Nollywood: 'Anaghị m agwọ ọgwụ ọ bụ ihe na-eme n'obodo ka anyị na-egosi' - Kanayo O kanayo

Aha onyonyo, 'Anaghị m agwọ ọgwụ ọ bụ ihe na-eme n'obodo ka anyị na-egosi' - Kanayo O kanayo

Dịka ndị mmadụ na-ajụ ma na-ekwu na ọ bụ ị gwọ ọgwụ ka e ji mara Kanayo O kanayo na ndị igbo nọ na Nollywood.

Kanayo bidoro were sị "Ihe anyị na-eme na Nollywood bụ ịnyomi ihe na-eme n'obodo ma na-egosi etu obodo dị".

O kwuru sị " ị na anụ maka ndị mmadụ na-efu izuụka ọbụla mgbe ha na-eme, anọkata chọwa ha achọwa ma asịkwa na-eji ha mee ọgwụ ego. Anyị na-eme ihe ejije iji gwa ndị mmadụ ka onye na-eme njem kpachapụ anya".

Kanayao rụtụrụ aka mgbe Ruben Agbati dere edemede maka ihe dị omimi n'asa rock were sị " Ihe anyị na-agwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'ihe ejije anyị bụ ka ha wepụ aka enwe n'ofe; kedu ihe onye bịara ị rụrụ obodo ọrụ ji ịgwọ ọgwụ eme?".