Ipob: Ndị Ugwu agaghị enyelata Igbo ọkwa onyeisiala

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra'(IPOB) akpọọla ndị okenye Igbo oku ka kwụsị ịrịọ ndị Ugwu ka ọkwa onyeisiala rute ha aka n'afọ 2023, ma sonye na mbọ nnwereonwe Biafra.
Ọnụ na-ekwuru Ipob Bụ Emma Powerful kwuru nke a n'ozi mgbasaozi o binyere aka ma zitere BBC Igbo n'ụbọchị Wenezde.
Otu Ipob gwara ndị okenye Igbo gụnyere Ohaneze Ndigbo na ndị Ugwu adịghị njikere inyefe onye Igbo ọchịchị n'ihi ihe ha kpọrọ 'obiinu' ha nwere n'ebe ndị Igbo nọ.
Ha kwuru na kama ị na-arịọ ka enye ha ọkwa Onyeisiala, ha kwube okwu nnwereonwe.

Ebe foto si, Getty Images
Ha gara n'ihu gbaa ama na ha agaghị anabata ka ndị okenye Igbo nwere Nnamdi Kanu zụọ okwe ịnweta ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.
Ozi ahụ sị, "Ha kwesịrị ịmata na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ugwu nakwa ndị Fulani na-ekwu ihe na-eme na Naijiria agaghị ekwelata ka onye Igbo bụrụ onyeisiala Naijiria."
"N'agbanyeghị ha na-aracha ha ike, ha nwere obi inu megide ndị Igbo. Ya bụ, ọ kama na ha tinyere uchu na inweta Biafra."
"Ọ baghị uru ị na-ekwu maka ọkwa ọchịchị ịgbadata na 2023 ebe nwa afọ Igbọ bụ Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ."
Otu Ipob gara n'ihu dọọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ojiegoachụego, ndị ọdịnala, ndị ndu ụka na ndị ndụ Igbo gụnyere otu Ohaneze aka na ntị ka ha sepụ aka n'ikwu okwu ga-ebute ka e jiiri ndị Igbo akwa emo.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:
- Ndị ntọ tọọrọ Eze, ndị nze ya na mmadụ anọ ndị ọzọ n'Imo steeti, atọhapụla ha
- Ihe mere na o nweghi onye na-akatọ ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ
- Ihe nwere ike ime ka ọtụ nwaanyị ghara ịgba mmiri ọfụma n'oge aramara
- 'Ovulation', ara ibu ibu, inye nwa ara na ihe ndị ọzọ nwere ike ibute ara ịfụ nwaanyị ụfụ
- Ihe ndị na-eme n'ezie ma ị mee mmekọ na nsọ nwaanyị










