Ofo Igbo: Ihe dị iche na ọfọ, ọfọ ndị ichie na mkpụrụ ọfọ

Aka ji ọfọ
Nkọwa foto, Ndị Igbo kwenyere na onye ọbụla ji ọfọ ga-abụ onye aka ya kwụ ọtọ

Ọfọ bụ osisi a na-ahụta nanị na mpaghara ọdịda anyanwụ nke ndị sayensị na-akpọ ya Detarium Senegalense.

Mgbe ọbụla ọfọ batara n'obi onye Igbo, ọ bụ osisi eji mara ndị Ichie, Nze maọbụ Ọzọ.

Mana n'ala Igbo, a na-ejikwa mkpụrụosisi ọfọ esi ofe.

Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eche na o nwere ndịiche n'etiti osisi ọfọ na ọfọ nke e ji esi ofe.

Iji wepụ nghọtaghie a, BBC Igbo kpọtụrụ Chigozie Nnabuihe onye bụ ọkammụta n'ihe gbasara ala Igbo, ka ọ tinye ọnụ na ya bụ okwu.

Ọkammụta Nnabuihe bụ onye nkụzị asụsụ na Omenala Igbo na mahadum gọọmentị etiti nke dị na Legọs steeti.

Lee etu ya bu mkparịta ụka maka ọfọ siri gaa

Ọfọ
Nkọwa foto, Ọfọ

Ọkammụta Nnabuihe kwuru na osisi ọfọ bụ osisi bụrụ ibu dịka ọsịsị Apụ, Ụgba maọbụ Ọji.

O kwukwara na ndị Igbo nyere ọfọ ọnọdụ dịka osisi eji ekwu eziokwu, ikike e ji akwụrụ n'ụzọ eziokwu na ikike eji ahụ na enweghị onye a na-emegbu.

Ọ kọwara na ọ bụ ya mere ndi Igbo ji ekwu, " O ji ọfo ga-ala".

O kwuru sị. "Ndị ọcha amaghị ihe ha ga-akpọ osisi ọfọ. Ọ bụ nanị n'ọdịda anyanwụ Afrịka ka a na-enweta osisi ọfọ".

Nnabuihe kọwara na dịka ụdara na ụfọdụ osisi ndị ọzọ, na anaghị ata ya ata kama eji ya esi ofe.

Ọ kọwara si "a na-eji mkpụrụ ime ya esi ofe, eji ya eme ka ofee rọọ arọ."

Nnabuihe kwuru sị na onye chọrọ ịmetọ ọfọ ga, "e nwere osisi a kpọrọ agbalị kee n'ukwu ọfọ, mgbe e mere nke a, mkpụrụ niile nọ na ya bụ osisi ga-adasịsị n'ala".

Kedụ etu esi enweta osisi ọfo nke ndị ichie na-eji n'aka?

Aha onyonyo, Gịnị bụ ọfọ?

Nnabuihe kwuru na e nwere usoro e ji enweta osisi ọfọ nke ndị Ichie na-eji. Ha gụnyere:

  • Ya bụ osisi ga-eji aka ya darụọ ala.
  • Otu ihu ya ga-echewe ihu n'ọdịdị anyanwụ ebe ihu nke ọzọ ga-echewe ihu na ọwụwa anyanwụ.
  • Osisi a, onye ga-atụụta ya ga-abụ nanị nwoke na-amatabeghị nwaanyị maọbụ nwaanyị na-amatabeghị nwoke.
  • Mgbe onye ahụ wetara ya, ọ ga-enye ya onye a na-akpọ "Ojiọfọ".
  • Ojiọfọ ga-aga mee ihe a na-akpọ mwake, ngwangwa ọ waakechara ya, ọfọ ahụ ga-adị ire.

Ihe dị iche na Ọfọ, mkpịsị ọfọ na osisi apịrị apị

Ukwu osisi ọfọ
Nkọwa foto, Ukwu osisi ọfọ

Nnabuihe mere ka anyị ghọta na ọfọ bụ mgbe mmadụ soro usoro anyị depụtara na mbụ, nke bụ na Ojiọfọ awakeela ya.

O kwuru sị, "ụfọdụ na-aga tụtụrụ osisi ọfọ ha hụrụ n'ala na-esoghị usoro mwaake, ihe a na-ekwu bụ na onye ahụ ji mkpịsi ọfọ".

Kama Nnabuihe kọwara na onye gara were mma gbute ọfọ nke ya, ihe ana-ekwu bụ na onye ahụ ji osisi apịrị apị.

Ọfọ nke anaghị ahụ anya

N'asụsụ Igbo, mmadụ iji ọfọ pụtara mmadụ ịkwụwa aka ọtọ, ikwu eziokwu, nakwa izere ihe ọjọọ.

Ndị Igbo na-ekwu okwu dịka: "Ejikwaara m gị ọfọ na ogu", "Ihe onye na-eme ya jidekwa ọfọ", dịrị gawazie.

Mgbe a kpọrọ ọfọ n'ụzọ dị otu a, ọ pụtaghị ọfọ nke a na-ahụ anya, kama ọ bụ iji gosi eziomume.

Aha onyonyo, Nwaanyị lụtara nwa ya nwụrụ nwaanyị

Na nchịkọta

Ọkammụta Nnabuihe kwuru sị, "Ọ bụ osisi ọfọ mịtara mkpụrụ nke e ji esi ofe ma ọ bụ kwa alaka ya ga-eji mere ọfọ ndị ichie".

Ọ chịkọtara ya were si, "Ọfọ bụ ike, ọfọ bụ ndụ, ọfọ bu Igbo".