Ritual killings in Nigeria: Ejije anyị maka ọgwụ ego na-egosi ihe na-eme n'ụwa anyị - Ndị Nollywood

Clemson Cornell na-emekarị dibia n'ejije Nollywood

Ebe foto si, Clemson Cornell Facebook

Ụlọomeiwu Naịjiria enyela iwu ka a machie ihe ejije ọbụla gosiri ebe a na-agwọ ọgwụ ego.

Ha kwuru na ihe gbasara ọgwụ ego abanyela n'ọnọdụ gbatagbata na Naịjiria.

Toby Okechukwu bụ onyendu pati ndị na-anọghị n'ọchịchị n'ụlọomeiwu nta, kwuru na ọ bụ ejije Nollywood ndị gosiri ọgwụ ego so ebute nsogbu a.

Nke a na-eso ogbugbu e gburu otu nwaada dị afọ iri abụọ, wuru ewu na Naịjiria, n'ihe a na-eche bụ ogbugbu maka iji ya gwọọ ọgwụ ego.

A na-ebo ndị a nwụchiri maka ogbugbu ya ebubo iji ya gwọrọ ọgwụ ego, dịka ha bepụchara ụfọdụ akụkụ ahụ ya.

Clemson Cornell na-emekarị dibia n'ejije Nollywood

Ebe foto si, Clemson Cornell Facebook

Nkọwa foto, Ome ejije Clemson Cornell na-emekarị dibia n'ejije Nollywood

Ihe ndị Nollywood na-ekwu maka ya:

Kanayo .O. Kanayo bụ onye ejije Nollywood a ma ama ọkachasị maka etu o si eme ejije na-egosi ịgwọ ọgwụ ego tinyere ọnụ n'okwu a.

N'ihe onyonyo o tinyere n'elu Instagram ya, ọ sara ajụjụ a jụrụ ya ma Nollywood ọ bụ ihe mere igbu mmadụ maka ọgwụ ego ji arị elu.

O kwuru sị "Ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ m n'ekwentị na-ekwu na ọ bụ Nollywood mere ka ịgwọ ọgwụ ego na-arị elu, kedụkwanụ ka anyị si ekwu ụdịrị ihe a? Uche adịghị n'okwu a.

"Nollywood dịka ebe mmepụta ejije dabere n'ihe na-eme n'ụwa. Anyị na-eme ejije gbasara ihe na-eme n'ụwa ka o si eme.

"Nke bụ eziokwu dị mwute bụ na Naịjiria na Afrịka nwere nkwenye na ntụkwasị obi n'ihe gbasara ịgwọ ọgwụ ego.

"Naanị obere pasentị ejije bụ ihe na-egosipụta ihe ndị a na-eme n'ụwa anyị, ejije anyị na-egosikwa ihe ndị ọzọ na ndụ anyị dịka nkwenye na ntụkwasị obi n'okpukperechi ndị ọzọ.

"Ụzọ kacha mma iji ebuso nsogbu (ọgwụ ego) a agha bụ iṅogharị ụwa anyị, nye ndị be anyị ọzụzụ ka ha ghọta na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ"

Peace Anyiam-Osigwe bụ onyeisi otu ndị na-emepụta ejije (Association of Movie Producers) na Naịjiria, kwukwara otu ihe ahụ.

Ọ gwara BBC Igbo na ejije ha na-emepụta na-egosi ihe na-eme n'ụwa.

O kwukwara sị na obodo emebiwo, na ihe na-ebe si n'ụlọ bere akwa pụta ezi, na ndị nne na nna anaghịzị akụnye ezi ụkpụrụ ha kwesịrị, dịka ọ na-adịbu na mbụ.

Victor Okhai bụ onyeisi ndị na-ahụ maka nhazi usoro e si eme ejije (Directors Guild of Nigeria), kwuru sị na ọ bụghị ndị ejije ka ihe na-ebe si n'aka.

O kwuru na mba Amerịka anaghị atụ Hollywood aka maka ihe gbasara mwakpo, oke obubu egbe na mgbagbu ndị omekome na-eme na mba ahụ, n'agbanyeghi na ọtụtụ ejije ha na-eme na-egosi ihe ndị a.

O kwuru na ọ hụghịkwa etu ịkọ ntaakụkọ (redio, TV na akwụkwọ ozi) gbasara ogbugbu na ịgwọ ọgwụ ego si eme ka ịgwọ ọgwụ ego bawanye.

Gịnị ka ndị 'Censors Board' na-ekwu maka ya?

Alhaji Adedayo Thomas bụ onyeisi ngalaba National Film and Video Censors Board (NFVCB), gwara BBC Igbo na aka Nollywood adịghị n'ihe na-ebe, n'ihi na ejije Nollywood niile na-esi n'aka ha agafe.

O kwuru na ejije Nollywood niile na-enwe ihe a na-akpọ 'rating', nke bụ na ọ bụrụ na ọ dịghị mma, na ha agaghị enye ha ikike ibiputa ya.

O kwukwara na ọrụ ha bụ ịhụ na ejije niile ruru ha aka kuziri ezigbo ihe, na ejije ha niile na-egosi na ọrụ niile nwere ụgwọ ya, nke bụ na onye mee ihe ọjọọ n'ejije, aka iwu ga-akparịrị ya.

Gịnị bụ ọgwụ ego?

Ịgwọ ọgwụ ego bụ usoro ụfọdụ mmadụ chere na a ga-esi bute ego ọsịsọ site n'igbu mmadụ nakwa ịtụ aja ọjọọ dị iche iche.

Onye dibịa na onye na-achọ ego ga-eme ụfọdụ omerịa ha chere ga-ebute nnukwu ego.

Ọtụtụ mgbe onye ha na-egbu na-abụkarị onye ha ghọgburu maọbụ onye ha tọọrọ, ma na onye ahụ anaghị ama na ha ga-eji ya agwọ ọgwụ ego ruo mgbe ọnwụ bịachara ya nso.

Aha onyonyo, Ihe ndị dibia kwuru banyere ọgwụ okeite na-ewu