Etu nwa m si gbanahụ ọnwụ n'aka 'onye chọrọ iji ya agwọ ọgwụ ego' - Ken Ekwus
Ken Ekwus sị na nwa ya dị afọ 14 gbalahụrụ ogbugbu n'aka otu nwoke a na-enyo nke a sị na chọrọ igbu ya n'obodo Ubommiri, dị n'okpuruchịchị Mbaitoli nke Imo Steeti.
Ọ sị na nke a mere n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị, afọ 2022, mgbe nwoke a bụ onye agbataobi ha e boro ebubo gwara nwa ya ka o nyere ya aka tinye akara 'whatsApp' n'ekwentị ya.
Ekwus sị na nwa ya sorola nwoke a e boro ebube banye n'ime ụlọ, chee na ọ gara iwete ekwentị ya.
- Lee nwoke ndị uweojii na-enyo maka igbu ụmụ ya atọ n'Enugu steeti
- Nwokoroọbịa gburu nwoke a n'Ihitte/Uboma zutere ọnwụ ya n'aka ndị ntoroọbịa obodo
- Etu di na nwunye ụmụ anọ ha nwụrụ n'otu ụbọchị si agbakee ugbua n'Umuahia
- Etu onye omekome siri were mma gbuo nne m n'Owerri - Ambrose Nwaogwugwu
- Etu nwunye Leohand Lyeanyi ndị uweojii India gburu si eri uju ọnwụ di ya
Ọ maghị na nwoke ahụ banyere n'ime ụlọ ya were mma oge si n'azụ gbuo nwa ya n'isi.
Ọ sị na ka nwa ya chọrọ ịgba ọsọ, nwoke ahụ gbukwasịrị ya mma n'ihu nakwa n'olu.
"Nwa m jisiri ike gbapụta ma tie mkpu maka enyemaka.
Ndị bịara zọpụta ya jụrụ ya ihe mere, ọ sị na nwoke ahụ chọrọ ya, na ọ dị ka ọ chọrọ iji ya gwọọ ọgwụ ego.
Otu onye agbataobi m buuru nwa m gawa n’ụlọọgwụ."
Ọ sị na ha mechakwara buru nwa ya gaa n’ụlọọgwụ ọzọ ebe a kwara ya isi.
Ekwus gara n’ihu kwuo na ndị uweojii bịara nwuchie nwoke kpara arụ a.
A chọpụtara ili e gwuru egwu n'ime ụlọ nwoke a sị kpara arụ a.
Gịnị bụ ịgwọ ọgwụ ego?
Ịgwọ ọgwụ ego bụ usoro ụfọdụ mmadụ chere na a ga-esi bute ego ọsịsọ site n'igbu mmadụ nakwa ịtụ aja ọjọọ dị iche iche.
Onye dibịa na onye na-achọ ego ga-eme ụfọdụ omerịa ha chere ga-ebute nnukwu ego.
Ọtụtụ mgbe onye ha na-egbu na-abụkarị onye ha ghọgburu maọbụ onye ha tọọrọ, ma na onye ahụ anaghị ama na ha ga-eji ya agwọ ọgwụ ego ruo mgbe ọnwụ bịachara ya nso.
Ihe ndị uweojii kwuru
Ndị uweojii Imo steeti sị na nwaamadị ahụ a na-enyo mere ihe a ekwughi ihe mere o ji chọọ igbu nwata ahụ, kama na ha ka na-eme nnyocha.

