Enugu State News: Lee nwoke ndị uweojii na-enyo maka igbu ụmụ ya atọ n'Enugu steeti

Aha onyonyo, Enugu Frozen Children: Nwoke egbuola ụmụ ya atọ makana nwunye ya enyeghị ya aramara

Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugu steeti bụ Abubakar Lawal, ezipụtala ozi iti aka n'obi nye ezinaụlọ Millicent Amadikwa, onye a sị na di ya bụ Ifeanyi Amadikwa gburu ụmụ ha nwaanyị atọ ma tọgbọ ozu ha n'igbe njụoyi.

N'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu steeti bụ Daniel Ndukwe zipụtara n'ụbọchị Wenzde, o kwuru na nnyocha ha gosiri na aka nwoke ahụ nwereike ịnọ n'ebubo a na-ebo ya, dịka nnyocha ka na-aga n'ihu.

Onye a na-enyo n'ọnwụ ụmụaka atọ

Ebe foto si, Nigerian Police Force

Nkọwa foto, Onye a na-enyo n'ọnwụ ụmụaka atọ

Ndị uweojii ziputara foto Maazị Amadikwa, ma kwuo na ha bugara ụmụaka atọ ahụ ụlọọgwụ ebe ndị dọkịnta kwuru kpọmkwem na ha anwụọla n'ezie.

Ha kwuru na ha bugara ozu atọ ahụ ebe a na-enyocha etu mmadụ sị nwụọ.

Maazị Ndukwe kwuru, "Dịka Kọmishona ndị uweojii bụ Abubakar Lawal na-ezipụta ozi iti aka n'obi a, anyị chọrọ ka ọ mara na anyị eforola ntutu taa ịhụ na anyị chọpụtara kpọmkwem ma aka Maazị Ifeanyi Amadikwa a dị ọcha, ma hụkwa na e nyere ezinaụlọ a ikpe ziri ezi".

O gakwara n'ihu kwuo na e nyela osote Kọmishọna nọ n'isi ngalaba ndị uweojii bụ "State Criminal Intelligence and Investigation Department" iwu ka o soro okwu a ruo n'isi mmiri.

Cheta na akụkọ a dapụtara na mpaghara Emene nke Enugwu steeti, n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022.

Ka akụkọ si kwuo, aha ụmụaka atọ ahụ bụ Chimdalu dị afọ iri na otu, Amara dị afọ asatọ na Ebube dị afọ ise.

Millicent Amadikwa bụ nwunye nwoke ahụ kwuru na mgbe ha gara ikpesara ndị uweojii maka ya bụ ọdachị na mbụ, na ọ gwara ndị uweojii na ọ bụ di ya ka ọ na-atụ aka.

O kwuru na ihe mere o ji na-atụ di ya aka bụ na mgbe ọbụla okwu na-esere ha, di ya na-ekwu na ọ ga-egbu ya na ụmụ ya.

Millicent kwuru na ha emeela mkpesa n'aka ndị uweojii Area Command dị n'Enugwu, mana ndị uweojii ngalaba CID abatala n'okwu.

Gere ihe o kwuru n'uju;