe a ka na-ekpe ya ikpe rute ugbua.

N'aka nke Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra bụ otu Ralph Uwazuruike hiwere n'afọ 1999 maka otu nwereonwe Biafra.

Isi ụlọọrụ ha dị bụ n'Okwe nke mpaghara Okigwe dị n'Imo Steetị. Ha nwere ngalaba abụọ a kpọrọ 'Biafra Government in Exile and Biafra Shadow Government'.

Otu a ji ngagharịiwe na ife ọkọlọtọ Biafra achụ nwereonwe n'oge ahụ nke mere Gọọmentị Naịjirịa jiri nwuchie Uwazuruike n'afọ 2005 n'ebubo ibuso gọọmentị agha.

E mechara tọhapụ ya n'afọ 2007, a nwuchikwara ya na ndị otu ya n'afọ 2011 mana e mechara tọhapụ ha n'ime ụbọchị ole na ole.

Otu abụọ a (Ipob na Massob) bụ ndị kachasị gbapụta ihe n'ọchịchị mwereonwe Biafra nao-agbanyeghi na ọtụtụ ntị ọzọ na-esepụta isi ha