Massob na Ipob UK asylum: Gịnị bụ 'asylum'?

Ndị nkwado Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Dịka mba Briten wepụtara usoro ndị na-agba ọsọ ndụ maka ihe nsogbu so nkwado otu nnwereonwe Indigenous People of Biafra (Ipob) nwereike isi gbabata na mba ha, ndị mmadụ na-achọ ịghọta ihe ọ pụtara.

Usoro a gụnyere inye ha nchekwa na mkpuchite ma ọ bụrụ na ha na-anata mmegbu maka ihe ha na-azọ.

Mana gịnị ka 'asylum' pụtara?

Ọba nkọwa okwu Merriam-Webster kọwara 'Asylum' dịka:

1) Ebe nchekwa a na-enweghi ike iwabanye n'ike nakwa ebe na-enye ndị omekome na ndị ji ụgwọ mkpuchite.

2) Ebe mgbaba na nchekwa.

3) Nchekwa nke onye gbara ọsọ ndụ nakwa mkpuchite nke na-egbochi nwụchi na mkpọghachite a na-enyekarị ndị gbara ọsọ ndụ n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị, nke mba maọbụ ụlọọrụ nnọchiteanya iwu pụrụiche kpuchitere na-enye.

Ihe nwereike ime ka e nye mmadụ asylum

Tupu e nye mmadụ asylum a, onye ahụ ga-egosirịrị na ọ bụ ọsọ ndụ ka ọ gbara, na ihe na-achụ ya karịrị ya.

Ọ ga-egosi na ọ bụrụ ya ihe ize ndụ ịnọ nso ebe o nwereike ịbanye na nsogbu n'aka ndị na-achụ ya; na ọ gaghị ebinwu ebe ọbụla na mba ya n'ihi ụjọ mmegide.

Ihe mmegide ndị a gụnyere:

  • Mmegide n'ihi agbụrụ onye si
  • Mmegide n'ihi ofufe onye
  • Mmegide n'ihi mba onye si
  • Mmegide n'ihi nkwenye ndọrọndọrọ ọchịchị onye
  • Ihe ndị ọzọ nwereike itinye mmadụ n'ihe ize ndụ n'ihi etu mba ya si nabata ya, dịka mmekọrịta akwamiko ya, nkwenye ya n'okike.

Ị ga-egosi na mba gị enyenwughi gị nchekwa.

Gịnị ka asylum pụtara n'isiokwu a?

Asylum nke metụtara ihe mba Briten na-enye ndị Ipob na Massob bụ ha atọ Merriam-Webster kọwara n'elu.

Nke a bụ n'ihi na mba Briten na-ekwe nkwa inye ebe mgbaba, nchekwa nakwa ebe iwu pụrụiche ga-egbuchite ha n'aka ndị ha na-agbara ọsọ.

E nwereike ịchụlata onye na-achọ asylum?

E nwereike ịchụlata onye na-achọ asylum ma onye ahụ mee nnukwu mpụ na ihe iwu akwadoghi.