Sir David, onye ejije Nollywood anwụọla

Ebe foto si, Dave Osagie/Inst
Nollywood abanyela n'iru uju ọzọ na-erughi otu izu mmadụ abụọ nwụlaghịrị ha, dịka ome ejije a ma dịka 'Sir David' Osagie lakwuru ndị nna nna ya n'ụtụtụ ụbọchị anọ nke ọnwa Mee afọ 2022.
Dịka akụkọ si kwuo, Sir David bụ onye na-emekarị ejije dịka Igwe maọbụ onye ichie, mechara ejije laba ụra mana o teteghi n'ụtụtụ.
Nonso Uzozie bụ onye ya na ya na-emekọkarị ejije gwara BBC Igbo na ọ nwụọla n'ezie.
Ndị ya na ya so na-eme ya bụ ejije chi bọrọ ụbọchị ọ nwụrụ, kọwara na ha gara ịkụrụ ya aka n'ọnụ ụlọ ya, wee hụ na ọ bụrụla ozu.
Ụfọdụ n'ime ha kwuputere arịrị ha dịka ha sị na ọ bụ otu onye anaghị achọ nsogbu ọkachasị ma a bịa n'ime ejije.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Sir David
- Aha ya bụ David Ogbeosamudia Osagie
- Ọ bụ onye Edo steeti
- A mụrụ ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba
- Ọ rịara ọrịa ntụrị ụkwụ a kpọrọ 'polio' mgbe ọ dị ntakịrị
- O ritere ihe nturugo 'Best Breakthrough actor' nke ndị SRTV, n'afọ 2020
- O meela ọtụtụ ejije gụnyere 'My sorrow, my pain', 'The Royal Battle' wdgz.




