Justice for Chidubem: Ndị uweojii anwụchịela di na nwunye a sị jichiri nwa Gift

Oti na Tina Ogbonnaya, Gift na Baby Chidubem

Ebe foto si, Screengrab

Maazị na Oriaku Oti Ogbonnaya agọọla aka ha na ụkwụ ha ma kwuo na akụkọ na ha napụrụ otu nwaada na-agbaburu ha odibo nwa ọnwa ise n'ihi ụgwọ o ji ha bụ okpotokpo asị.

Ha kwuru na nwaada ahụ gbahapụrụ nwa ya n'aka ha gawa ebe ọ na-agba alabankọ tupu ọdachi adakwasị nwa ọhụrụ ahụ.

Nwaada a kpọrọ Gift Nwafor dị afọ 19 n'akụkọ wuru ewu na soshal midia na nsonso a boro ebubo na nne ya ukwu bụ Tina Ogbonnaya napụrụ ya nwa ọhụrụ bụ Chidubem, jichie ya n'ihi na ya akwụlighị ụgwọ ọ kwụrụ ya n'ụlọọgwụ maka ọmụmụnwa.

Nke a na-abịa dịka foto nwa ọhụrụ ahụ bụ Chidubem, gbara n'ịntanet na-egosi ebe ahụ bụ ya sọ mma nakwa ebe ọ dị nke onye agụ na-achọ igugbu nke kuzuru iwe ọha ndị mmadụ.

Mana dịka ndị uweojii nwụchiri nne ya ukwu na di ya bụ Ogbonna, ha kọwara na ọ bụ Gift bụ onye ha ji Chi-Chi mara hapụrụ ha nwa n'aka ha gbafuo.

Maazi Oti na Tina Ogbonnaya

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Maazi Oti na Tina Ogbonnaya sị na tupu Gift agbapụ n'ụlọ ọ naghị ekwe enye nwa ya nri

Dịka Maazị Ogbonnaya siri kọwara ụlọ ntaakụkọ Punch, ọ gara obodo ya (n'Arochukwu, Imo steeti) n'ọnwa Disemba afọ 2020 ịkpọta nwata ga na-enyere nwunye ya aka ilekọta nwa ha, "A hụrụ Chi-chi n'afọ ime, o nweghị onye na-elekọta ya."

"Kwa ụtụtụ ọ bịa n'ihu be m na-arịọ m ka m kpọrọ ya gaa Legọs, na ya ga-enye elekọta nwa m."

"Agwara m ya na m enwetala onye ga na-enyere anyị aka ileta nwa m."

"Ya na-arịọ m si na ya enweghị onye enyemaka, na ya enweghị nne, na ya enweghị nna onye ga-enyere ya aka."

O kwuru na mgbe ha rutere Legos, na afọime ahụ nyere Gift nsogbu nke na ọ mụlighị ya mgbe ọnwa zuru nke mere ka ha kpọrọ ya na-agbagharị na dibia Bekee na nke Igbo tupu ọ mụọ nwa ahụ.

"O meghị otu ọnwa ọ mụchara nwa, ọ gwa m na ọ chọrọ ịga ala Igbo na o nwere otu nwanne ha gbatara ya akwụkwọ ule ka ya gaa lee ya" .

Maazị Ogbonna kwuru na ya na nwunye ya nyere ya ego ma zụkọrọ ya ọtụtụ ihe o jiri laa.

Aha onyonyo, Ndi na-ezu nwa

Ha gwara ya kpọrọ nwa ya gawa, mana ọ jụrụ, si ha ọ chọghị ka ndị obodo mata na ya mụrụ nwa.

"O lekwaghị ule, o rughị abalị atọ, ya akpọwa m n'ekwentị sị na ya chọrọ ịlaghachi Legọs, m zitere ya ego ụgbọala."

"M jụọ ya ego e nyekwara gị mgbe ị na-ala, ya sị na na ọ gwụla."

Ha zigara ya ego ụgbọala o were lọghachikwu ha.

O kwuru na abalị ole na ole ọ lọtara, ya agwa ha na ya ahụla ọrụ.

Aha onyonyo, Di na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara

"A sara m ya sị, 'ezitere m gị ego ụgbọala ka ịlọta bịa lekọtawa nwa m na nwa gị, kedụkwa nke bụ na i nwetala ọrụ?"

" Ọ kwuru na ya nwetara ọrụ n'ụlọoriri na nkwarị ebe m ma na ụmụagbọghọ na-agba alabanko na-ebi."

"Agwara m ya na ị gaghị na-elekọta nwa m na-arụ n'ụdị ebe ahụ."

O gara n'ihu kwuo, na Gift gbapụrụ n'ụlọ, hapụrụ ha nwa. Mana ha nwetara ozi na ọ nọ n'ụlọ ebe a na-agba alabanko.

O kwuru na ha wegara okwu ya n'ogige ndị uweojii na Lemora, onyeisi uweojii gwara ha ha wetara ha ozi oge ọbụla ha hụrụ nwaada ahụ.

Ọzọ ha nụrụ bụ n'akụkọ ha gbara na ha napụrụ ya nwa n'ihi ụgwọ o ji ha.

Oriaku Tina Ogbonnaya kwuru na ọnọdụ nwa ọhụrụ ahụ agbajọọla tupu Gift agbapụ n'ụlọ n'ihi na Gift ma ụma akwụ nwa ọhụrụ ahụ agụụ.

" Emere m onyonyo, kpọọ ndị agbataobi sị ha bịa hụrụ ihe na-ahụ gosi ha nwa Gift."

" Ụfọdụ n'ime ha gwara m na ha achọghị ịkụkọ isi mụ na nwaanne m (Gift) na ọ bụ ya bụ ihe mere na ha anaghị akọrọ m ihe Gift na-eme ma m pụọ n'ụlọ?

"Ha gwara m na ọ naghị enye nwa nri na ụfọdụ na ọ na ahapụ ya gawa na klọb dị nso n'ebe anyị bi."

Nwaanyị a na-ebo ebubo ịnapụ Gift nwa ya nọzị n'aka ndị uweojii

Foto nwada Gift na nwa ya nwụrụ anwụ

Ebe foto si, BBI/Screengrab

Onyeisi ụlọọrụ "Behind Bars Human Rights Foundation" na Legọs bụ Maazị Chibuike gwara BBC Igbo na ndị uweojii anwụchịela otu nwaanyị aha ya bụ Tina bụ onye a na-ebo ebubo ijibido nwaa onye odibo ya bụ Gift.

Ọ bụ nwaanyi ahụ na di ya ka ndị uweojii na ulọọrụ ha n'Ajah ji ugbua.

Ihe bịara n'azụ akụkọ wuru na soshal midia nwaanyị ahụ jibidoro nwa onye odibo ya dị afọ 18 akpọrọ Gift maka ụgwọ a si o ji ya.

Akụkọ ọzọ mechara pụta na nwatakiri ahụ mechara nwụọ n'ụlọ ọgwụ ụnyaahụ.

Site n'ọnụ Maazị Chibuike, ndị uweojii amalitela nnyocha n'okwu a dịka anwụchịrị nwaada Tina na di ya bụ ndị kpara nkata njibido nwatakiri ahụ.

Cheta Maazị Harrison Gwamnishu bụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye depụtara ozi banyere okwu a na Facebook n'ụbọchị Fraịde.

Dịka akụkọ nwaada Gift malitere ifeghari na soshal midia, o zipụtara ozi site n'ihe oyonyo ya na ndị ụlọọrụ ntaakụkọ Punch mere taa bụ ụbọchị Satọde ebe ọ gbara ama ihe ndị ọ si bụ eziokwu na akụkọ a.

N'ihe onyonyo ahụ, Gift kwuru na di nwaanyị ahụ ya na ha bi bụ Tina si Imo steeti kpọọta ya Legọs n'ọnwa Jenụwarị ka ọ gbawara ya odibo.

O kwuru na mgbe ọ malite ibi n'ụlọ ha ka ha chọpụtara na ọ dị ime.

Etu Gift siri banye n'aka ndị a ọ na-ebo ebubo

Gift si; "Nwoke tụbara m ime bi n'Abuja, ọ ma maka ihe niile gbasara okwu a ugbua."

Gift kwuru na nwoke ahụ kpọtara ya Legọs bụ onye agbataobi ya n'obodo ha nọ n'Imo steeti.

O kwukwara na ọ mụrụ nwa ya n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Juun n'ụlọọgwụ ebe ezinụlọ ahụ o binyere dụgara ya.

Ka o si kwuo, mgbe ọnwa ole m ole gachara, ezinụlọ ahụ malitere nyewa ya mmekpa ahụ maka ụgwọ ego e ji leta nwa ya ma nye ya ọgwụgwọ dịka onye mụrụ nwa n'ụlọọgwụ.

O kwuru n'ihe onyonyo ahụ; "N'ụbọchị nke mbụ n'ọnwa Nọvemba, nwaanyị ahụ m binyere zipụrụ m ozi n'ime abali, mgbe m lọtara, di ya malitere bawara m mba, na-akpọ aha na m gara gbaa akwụna n'ezi."

Dịka o siri kwuo, "Mgbe ahụ ka o ji iwe tụpụrụ m ngwongwo niile n'ezi ma si na ha aghaghi enye m nwa m ruo mgbe m kwụchara ụgwọ m ji ha."

O gara n'ihu kwuo na di Tina kwuru na ụgwọ o ji ha bụ puku nari naịra abụọ (N200,000.00) mana Tina kpọghachiri ya azụ n'ekwentị sị ya na ụgwọ o ji ha bụ nde naira ise (N5,000,000.00).

Gift kwukwara na o nwere mgbe ya bụ nwaanyị sị ya kwụọ nde naira anọ (N4,000,000.00) mechaa sị ya kwụọ nde naira ise.

O kwuru na mgbe achọpụtara na ahụ adịghị nwa ya na akpọgara ya ụlọọgwụ ebeọ nọrọ izu abụọ tupu ọ nwụọ.

Otu nwaanyị bụ onye agbataobi ezinụlọ di na nwụnye ahụ aha ya bụ Amarachi tinyere ọnụ n'okwu dịka ọ pụtara n'ihe onyonyo ahụ ndị ụlọọrụ ntaakụkọ Punch zipụtara gbaa ama n'ihe ọ ma maka okwu a.

Amarachi kwuru na o bi nso ụlọ ndị a kpọtara Gift Legọs.

O kwukwara na oge nwaada Gift malitere i binyere ezinụlọ ahụ na ihe niile nọ na-aga nke ọma mana ọ chọpụtara na ha malitere meekpawa ya ahụ.

O sị na kwa mgbe kwa mgbe nwaada Gift na-abịa ebesara ya akwa na o ribeghi nri.

O kwukwara na ma mmiri ọkụ e ji a saa nwa Gift ahụ bụ okwu nye ezinụlọ ahụ dịka nwaada Gift na-abịa arịọ ya mmiri o ga eji asaa nwa ya ahụ.

Amarachi gbara ama mmepe ahụ o si ọ hụrụ ezinụlọ ahụ na-enye nwaada Gift nke mere o ji nabata ya ka o binyere ya mgbe ha chụpụrụ ya.

Etu okwu a siri malite

Maazị Gwamnishu gwara BBC Igbo etu o siri nụta kepukepu maka ihe mere nwata were chọwa nne ya.

Dịka o siri kọwara BBC Igbo, Gwamnishu sị na otu nwata nwaanyị dị afọ 18 tiri mkpu enyemaka makana o sị na nne ya ukwu jichiri nwa ya ọhụrụ dị ọnwa ise maka ụgwọ o ji ya.

Nwaada ahụ a kpọrọ Gift, onye Imo steeti sị na ọ na-arụrụ nne ya ukwu ọrụ tupu ọ dị ime mụọ nkwa maka na o nweghị ike ịkwụ ụgwọ ụlọgwụ ya nke pụtara narị puku abụọ na ụma.

Aha onyonyo, Gịnị ka omenala Igbo na ndị ụka kwuru gbasara usoro IVF?

Gift si na Nne ya ukwu a kpọọ Madam Tina bụ onye si Imo steeeti kpọpụta ya na Legọs kwụrụ ụgwọ ụlọọgwụ ahụ ma gwa nwatanwaanyị ahụ na ọ ga-akwụghachi ya.

Maazi Gwamnishu sị; "Nne ya ukwu narala ya nwa ya oge nwata nwaanyị ahụ enweghị ike ikwuli ụgwọ ahụ."

O were ndị Uweojii na Ngalaba na-ahụ maka ọdịnamma ntoroọbịa na obodo itinye ọnụ n'okwu tupu nwaanyị ahapụ nwa ọhụụ nke a hụziri n'ọnọdụ ọjọ.

Ka ọ dị ugbua, akpọgaala nwata ahụ n'otu ụlọọgwụ dị n'Ajah, Legọs steeti maka nleta. Mbọ niile BBC gbara ịnụta olu ndị uweojii Legọs amịtaghị mkpụrụ.

Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legos bụ Adekunle Ajisebutu, ọ zaghị ekwentị ya, nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwenti nakwa WhatsApp oge anyị kpọrọ.

BBC Igbo kpọkukwara Ministrị na-elekọta ọdịnamma ụmụnwaanyị, ha wee si na ha amaghị maka akụkọ a.

BBC Igbo akpokukwa ndị ọrụ na-elekọta ndị ntoroọbịa mana ha azabeghị ekwenti ha ruo ugbua.

Akụkọ ka na-abịa.