Suya Death Umahia: Etu di na nwunye ụmụ anọ ha nwụrụ n'otu ụbọchị si ebi ndụ ha ugbua

Di na nwunye ụmụ anọ ha nwụru n'otu ụbọchị

Chibuzor Kenneth Ikwunze na nwunye ya ka na-akwa akwa maka ọnwụ ụmụ ha anọ nwụrụ n'otu ụbochị n'Abia steeti.

O kwuru na ọ kpọgara ụmụ ya anọ na bee ọyị ya nwoke na-aza Sunny n'Umuahia ka ha na ndị bee ya nọrịa n'ọnwa Ọgọstụ.

Ọ kpọpụtara aha ụmụ ya anọ dịka Kelechi(afọ iri na abụọ), Chimdi(afọ iri), ọlụọmachi(afọ asatọ) na Kingsley(afọ atọ).

"N'ụbọchị Ọgọstụ 25, 2021, ka a kpọrọ m n'ekwenti si na Sunny anwụọla, e mechara kpọm si na ụmụ m niile anwụọla."

O kwuru na mgbe ọ gwara nwunye ya na ụmụ ya anọ anwụọla, ọ dara n'ụzọ.

Ikwunze kwuru na ụmụ abụọ Sunny nwụkwara n'otu ụbọchị ahụ nke mere ya ozu asaa tọgbọọ na bee Sunny mgbe ọ garuru ebe ihe mere.

Ihe a gwara m gburu ụmụ m ụbọchị ọdachị a merenụ

Nne na nna ụmụ ha anọ nwụrụ ka ha tachara Suya

Ikwunze kwuru na nwunye Sunny nọkwa n'ọnọdụ amaghị onwe ya n'ụlọọgwụ.

Mgbe ọ nwetere onwe ya, o kwuru na ụmụaka anọ ahụ nakwa di ya na ụmụ abụọ ha bu ụzọ rie Suya na juice ma rikwa nri ndị ọzọ nke mere na ọ maghị nri nke kapatara ọnwụ ha.

O kelere Chinedu Orji bụ onyeisi ụlọomeiwu Abia steeti biara ya mgbarụ ka elichara ụmụ ha nwụrụnụ.

O kwukwara na Orji nyere ya ụgbọala, nye ya ego ha ga-eji kwapụ n'ụlọ a ha bi ugbua ma nye ya ọrụ.

O nwere ka ha si mee nchọpụta ebe e si gote ya bụ Suya?

Foto Kelechi(afọ iri na abụọ), Chimdi(afọ iri), ọlụọmachi(afọ asatọ) na Kingsley(afọ atọ) mgbe ha dị obere

Chibuzor Ikwunze kwuru na ọ hụrụ ka ọyị ya nwoke na-egote Suya ahụ ya na ụmụ ya mechara taa.

"Anyị ka na-eche ka nyocha "autopsy " nke gọọmenti pụta ka nayị mara maọbụ Suya maọbụ ihe ọzọ gburu ụmụ anyị nakwa ọyị nwoke na ụmụ ya."