Etu ndị uweojii siri memina ndị omekome isii ma napụ ha ụgbọala atọ n’Orsu, Imo steeti

Ebe foto si, NPF Imo steeti
Ndị uweojii Naịjirịa n'Imo steeti egbuola mmadụ isii a na-eche bụ ndị otu Ipob/ESN dịka ha siri kwuo.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Michael Abattam zịpụtara ozi n'ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị 16 nke ọnwa Mee ma kwuo ka ya bụ ihe siri mee.
N'ozi ya, Abattam kọwara etu ndị uweojii n'Imo siri nụ ozi si okpuruọchịchị Orsu nke steeti ahụ ebe ndị ojiegbe bu ụgbọala Hilux atọ nọ n'aga n'ụzọ Obi onyeisi ndị Eze ọdịnala n'Imo ma na-agbali egbe elu.
O kwuru na ndị ahụ nke nwereike ịbụ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) nakwa ndị otu nchekwa ha bụ Eastern Security Network (ESN).
Abattam kwuru na ndị uweojii na ndị agha Naịjriịa gbakọtara buso ndị ahụ agha dịka ha ma gbochie ha atụmatụ ha ime nwakpo.
O kwuru: "Na tụrụ anyị ogbunigwe nke eji mmanụ ụgbọala rụo"
"Anyị na ha kwara mgbọ aghara aghara"
"Anyị meminara mmadụ isii n'ime ha"
Abattam kwukwara na ha na ndị agha Naịjirịa gbapụtara otu egbe 'Pump Action', mma obejiri atọ ọbara tesariri n'ahụ ya, ụgbọala Hilux atọ nke o kwuru nwereike ịbụ nke ndị a zupụrụ n'aka ndị mmadụ.
O kwuru ogbunigwe ndị ahụ tụtara otu ụgbọala ndị uweojii nke mere o jiri gbaa ọkụ.
"Anyị ebupụla ozu ndị ahụ anyị meminara ma buga ha ọdọ ozu n'ụlọọgwụ ugbua"
Cheta na Orsu so n'akụkụ Imo steeti ebe ọtụtụ mwakpo kacha dapụta n'oge gara aga ọkachasị n'ụbọchị Mọnde kwa izu bụ ụbọchị iwu onye nọrọ n'ụlọ nke a na-akpọ sit at home na Bekee.

Ebe foto si, Screenshot
Etu ndị ojiegbe siri wakpoo ndị mmadụ ma tọrọ otu nwaanyị n'Inyi, Enugu steeti
Ndị uweojii Naịjriịa n'Enugu steeti kwuru na ha agbapụtala otu nwaanyị a tọrọ n'obodo Inyi nke okpuruọchịchị Oji-River, Enugwu steeti n'ụtụtụ Mọnde, ụbọchị 16 nke ọnwa Mee, 2022.
Ihe onyonyo pụtara na soshal midia gosiri ebe ndị ojiegbe bu ụgbọala bọọsụ nakwa ọgba tum tum wakporo ndị pụtara ezi n'ụtụtụ ahụ.
N'ihe onyonyo ahụ, a hụrụ ebe ndị ojiegbe ahụ kụrụ ndị ahụ pụtara ezi ọsịsị ma jiri olu ike na-abara ha mba. Ha jibidoro ha ma mee ka ha dịnara n'ala.
A nụrụ olu otu nwaanyị nọ na-arịọ "Biko, Biko, Biko", dịka ndị ahụ egeghị arịọrịọ ya ntị ma tọrọ ya banye n'ime ụgbọala ha.
Ndị uweojii n'Enugu ekweghị kwuo aha nwaanyị a ha gbapụtara mana ha gbara ama na mwakpo ndị ọzọ mere n'obodo Inyi taa bụ Mọnde.
Ọtụtụ ihe onyonyo ndị ọzọ pụtara na soshal midia gosiri mwakpo ndị a nke gụnyere ndị gosiri ebe a gbara otu ọgba tum tum ọkụ.
Olu onye na-ekwu okwu na ya bụ ihe onyonyo kwuru na ha zuuru ọgba tum tum onye ọzọ ebe ahụ n'ike.
Ndị ojiegbe wakpo kwara otu ahịa, kwafuo ihe ahịa ndị mmadụ ma kụsasịa ọdọahịa ha dịka ihe onyonyo ọzọ siri gosi.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ekperima egbuola otu onye ọrụ nchekwa, tọrọ otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'Anambra
Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ agbagbuola otu onye ọrụ nchekwa n'obodo Oko, dị n'okpuru ọchịchị Orumba North n'Anambra steeti.
Nke a mere n'ụbọchị Sọnde, abalị iri na ise nke ọnwa Mee afọ 2022, dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Toochukwu Ikenga si kwuo.
Akụkọ kwuburu na onye ahụ agbagburu bụ onye uweojii, mana Ikenga kọwara na onye ahụ abụghị onye otu ha.
"Ndị uweojii Anambra Steeti ebutela ozu otu nwoke yi uwe ndị ọrụ nchekwa n'okporoụzọ dị n'Oko," Ikenga kwuru.
"Nnyocha gosiri na onye ahụ nke amabeghị onye ọ bụ abụghị onye uweojii."
"Mana nnyoncha ka na-aga n'ihu ịmata onye nwoke ahụ bụ nakwa ndị gburu ya."

Ebe foto si, Police
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ na-ekwu na mpaghara Orumba North dịzị ka ọ bụ ebe ndị ekperima ji mere isi ụlọọrụ ha n'Anambra Steeti.
Ụlọntaakụkọ Daily Sun kwuru na atọrọla ndị nkuzi abụọ na mahadum 'Federal Polytechnic Oko' nakwa otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị, n'ime izuụka abụọ gara aga.
Aha ndị nkuzi ahụ bụ Ignatius Onyejekwe na Taiwo Ogunbaide, mana e mechara tọhapụ ha dịka ha kwụchara ndị ntọrị ahụ nnukwu ụgwọ.
Okechukwu Okoye, bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a tọọrọ n'ụbọchị 15 nke ọnwa Mee 2022, ka nọ n'aka ndị tọọrọ ya ruo ugbua.
Okoye bụ onye na-anọchite mpaghara Aguata 2 n'ụlọomeiwu Anambra Steeti. Ọ bụ na mpaghara a ka Gọvanọ Anambra bụ Chukwuma Soludo si pụta.
Etu ndị 'Unknown Gunmen' si gbaa isi ụlọọrụ Idemili-North, ụlọikpe Majie na ụlọọrụ EEDC ọkụ

Ebe foto si, Screengrab
Ebe niie na-akpọtụ n'Ogidi, Anambara steeti dịka ndị 'Unknown Gunmen' wakporo ma gbaa isiụlọọrụ Okpuru Ọchịchị Idemili North na ụlọikoe Majie dị n'obodo ahụ ọkụ n'Ụbọchịụka.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọkụ gbara akwụkwọ dị mkpa, ụgbọala karịrị 20 nakwa ihe ndị ọzọ dị n'isi ụlọọrụ ahụ.
Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ndị omekome kpara mkpa mkpa ahụ n'ime abalị.
O kwuru na ndị ekperima ahụ gbara isi ụlọrụ okpuru ọchịchị Idemili, ụlọikpe dị n'ogige ahụ nakwa ụlọọrụ EEDC.

O kwuru na ọkụ ahụ gbara rue ụtụt.ụ taa bụ Monde.
" Anyị malitere nụwa ka egbe na-ada, mkpọtụ na-eme ka a na-alụ ọgụ."
" Oge chi foro anyị jụwara were nụ a gbara isiụlọọrụ Okpuru Ọchịchị Idemili-North, ụlọikpe dị n'ime ogige ya nakwa ụlọ na-enye ọkụ latrik".
Nwa amadị ahụ gara n'ihu kwuo na ndị omekome ahụ gbara ihe karịrị ụgbọala 20 dị n'ogige ahụ ọkụ.
Foto na ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri na ụgbọla ndị o metụtara gbara jaa jaa.

Ebe foto si, Umunna TV
Ka a ka na-ekwu n'ọkụ gara fada, a mụnyekwara ụlọọrụ na-enye ọkụ latrik n'obodo ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga azaghị ekwentị ya, nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'igwe okwu Whatsapp.
Mana ngosi dị n'igwe okwu gosiri na ọ gụrụ ozi ahụ.
Ka abalị atọ gachara, ndị uweojii n'Imo steeti nyochapụtara ogige ebe ha sị ndị otu Ipob gburu otu onye otu ha n'afọ 2017 zoro.
Ndị uweojii Imo Steeti anwuchiela ndị ha sị bụ ndị Ipob/ESN gburu Inspector Felicia Nwagbara n'afọ 2017

Ebe foto si, Imo Police
Ndị uweojii nke Imo steeti ekwuola na ha ejidela ndị ha sị bụ ndị otu Eastern Security Network nke bụ akụkụ otu Indigenous People of Biafra (IPOB) maka ogbugbu onyeuweojii bụ Felicia Nwagbara onye bụ nwunye abụọ otu onye ha nwuchiri bụ Casmire Mgbugba.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Michael Abattam deputara nke a n'akwụkwọ ozi ọ depụtara.

Ebe foto si, Imo State Police
Ọ depụtara na ndị a ha nwuchiri gburu onye uweojii ahụ n'obodo Agwa were gbaa ọsọ.
O dee sị, " Dịka ozi rutere anyị na dibia na-agwọrọ ndị otu Ipob na ESN ọgwọ alọghachila n'obodo Ubah Agwa nke dị n'okpuru ọchịchị Oguta Imo Steeti, anyị wuchiri n'ụbọchị 18/05/2022 n'elekere isii nke mgbede were gbaa ebe ahụ okirikiri were nwuchie ndị a".
Ndị a anwuchịrị a na-ebo ebubo a gụnyere Casmire Mgbugha dị afọ 53, Hycent Chimezie dị afọ 30, Hycent Azunna dị afọ 28, Hycent Ifesinachi dị afọ 26, Hycent Chimobi dị afọ 23, Chukwuemeka Wisdom dị afọ 22 na Nnadike Clifford dị afọ 72.
Ihe ndị uweojii si anapụtara ha bụ otu ụgbọala, uwe ọgụ ndị uweojii nke bụ nke Felicie Nwagbara ha gburu, ọkọlọtọ Biafra, eke dị ndụ, egbe ọka na mgbọ egbe.
Abattam kwuru sị, " Ọ bụ mgbe anyị na-ajụ ha ajụjụ ka ha kwuru na ọ bụ ha gburu Nwagbara ma sịkwa na ọ bụ ha na-emepụta egbe ndị anyị jidere n'aka ha".gburu onye uweojii ".













