Ụzọ asaa ndị Nollywood si ebute nghọtaghie n’omenala

Ebe foto si, Mac Collins Chidebe/Facebook
N'ụwa niile gbaa gburugburu, onyonyo na-achawapụta ndị buru ha tinye n'ihu ndị mmadụ.
Ọ na-egosi etu ndị mmadụ si ebi ndụ na etu ha si eme ihe dị icheiche.
Ọ bụrụ na a tụgharịa ya etu ndị Bekee siri kwuo ya, 'onyonyo bụ enyo obodo' nke pụtara na ọ na-enyopụtasị etu obodo dị wee hazie ya gosi ndị mmadụ.
Nollywood bụ otu na-ahụ maka ihe ejije na Naịjirịa bụ otu kwụ chịm ma bụrụ nke atọ na mbaụwa ndị ọnụọgugụ onyonyo ha na-emepụta kachasị na mbaụwa.
Nolywood edebela Naịjirịa n'ogogo dị elu ma were omenala Naịjirịa kpagharịa gaa mpaghara niile n'ụwa site n'onyonyo ha na-emepụta na-egosi ndị Naịjirịa na agwa ha.
Dika onyeisi ndị otu Association of Movie Producers (AMP) bụ Peace Anyiam-Osigwe siri kwuo, "Nollywood bụ ihe tinyere Naịjirịa na mapụ mbaụwa ma gosi ụwa ihe ọma dị icheiche gbasara anyị na ihe ndị anyị na-emepụta."

Ebe foto si, Mac Collins Chidebe/Facebook
Nke a bu eziokwu maka na ọtụtụ ndị si mba dị icheiche na-abịabeghị Naịjirịa mbụ nwereike ikwu gbasara ụfọdụ omenaala, kpọọ ụfọdụ ebe aha site na onyonyo ndị ha lere.
N'ihi na Nollywood bụ ndị nwere ike pụrụiche nwereike ịkụzi maọbụ gbanwee echiche ndị mmadụ, ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na o nwere ụfọdụ ihe ha na-egosi na-abụghị etu ihe si kwụrụ na Naịjirịa ma na-ebute nghọtaghịe nye ndị na-ekiri ha. Ụfọdụ ihe ndị ahụ adabaghị adaba.
Ihe asaa Nollywood na-egosi na-abụchaghị ya na Naịjirịa
1. Legọs steeti bụ ebe a na-egbu ọzụ na ntabị anya
N'ọtụtụ onyonyo ndị Nollywood, ha egosila na n'ime obodo ka a na-ata ahụhụ, ndị niile nwere ego ihe na-agara nke ọma bụ ndị nọ n'ebe ọkụ na-enwu n'elu maobụ ndị bi na Legọs nke bụ na ewu na ọkụkọ ga-achọ ịga Legọs ebe ha ga-egbu ozu n'otu afọ maọbụ na ntabi anya.

Ebe foto si, Mac Collins Chidebe/Facebook
2.Ịgbankwụ
Ịgbankwụ bụ emume omenala ịlụ nwaanyị n'ụfọdụ obodo n'ala Igbo. Nke bu eziokwu bụ na ọtụtụ obodo anaghị eme ịgba nkwụ na mbụ.
Mana ugbua, Nollywood emela ya ọ dị ka ọ bu omenala ala Igbo niile.
Ụfọfụ ndị anyị gbara ajụjụọnụ kwuru na ndị obodo anaghị emebu ịgbankwụ, kama ha na-eme ịdọ mmanya, isi nri ọgọ, ịrụ ọrụ ọgọ nakwa ịhụ ahịa nwaanyị nke obodo dị icheiche nwere aha ha na-akpọ ya. Ịgbankwụ bụ omenala ụfọdụ ebe n'Anambara.
3. Dibia na-anọ n'ime ọhịa
N'imirikiti onyonyo ndị Nollywood, ndị na-arụ dibịa Igbo na-ebi n'ime ọhịa, onye ọbụla chọrọ izute ha ga-aga n'ime ọhịa, mana nke abụghị eziokwu.

Ebe foto si, Ebere Okaro/Instagram
4. Ndị okenye na-abụkarị ndị amụsụ
Otu nne nwanyị gwara BBC Igbo okwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ya anaghị agabu ndị obodo nso oge mbụ maka na ya na-eche na ha bụ ndị amusu maka etu ndị Nollywood si egosi ndị okenye n'ụfodụ onyonyo.
Nwanyị ahụ kwuru na ọ bụ oge ya mere okenye ka ya malitere ịga ndị okenye nso n'onwe ya na-emeghi ya na mmanye.
5. Ndị bi n'ime obodo na-egbu mmadụ
Ọtụtụ ndi Igbo nọ n'ofesi anaghị alọta maka na ha na-ahụ onyonyo ebe e gburu e jiri ọtụmọkpọ gbuo mdị lọtara ụlo.
Nke a n'onwe ya abụghị eziokwu.
Ebe e nwere ndị mmadụ n'ezie, ọ ɓụghị eziokwu na a na-egbu ndị niile si ofesi lọta.

Ebe foto si, Ebere Okaro/Instagram
6. Ndị nnedi bụ ajọ mmadụ
Patience Ozokwo ji onyonyo ebe ọ mere ajọ nnedi mere onwe ya aha nke bụ na ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekpe ekpere ka ha ghara inwe nnedi.
Mana nke bụ eziokwu bụ na nnedi niile anaghị emegide nwunye nwa ha.
7. Nkwakwalite atụmatụ ọgwụ ego
N'okwu ndị ọzọ a na-atụ Nollywood aka na ha na-abute Naịjirịa nsogbu, ndị omeiwu Naịjirịa nyere iwu ka ndị na-eme onyonyo kwụsị ịgosi onyonyo ebe a na-eme ọgwụ ego maka na ọ dịka ndị mmadụ jizi ya amụ etu e si agwọ ọgwụ ego. Agbanyeghi nke a, ndị nwere agba na Nollywood kwuru na aka ha adighi na ebubo a.











