Yul Edochie Second Wife: 'Abụghị m onye mbụ nke m ga-eji abụ onye ikpeazụ - Judy Austin

Ebe foto si, Judy Austin /Yul Edochie/Instagram
Nwunye nke abụọ nke Yul Edochie, onye ejije a ma ama bụ Judy Austin Muoghalụ, ekwuola na ọ bụghị ya bụ onye mbụ a ga-alụ dịka nwaanyị nke abụọ, nke ya ga-eji abụ onye ikpeazụ.
Nke a bụ mbụ ọ pụtara n'ọha kwuo okwu kemgbe Wenezde, izuụka gara aga bụ oge Yul Edochie kwupụtara n'ọha na ya lụrụ Judy bụ nne mụtaara ya ọmarịcha nwa nwoke dịka nwunye nke abụọ.
Nkwupụta ahụ kpọtụrụ akpọtụ na soshal midia na Naijiria gbaa gburu gburu dịka ọtụtụ katọrọ Yul maka ịrapụta nwunye bụ ya bụ onye nọnyere ya oge o nwebeghị ihe ọ bụ.
Ndị mmadụ takwara Judy bụkwa onye ejije na Nollywoodụta itinye isi n'ezinaụlọ nwaanyị ibe ya. .
Mana n' ọsịsa o nyere n'ihe onyonyo o wepụtara n'akara Youtube nke Yul Edochie n'abalị mbụ nke ọnwa Mee, Judy kwuru na "Abụghị onye mbụ nke m ga-eji abụ onye ikpeazụ."
Judy , onye kwuru na akụkọ ndụ ya dịka ihe nkiri nke onye nụrụ ya ga-agbanwe echiche ọjọọ o nwere megide ya tụrụ arịrị na ọtụtụ na-akatọ ya achọghị ige ntị nụrụ akụkọ nke ya onwe ya.
"Otutu mgbe na Naijiria , ndị mmadụ nụ akụkọ , ha anaghị eche ka ha nụ n'olu onye nke abụọ."
"Anyị nile bụ mmadụ, o nweghị onye na-etete ụra sị na ya ga-emejọ mmadụ ibe ya."
"Abụ m onye nwere afọ ọma, na-enwe aṅụrị , anaghị ekwe ka ihe ọbụla napụ m obiaṅụrị."
"O nweghị ihe ọzọ nwere karịa ịhụnanya."
Na naijiria ịlụ ụbara nwaanyị bụ omenala mana iwu megidere onye gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ịlụ nwaanyị nke abụọ.
Iwu ndị ụka Kraosti megidekwara mmadụ ịlụ karịa otu nwaanyị.
Onye bụ Judy Austin?

Ebe foto si, Judy Austin
Ezigbo aha ya bụ Muoghalu Uchechukwu Judith.
Ọ bụ onye ejije Nollywood, nke ya na Yul Edochie mekọrọla ejije mbụ.
Ọ bụkwa onye mmepụta ejije nke Bekee kpọrọ producer; o mepụtala ejije a kpọrọ "Native Girl" nakwa "Fear".
Ọ malitere ime ejije n'afọ 2013.
Ọ bụ onye Anambara steeti.
A mụrụ ya n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba.
Ọ gara mahadum na Nnamdi Azikwe University, Awka.
Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Vanguard nwere n'afọ 2020, Judy kwuru sị na ọ naghị "ahụ alụmdinanwunye dịka ihe mmadụ ji etozu oke".
Yul Edochie second wife: 'Anyị gwara Yul alụla nwaanyị nke abụọ mana o kweghị' - Uche Edochie, nwanne Yul

Ebe foto si, Uche/Yul Edochie
Nwanne Yul Edochie bụ Uche Edochie agbaala ama na ezinaụlọ ha dọrọ nwanne ha nwoke aka na ntị ka ọ ghara ịlụ nwaanyị nke abụọ mana ọ kpọchiri ntị gaa lụọ ya.
Cheta na akụkọ na Yul luru nwaanyị nke abụọ bụ Judy Austin Muoghalu, bụ onye ọ gbara ama mụtara ya otu ọmarịcha nwa nwoke tinyere ọkụ na soshal midia abalị ole na ole gara aga.
Ọtụtụ ndị mmadụ katọọ Yul bụ onye a ma dịka onye ụka Kraisti nakwa onye na-etokarị nwaanyị mbụ ya na soshal midia dịka onye nọnyere ya oge o nweghị ka ọ ha ya.
Mana, Uche Edochie, bụ nwaanne ya nwoke tọrọ ya kwuru na ọ bụ iji dozie ihe mebiri emebi mere ka Yul mee nke a na-agbanyeghị na ezinaụlọ ya akwadoghị ya.
N'ozi Uche Edochie wepụtara n'akara Instagram ya ụbọchị Fraide, o kwuru sị, "Anyị gwara Yul ya emena ya,. Mana ọ gara n'ihu mee ya.".
" Ịgbalitula mbọ ịmanye okenye ime ihe ọ chọghị ime n'ihe gbasara mekọrịta mmadụ na ibe ya ?"
"Yul chere na ịlụ nwaanyị nke abụọ bụ ụzọ kacha mma imezi ndahie ọ dahiere. O were ya nnukwu obi isi ike ime ya."
Uche kwuru na nsogbu na-eri ya nri n'afọ bụ nke Nwaanyị nke bụ bụ ezigbo mmadụ, nke abụọ bụ na Yul bụ onye na-ekpe ụka Kraisti.
Onye bụ Uche Edochie?

Ebe foto si, Uche Edochie/Instagram
O nweghị onye na-anụbu maka Uche Edochie n'ihi na ọ bụghị onye ọtụtụ okwu.
Mana ihe na-afịọ na soshal midia kemgbe akụkọ na Yul tụwara nwaanyị ime n'ama, lụọ ya akpalite ya ikwu okwu n'ọha.
Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka nwa amadị a:
•Uche Edochie bụ nwanne Yul Edochie, onye ihe ejije Nollywood a ma ma.
•Nna ha bụ Pete Edochie bụkwa onye a ma ama
•Uche Edochie gara akwụkwọ na ụlọ ọzụzụ maka nka akpọrọ Insititute of Fine Arts nke dị na mahadum 'University of Nigeria'
Ọ bụ onye ihe eserese sonyerela na ngosi esere emerela n'ebe dịka Amerịka, London na Paris.










