Imo State Police: Lee kọmịshọna uweojii ọhụrụ akpọtara n'Imo steeti

Ebe foto si, Nigeria Police Force Facebook Page
Onyeisi uweojii Naijiria bụ Usman Baba ezigala ndị kọmishọna uweojii ọhụrụ n'Imo steeti maka 'ịkwụsị mwakpo ndị ojiegbe na steeti ahụ.
Ebe ndị ọzọ Baba zigara ndị komishona ndị uweojii ọhụrụ gụnyere Kaduna, Edo, nakwa Adamawa bụ ebe "unknown gunmen" na ndị omekome akpọrọ Bandits na-akpa mkpa mkpa.
Cheta na ndị omekome awakpola ụlọọrụ uweojii abụọ kamgbe mbido April a. Ofu n'ime ha dị n'okpuruọchịchị Mbaitoli na ngwụcha izu ụka gara aga ebe mwakpo nke ọzọ mere n'okpuruọchịchị Orsu ka abalị abụọ gafechara mwakoo nke mbụ ji mecha.
Ndị kọmịshọna ọhụrụ a gụnyere Mohammed Barde (Imo Command), Yekini Ayoku (Kaduna Command), Sikiru Kayode (Adamawa Command), nakwa Abutu Yaro (Edo Command).
Olumuyiwa Adejobi bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa kwuru na ya bụ ọkwa ọhụrụ e nyere ndị kọmịshọna uweojii ndị a ga-amalite ozugbo ozugbo.
Onye bụ kọmịshọna uweojii ọhụrụ nke Imo steeti?

Ebe foto si, Nigeria Police Force Facebook Page
CP Muhammed Ahmed Barde bụ kọmịshọna uweojii ọhụrụ ezigara n'Imo steeti.
Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa depụtara na kọmishọna Barde bụ onye uweojii ma ọtụtụ ihe dị iche iche.
Ọ gara ụlọakwụkwọ na Police College dị na Jos nakwa Nigeria Police Academy na Wudil dị na Kano.
Ọ rụrụ n'ụlọọrụ ndị uweojii dị na Borna dịka osote kọmịshọna uweojii na-ahụ maka nhazị etu ọrụ si aga.
Ọ bụbụ onyeisi ndị Force CID, Annex dí n'Enugu.
Tupu ọkwa ọhụrụ a erute ya aka, ọ bụbụ kọmịshọna uweojii n'Adamawa steeti
Yekini Ayoku bụ kọmishọna uweojii ọhụrụ nke Kaduna steeti
CP Yekini Adio Ayoku gụrụ mahadum Ilorin. Ọ bụ onye Agbeyangidị n'okpuruọchịchị Ilorin East dị na Kwara steeti.
CP Ayoku banyere ụlọrụ ndị uweojii dịka Cadet ASP n'ọnwa March 1990.
Ọ bụ onye uweojii ma ọtụtụ ihe gbasara nchekwa pụrụiche ma sonyekwa n'ikpe udo nakwa nturu ugo United Nations nyere ya maka ozi ọ gara na mba Kosovo.
Ọ bụ onye otu International Association of Chiefs of Police(IACP).
CP Abutu Yaro bụ kọmịshọna ọhụru Edo steeti

Ebe foto si, Nigeria Police Force Facebook page
Abutu Yaro bụ kọmịshọna uweojii ọhụrụ nke Edo steeti.
O gụrụ akwụkwo na mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria.
Ọ malitere ọrụ dịka uweojii Cadet Assistant Superintendent na Nigeria Police Force n'afọ 1988.
Ọ rụọla ọrụ dịka kọmịshọna uweojii na Zamfara nakwa Imo steeti .
Ọ bụbụ CP Force Provost Marshal n'isi ụlọọrụ ndị uweojii tupu o nweta ọkwa ọhụrụ a.
Sikiru Kayode bụ kọmịshọna uweoji ọhụrụ n'Adamawa steeti
Sikiru Kayode gụrụ ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na mahadum Benin ma bata n'ụlọọrụ Nigeria Police Force dịka Cadet ASP n'afọ 1990.
Ọrụọla ọtụtụ ọrụ dịka onye uweojii na-eme nyocha nakwa na-ahazi ihe gbasara ọrụ n'ụlọrụ ndị uweojii mabụrụkwa onye na-ahụ maka etu njem si aga n'obi gọọmenti etiti.
Ọ bụbụ kọmịshọna uweojii na Cross River steeti.
Tupu o nweta ọkwa ọhụrụ a, ọ bụ kọmịshọna uweojii na-ahụ maka teknụzụ n'isi ụlọorụ ndị uweojii Naịjirịa dị n'Abuja.









