Buffalo Shooting: Onyeọcha dị afọ 18 agbagbuola mmadụ 10 n'Amerika

Image shows two women hugging

Ebe foto si, EPA

Ndị isiojii bi na mpaghara Buffalo dị n'Amerịka nọ n'iru uju dịka onye bu egbe gbagburu mmadụ iri nna mpaghara ahụ ụbọchị Satode.

Otu nwata nwoke gbara afọ 18 a kpọrọ Payton Gendron gbagburu mmadụ iri n' ogbe ndị isi ojii bikarị na New York dị n' Amerịka.

Otu nwa afọ bi na 'ebe ahụ gwara BBC na 'onye ọbụla nọ n'obi mwute." mana o kwuru na ọdachi ahụ metụtaghị ezinaụlọ ya.

A nwụchiri nwa amadi Gendron dịka ya na ndị uweojii kwatara n'ụlọahịa dị na Buffalo.

Granton onye banyere n'ụlọahịa ahụ n'ehihie Satọde bido wụwa mgbọ nọ na-egosi ihe ọ na-eme n'ịntanetị dịka ọ na-eme ya.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden katọrọ ya bụ ihe nke ọ kpọrọ "arụ".

Aha onyonyo, 'Chinedu Okobi nwanne m na-agara onwe ya ndi uweojii Amerika gbuo ya'

Stephen Belongia nke ụlọọrụ FBI mpaghara Buffalo kwuru na "anyị na-enyocha ihe a mere dịka mpụ akpọmasị na ogbugbu nke akpọmasị agbụrụ kpalitere".

Ụlọ ntaakụkọ CBS kwuru na nwa amadi ahụ kwuru ọkwụ mkparị megide agbụrụ oge ọ na-akwa mgbọ ma dekwaa ya ede n'egbe ya.

Payton Gendron pụtara n'ụlọikpe n'abalị 15 nke ọnwa Mee 2022 maka ebubo igbu mmadụ n'anya ọcha

Ebe foto si, CBS

Nkọwa foto, A kpụpụrụ Payton Gendron n'ụlọikpe na Mee 15,2022, maka ebubo igbu mmadụ n'anya ọcha

O dekwara ozi na-ekwu ebunobi ya nke e tinyere okwu akpọmasị agbụrụ.

Nwa amadị a a na-enyo enyo gbara ụgbọala site ihe ruru mailị 200 rute na mpaghara obodo ebe ndị ojii kachasị biri.

Aha onyonyo, Ngagharịiwe maka ọnwụ George Floyd

Dịka Kọmishọna ndị uweojii Buffalo bụ Joseph Gramaglia siri kwuo, Gendron gbara mmadụ 13 egbe, ọtụtụ n'ime ha bụ ndị isi ojii.

Gramaglia gwara ndị ntaakụkọ sị, "Ọ pụtara n'ụgbọala ya. Ọ kwadoro nke ọma jide ngwaọgụ ebe ọ dị ukwu. O jikwa okpu nchere isi. O bukwa igwe ose foto nke o ji egosi ihe ọ na-eme ozigbo na ịntanet."

O kwuru na nwa amadi ahụ nyefere ngwaọgụ ya dịka ya na ndị uweojii kwarịtara mgbọ, anwụchie ya .

Ndị uweojii

Ebe foto si, Reuters

E mechara kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo igbu mmadụ n'anya ọcha.

Mmadụ atọ merụrụ ahụ n'ọdachị ahụ bụ ndị na-arụ n'ụlọahịa ahụ, mana ha emerụghị nnukwu ahụ nwere ike itinye ndụ ha na nsogbu.

Otu onye uweojii lara ezumike nka na-arụ ọrụ onye nche na ụlọahịa ahụ gbalịrị ịgba nwa amadi ahụ egbe mana o so na ndị ọ gbagburu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: