Uwaezuoke: 'Anwụ na-achagbu anyị na Nollywood'

Aha onyonyo, 'Anwụ na-achagbu anyị na Nollywood' - Uwaezuoke

Stephen Anajemba, onye e ji Uwaezuoke mara na Nollywood, kọwaara BBC Igbo ka o siri malite ndụ ya.

Uwaezuoke kọrọ ka ya sị taa ahụhụ, kwaa 'baro' tupu ọ malite ịme ihe ejije.

Ọ sị na ya gwara ụmụ ya ha bakwala Nollywood maka na ego adịghị na ya.

Kirie ka ya na ije siri malite na ọrụ ya.

Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Chiemela Mgbeahuru.