Igbo Presidency 2023: Ọwụwa Anyanwụ o ketala oke n'ọkwa onyeisiala Naijiria kemgbe Independa?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Na nsonso a, okwu a kpụ n'ọnụ bụ okwu ndị ndị Ọwụwa Anyanwụ iwepụta onye ga-achị Onyeisiala n'afọ 2023.
Ụfọdụ, na-ekwu na ọ bụ okwu onye zọta, o were, ebe ụfọdụ na- ekwusi ike na ọ bụ Ọwụwa-Anyanwu ka o ruru dịka ha gbadoro ụkwụ n'ihe a na-eme kembge bụ o rute nwa, o rute ibe ya.
Mana ọ bụ eziokwu na ọ bụ Ọwụwa Anyanwụ ka ọchịchị Naijiria kwesịrị irute ma agụkọwa mpaghara ndị chịarala sị pụta?
Lee etu e si kee ọchịchị Naijiria kemgbe Naijiria weghara ọchịchị n'aka mba Briten n'afọ 1960:
Kemgbe Naijiria chịrịla onwe ya malite na Nnwereonwe n'afọ 1960, e nweela onyeisiala mmadụ 14(Ọ gara abụ mmadụ 16 mana mmadụ abụọ bịara ugboro abụọ).
N'ime afọ 61 a, ndị Ugwu achịala afọ iri atọ na itoolu na abalị otu nari na iri abụọ na asaa; ndị Ndịda achịala afọ iri na itoolu, abalị narị abịọ iri asaa na asaa( 11 years, 277 days.
Soro m ka anyị gbarie ya na mpaghara, na mpaghara:

Ọwụwa Anyanwu Ugwu (North-East)
Mpaghara Ọwụwa Anyanwu Ugwu(North East) achịala Naijiria afọ isii.(6 years)
Nke a bụ Ọchịchị Tafawa Balewa dịka onye Praim Minista malite n'ọnwa Oktoba afọ 1960 e nwere nnwereonwe rue n'abalị iri na isii nke ọnwa Januwarị afọ 1966 bụ mgbe ndị agha kwaturu ọchịchị ndị nkịtị, mbụ ya na Naijiria.
Ndịda-Ugwu(North-West)
Mpaghara Ndịda Ugwu achịala Naijiria afọ iri abụọ na abalị iri atọ (20 years, 30days).
Nke a bụ afọ anọ na ụma nke Shehu Shagarị, otu afọ na ụma nke Muhammadụ Buhari dịka onyeagha; afọ isii na ụma ọ nọrọla ugbua dịka onye agbada na afọ abụọ na ụma nke Musa Yar'Adụọa tupu ọ nwụọ n'oche.
Nke a nyere ohere ka Goodluck Jonathan bụ Osote ya banye ma nọtọpụ n'ọkwa ahụ tupu ọzọ ọkwa onyeisiala nke ya.

Ebe foto si, Bayo Omoboriowo, AFP
Etiti Ugwu(North-Central)
Mpaghara Etiti Ugwu Naijirai chịrị Naijira afọ 17, abalị 188.(17 years, 188 days)
Nke a bụ afọ itoolu nke Generalụ Yakubu Gowon, ọnwa isii na abalị iri na asatọ nke Murtala Muhammed na abalị narị atọ iri isii na ise(355 day) nke Generalụ Abdulsalam Abubakar afọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ọdịda Anyanwụ(South West)

Ebe foto si, BBC/ Bayo Omoboriowo
Kemgbe Nnwereonwe rue ugbua, ndị Ọdịda Anyanwu bụ ebe ndị Yooroba si pụta achịala Naijira afọ iri na otu na abalị iri asatọ na atọ (11 years, 83 days. Nke a bụ afọ atọ nke Olusegun Obasanjo dịka onyeagha, abalị iri asatọ na atọ nke Ernest Shonekan nakwa afọ asatọ nke Ọbasanjo dịka onye agbada.
Ndida Ndida (South-South)

Ebe foto si, Getty Images
Mpaghara Ndida-Ndida achịala afọ ise(5 years).
Nke a bụ site n'ọchịchị nke Goodluck Jonathan, onye Bayelsa steeti bụ onye chịtọpụrụ otu afọ na ụma nke Musa Yar'Adua bụ onye nwụrụ n'ọkwa onyeisiala ma chịkwa afọ anọ ọzọ.
Ọwụwa Anyanwụ(South-East)

Ebe foto si, Getty Images
Ọwụwa Anyanwu achịala ọnwa isi na abalị iri na anọ.
Nke a bụ site n'aka Majọ Generalụ Aguiyi Ironsi , onye bụ onyeisiala malite ka e mechara mweghara ọchịchị n'ike n'abalị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị afọ ,1966.
Ọ chịrị rue abalị Julai 29, oge e gburu ya, bee ya isi na Lagelu dị n'Oyo steeti. Ọ chịrị naanị ọnwa isii na-abalị iri na anọ.
Ihe nke a pụtara na a naghị agụnye ọnịnọ nke Nnamdi Azikiwe dịka Onyeisiala n'ihi na usoro ọchịchị a na-achị oge ahụ bụ 'parliamentary system' nke onye nwere ikike onyeisiala bụ Tafawa Balewa.

Gini mere Igbo jii eti mkpu na ọ bụ ha ka ọchịchị ruru ugbua?

Ebe foto si, Ebere Ekeopara
Ọ bụghị naanị Ọwụwa Anyanwu maọbụ ndị Igbo bụ agbụrụ nọ Na Naijiria n'ihi na e nwere ike karịrị agbụrụ 350. Mana ndị kachasị nọ ọnụọgụgụ bụ Awụsa, Yoroba na Igbo.
Ndí nú na-eru n'okwu kówara Agbụrụ ndị Awụsa/Fulanị nọ Ugwu Naijiria anọla n'ọkwa, ndị Yoroba anọọla na ya bụ ọkwa, ebe ndị Ọwụwa Anyanwụ bụk Igbo anọbeghị ya karịa ọnwa isii.
Dịka ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze Ndigbo bụ Alex Ogbonna ya sị kọwaara BBC, "n'afọ 1999, ndị ndọrọndọrọ Ọchịchị nọrọ n'afọ 1994 were kwekọrịta na a ga na-eke ọkwa Onyeisial n'etiti Ugwu na Ndịdị."
"Ọ gaa n'Ugwu, Ọ gbadata na Ndịda ndị Yoroba were"
"Ọ gaa n'Ugwu, gbadata na Ndịda, Ndị Naija Delta were"
"Ọ gaala n'Ugwu, ọzọ ọ ga-agbadata, ọ bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ kwesịrị iwe ya."
Ọ bụghị naanị otu Óhaneze Ndigbo bụ ndị kpọrọla oku a. Otu South-East For President2023 ebidolari afọ ole na ole gara aga tiwe mgbu a.
Ndị ụfodụ abụghị ndị Igbo dịka otu otu Yoroba a kpọrọ Afenifere nke onye ndu ha bụ Ayo Adebanyo akpọkwala oku ka inye ndị Ọwụwa Anyanwụ ohere iji weta ịdị notu.
N'aka nke ọzọ , ndị ndu ụka atụnyela ọnụ n'okwu a.
Na nsonso a otu Ụkọchukwu a na-anụ aha ya mabúrú nnukwu ụkọchukwu nwe ụlọụka "Champions Royal Assembly' dị n'Abụja,bụ Joshua Iginla kpọro oku ka nye ndị Ọwụwa Anyanwụ ohere Ọkwa Onyeisiala n'afọ 2023.

Ebe foto si, Joshua Iginla
Na nkọwa ya, mpaghara ndị ọzọ dị na Naijria kwesịrị inye Owụwa Anyanwụ ohere ichi Naijiria ma ọ bụghị otu ahụ, nye ha ohere ị gawara onwe ha.
"Ị gaghị na-ekwu 'one Naijiria' mana o ruo n'ịzọ ọkwa Onyeisiala, ịsị na onye Igbo agaghị azọ ya."
Ka ọ dị ugbua, o nwebeghị onye ma ebe osisi ọji ahụ oke na-efe ga-ada dịka Pati abụọ kachasị na Naijirai bụ APC na PDP enwebeghị ihe kwuru hoha, mpaghara ha ga-etinye ọkwa onyeisial ha.
Dịka Igbo si kwuo, Ka a na-aga n'ubi ma ji na-aka.

















