Etu Chinedu Bernard, Chima Precious ndị ejije Nollywood si laa mụọ

Chinedu Bernard na Chima Precious

Ebe foto si, Chinedu Bernard na Chima Precious

Nkọwa foto, Chinedu Bernard na Chima Precious bụ ndị Nollywood

Anyammiri na akwa arịrị na-atụ n'etiti ndị ejije Nollywood na Naijiria taa dịka ndị otu ha abụọ; Chima Precious na Nwada Chinedu Bernard Nwankwo lara mmụọ n'okorobịa na agbọghọ na Fraide.

Dịka onyeisi otu jịkọrọ ndị ejije Nollywood a kpọrọ Actors Guild of Nigeria (AGN) bụ Emeka Rollas, si gwa BBC Igbo n'ụtụtụ Satọde, Bernard bụ onye e ji "Choco" mara, gbabiri nwụọ n'Enugwu, ebe Precious nwụrụ n'Abuja ka ọ rịachara ahụ obere oge.

Rollas sịrị, "E nwetara m ozi na Chinedu Bernard gara ụlọụka ihicha ala n'ụlọụka St. Leo the Great Catholic Church dị na Federal Housing, Enugwu, daa nwụọ."

Rollas kwuru na ya enyela ntuziaka ka onyeisioche otu 'Actors Guild' n'Enugwu mee nchọpụta ka a mata etu o siri nwụọ (autọpsy) ka a mara ma ọ dara n'ala kụọ isi n'ala ka ọ na ọ bụghị etu ahụ.

N'aka nke ọzọ, Rollas kwuru na Chima Precious dara obere ahụ, e buga ya n'ụlọọgwụ 'Kubwa Generel Hospịtal' mana ihe na-eme ya kawanyere njọ, e were gawa Gwagwalada General Hospital.

"Ka e buzi ya aga Gwagwalada General Hospital, ọ nwụọ n'ụzọ."

Rollas onye kọwara na ọ bụ ịba na taịfọd ka Precious rịarịa, gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị abalị abụọ ka ọ nọrọ n'ụlọọgwụ tupu ọ nwụọ.

Ọ gara n'ihu dọọ ndị ejije aka na ntị ka ha gbalịa na-aga ụlọọgwụ mgbe ọbụla ha nwere nsogbu ahụike.

Aha onyonyo, Judy Austin: Nwunye Yul-Edochie nke abụọ gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara mgbe ọ mụrụ nwa

Na nsonso a, ọnwụ ọnwụ na-afịọ na Nollywood dịka ụfọdụ n'ime ha a ma ama dịka , , Chinedu Nwadike, nwụrụla, ebe ụfọdụ dịka John Okafor, Kingsley Orji rịarịala ọrịa dowere ha n'agbata ọnwụ na ndụ tupu ha nwere onwe ha na nsonso a.

Rollas kwuo na ya ehiwela komitii mmadụ atọ nke Ụkọchukwu Eucharia Anunobi nọ n'isi ya, maka ihaziri ndị otu ha ekpere megide ọnwụ erughị eru.

Ihe ndị kwesịrị ị ma maka Chinedu Bernard

Chinedu Bernard

Ebe foto si, Chinedu Bernard-Facebook

  • Ọ bụ onye Enugwu steeti
  • Ọ sonyela n'ọtụtụ ihe ejije gụnyere 'The Big Mama's Stick',' Money fever' na
  • Ndị ọzọ bụ:'Love with Conscience'; The Mad, 'The Last Manhood', 'Mad Love' wdg.

Ihe ndị kwesịrị ị ma maka Chima Precious

Chima Precious

Ebe foto si, Screengrab

  • Chima Precious bụ onye ejije Nollywood na-ekulite ekulite
  • Ụfọdụ ihe ejije o merela gụnyere 'Domestic Accident, Daddy's girls, 'Taxi' na wgz'.
  • Ndị ọzọ bụ 'Hotel Majestic', 'Somewhere in Abuja' na 'Diary of the Triplet.'
  • Ọ bụ onye e ji ihu ya ere ahịa nke Bekee kpọrọ 'modeling' ma bụrụkwa onye na-akwa akwa