Raids of unknown gunmen dens: E nwetara 'register' ndị ha tọọrọ na ego ha kwụrụ iji gbara isi onwe ha- Soludo

Ebe foto si, Anambra State Government
Ndị ọrụ nchekwa awakpoola ọdọ nzuzo ndị ojiegbe n'Ọgboji na Aguluuzuigbo dị n'Anambra steeti na nsonso a,
Gọvanọ steeti ahụ bụ Charles Soludo, onye gbara ama n'Ọka isiobodo Anambra steeti n'ụbọchị Satọde oge ó na-edu ndí Kómishóna óhúrú iyiórú kwuru na ndị uweojii nwetara ọtụtụ ihe gunyere akwụwkọ
ndị omekome ahụ ji edebanye aha ndị ha tọọrọ na ego ole ha napụrụ ha maka ịgbara isi onwe ha.
Ama na-abịa dịka ndị bu egbe wakpochara isi ụlọọrụ Okpuru Ọchịchị Agụata ebe ndị omekome wakporo ma sunye ụlọọrụ ahụ ọkụ na nsonso a.
Soludo kọwara na ọ bụ iwe ya bụ mwakpoo ahụ e mere ndị ojiegbe ahụ gaa sunye ọkụ n'isi ụlọọrụ AOkpuru Ọchịchị guta.
Soludo onye kwuru na ohere ka dịrị ndị na-ebugharị egbe na steeti ahụ ka ha chịsa ngwaọgụ ha ka ha gọọmentị nye ha ọzụzụ ọbụla ha chọọrọ.
O kwuru na ohere ahụ gafee, na onyela a hụrụ bu egbe na a ga-eme ya dịka onye ekperima.
Ihe Soludo gwara ndị Komishona ọ hụrụ o duru iyi ọrụ

Ebe foto si, Anambra Government
Charles Soludo nọrọ n'emume ahụ duo mmadụ iri abụọ nke isii n'ime ha bụ ụmụnwaanyị iyi ọrụ dịka ndị kọmishiona ọhụrụ steeti ahụ.
Soludo gwara ndị kọmishiona ọhụrụ ahụ na ọkwa ahụ abụghị maka mmemme, kama ọ bụ ịrụ ọrụ a hụụ anya.
Ọ gwara ha ka ha tinye anya rụọ ọrụ e kenyere ha ka e were ọrụ ha na-echeta ha oge ha pụrụ n'ọkwa.
Ndị ojiegbe agbagburu ehi ndị mmadụ n'Aguata ?

Ebe foto si, Screen grab
Ihe onyonyo na-efegharị n'ọbaozi ọnya nwaudude na-egosi ehi ndị mmadụ nwụrụ anwụ n'ot ahịa dị na Anambra steeti.
Ndị hụrụ ebe ya bụ ihe mere sị na ọ bụ n'ahịa ebe a na-ere ụmụanụ na Ngo Igbo Ukwu ka ya bụ ihe mere.
Ọ sị na ndị ahụ na-eti, "anyị achọghịzị ehi ndị Fulani ebe a" mgbe ha ji egbe agbagbụo ehi na ewu ndị ahụ.
O kwukwara na ndị ahụ si isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Aguata mgbe ha kpara mkpamkpa ahụ n'ahịa Ngo dị na Igbo Ukwu n'Anambra steeti.

Ebe foto si, Soludo TV
'Onye ọbụla jụrụ ịnara ohere nchegharị anyị nyere ga-eji isi ya buru ya' - Soludo
Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra steeti ekwuola na ndị ọbụla jụru iwere ohere mgbaghara gọọmentị steeti ahụ nyere ga-eji isi ya bụrụ ya.
Soludo kwuru nke a mgbe ọ mere njem nleta n'isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Aguata bụ ebe ndị omekome gbara ọkụ ma mebikwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ụnyaahụ bụ Tọzde.
Soludo sị na ihe butere ya bụ na ndị agha Nịajirịa gara chụpụta ha n'ime ọhịa ebe ha zoro n'Aguluezechukwu na Ogbaje kemgbe afọ abụọ agara aga.
Mgbe ha sizi ebe ahụ agba ọsọ ka ha tinyere ọkụ ebe ahụ "nwere gbaa ọsọ ụjọ".
Ọ sị na, "ndị ọbụla nọ n'ime ọhịa nwere ohere ịpụta ụgbụa bịa nara ọzụzụ gọọment chọrọ inye ga-enyere ha aka ịba uru n'obodo. Mana ọ bụrụ na ha achọghị ime otu a, ndị Anambra ga-eweghara ala ha".
Ọ sị na ndị Anambra dị njikere ịweghachite udo na be ha.
Soludo kwuru na ọtụtụ ndị na-akpa ike a si steeti ndị ọzọ gbara Anambra gburu gburu.
Ọ sị na ihe niile a hụrụ ebe ha nọ mgbe ha gbara ọsọ gosiri na ha bụ ndị ohi.
"akwụkwọ ha ji edepụta ego ndị ha tọọrọ na ndị nke ka ji ha ụgwọ".
Aguata Local Government: Ihe ọhụrụ ụfọdụ anya hụrụ ọkụ ọgbụgba nke Aguata na Nnewi kwuru

Ebe foto si, Screenshot
Akụkọ si n'ọnụ ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị gwara BBC Igbo na akụkọ mwakpo a na-efegharị mere n'ezie ma kwuo na:
"Ndị o ji egbe a ji iwe wakpoo isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Aguata iji bọọ ọbụbọ agha ndị agha Naịjiria busoro ha na mpaghara Ogboji nakwa Aguluezechukwu taa bụ Tọọzde"

Ebe foto si, Screenshot
Ọ pụtara na ndị agha Naịjirịa wụbanyere na mpaghara Ogboji na Aguluezechukwu taa bụ Tọọzde ma buso ndị o ji egbe a sị nwere ogige zoro ezo ebe ahụ dịka akụkọ si kwuo.
Amabeghị etu agha a a sị ndị agha Naịjirịa busoro ndị a ebe ahụ si gaa mana akụkọ na-ekwu na akwakọrịtara mgbọ ebe ahụ.
Kedụ ihe ndị uweojii kwuru?
Ndị uweojii Anambra steeti gwara BBC Igbo ama na ọkụ na-agba n'isi ụlọọrụ okpụrụọchịchị Aguata nke steeti ahụ taa bụ ụbọchị Tọọzde, ụbọchị asaa n'ọnwa Eprel, 2022.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ebe ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ha amabeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba a.
O kwuru na: "Anyị ka na-eme nnyocha okwu a, anyị ma maka ya bụ ọkụ, ezigala ndị ọrụ gbata gbaa mmeyụ ọkụ ebe ahụ ugbua"
Ikenga kwuru na ha amabeghị ma enwere ndị merụrụ ahụ na ya bụ ihe na-eme ebe ahụ.

Ebe foto si, Screenshoy
Kedụ ka akụkọ a si malite?
Ọtụtụ ihe onyonye na-efegharị na sosha midia kwuru na ọ bụ ndị o ji egbe wakporo ebe ahụ ma mụnye ya ọkụ.
Olu ndị a nụrụ n'ime ihe onyonye a ji ụjọ na-ekwu:
"Ndị mmadụ nọ n'ime ụlọ a, ndị mmadụ ka nọ n'ime ụlọ a"
Ya bụ isi ụlọọrụ Aguata nke eboro ebubo na ndị o ji egbe wakporo.

Ebe foto si, Screenshot
N'otu ihe onyonye ọzọ na-efegharị na soshal midia, ahụrụ ebe akụkụ ihu ụzọ geetị isi ụlọọrụ ahụ na-agba ọkụ.
Ọtụtụ akụkụ ụlọ ahụ nọkwa na-agba ọkụ dịka ya bụ ihe onyonyo si gosi.

Ebe foto si, Screenshot
Olu onye na-ekwu okwu na ihe onyonyo ahụ bụkwa onye na-ese ya kwuru:
"Lee ezigbo ọkụ na-agbe ebe o"
"Lee ụgbọala bọọsụ nke na-agba okụ"
Ọ tụrụ aka ebe ọzọ kwuo: "Ụgbọala nke a na-agbakwa ezigbo ọkụ"

Ebe foto si, Screenshot
Ihe onyonye ndị gosiri etu ndị nọ ebe ahụ si were ụjọ na mkpu na-agba mbọ achọ ụzọ imenyụ ya bụ ọkụ
Ọtụtụ ihe onyonyo na soshal midia gosiri etu ndị mmadụ gbakọta n'ogige isi ụlọọrụ ahụ ma na-agba mbọ igbapụta ndị a sị bụ ndị orụ ebe ahụ tọrọ na ime ụlọ ahụ dịka ya bụ ọkụ na-agbasi ike.

Ebe foto si, Screenshot
Mwakpo a sị mere na Nnewi
Onyoonyo na-efegharị na soshịal midịa na-egosi ka e si mụnye ọgbatumtum ọkụ nakwa ọgbaghara na mpaghara dị ịcheịche na Nnewi.
Olu onye sere ihe onyonyo ahụ pụtara na soshal midia nke gosiri ọgbatumtum na-agba ọkụ kwuru na ebe ahụ bụ na Nwaafor Uruagu dị na Nnewi nke Anambra steeti.

Ebe foto si, Screenshot
Olu onye na-ese ihe onyonyo ahụ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbadoanya n'ihi egwu dị, ma kwuo na:
"A tụchịela ezi, site na St. Mary ruo Nwaanyị Imo Bus stop".
Ndị bi ebe ahụ gwara BBC Igbo na n'ezie oke egwu nọ ebe ahụ dịka ọtụtụ n'ime ha ji ụjọ gbachie ụlọọrụ ha nakwa ụlọahịa ha dịka a hụrụ ọtụtụ ndị ntorobịa na-akwụchị ụzọ ma tinyecha 'tyre' ụgbọala n'okporoụzọ dị ịcheịche na Nnewi.
Ụfọdụ bọrọ ebụbọ na ndị a bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na-egosi mwute ha na onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu ga-apụta ụlọikpe n'ụbọchị Fraịdee bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprel, 2022.
Gịnị ka ndị uweojii kwuru maka mkpamkpa a sị kpara na Nnewi?
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ha anụbeghị ozi ọbụla banyere akụkọ a.
Cheta maka iwu ịnọrọ n'ụlọ ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) hibere
Otu Ipob kwupụtara maka mmaachị ndị mmadụ ịpụta ezi ụbọchị ọbụla onye ndu bụ Nnamdi Kanu na-apụtara ụlọikpe kemgbe Gọọmentị Naijiria Naịjirịa wụchịrị ya maka ebubo ikpa nkata ikwatu gọọmentị Naịjirịa nakwa iyi ndụ egwu.
Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Chukwuma Soludo zipụtara ozi na ọ chọrọ iweghachịte udo na nchekwa na steeti ahụ n'izu gara aga ma rịọ ndị ojiegbe niile nọ ebe ahụ ka ha chịlie aka ma bịa ka ha nwee mkparịtaụka dịka o kwuru na ọ ga-anabata ha (amnesty) ma nye ha ọzụzụ n'ọrụ ọbụla ha chọrọ.
Ndị mmadụ na-atụ anya ima ihe kpatara ọkụ ọgbụgba a n'isi ụlọọrụ Aguta nke Anambra steeti dịka ihe dị etu a mere n'Imo steeti mgbe ndị omekome wakporo isi ụlọọrụ nke Orsu n'Imo steeti n'izu gara aga.
Akụkọ pụtara na-eji ihe ntecha tesaa ihu geetị isi ụlọọrụ Orsu n'ụlọọchị Tuzde mana gọọmentị Imo kwuru na nke a bụghị eziokwu agbanyeghị na ọtụtụ ihe onyonyo pụtara na soshal midia gbara ama nke a.
Gọọmenti Anambra ezipụtabeghi ozi maka akụkọ nsogbu niile pụtara n'Anambra taa.
















