Ụmụntoroọbia Enugwu emeela ngagharịiwe maka 'Enugu Pension for life bill'

Onyeisioche ụlọomeiwu Enugu steeti bụ Edward Ubochi ebutuola akwụkwọ iwu gbasara ibuli ụgwọọnwa ezumike nka ndị gọvanọ chiburu steeti ahụ.
Nke a sochiri ngagharịiwe ụmụntorobịa Enugu steeti mere maka ụgwọ ọnwa ezumike nke ndị gọvanọ ndị omeiwu chọrọ iji pasent narị atọ bulie elu.
Ụbọchị bụ onye zutere ụmụntọrọbịa ahụ iwe dị n'obi n'ihe ụlọọgbakọ omeiwu nke Enugu kasiri ụmụ ntorobị ahụ obi rịọ ha ka ha dere jụụ.
Ọ gwara ndị ntorobịa na ha ahụbeghị ya bụ akwụkwọ, "ọ mgbe anyị hụrụ ya anyị amara ihe anyị ga-ekwu". "Ọ bụrụ na anyị hụ ya, ọbụru na ọtụtụ ndị mmadụ achọghị ya, anyị etufuo ya".
Ọ rịọrọ ha ka ha nwee ndịdị chere mgbe ha ga-ezukọ.
Ọ kpọkwara ha ọkụ ka ha gbaa mbọ bịa ọgbakọ nke ọha bekee kpọrọ "Public hearing bụ mgbe ndị mmadụ ga-enwe ohere tịnye ọnụ na ya bụ okwu".

Ndi ntorobia ọnụma juru obi bucha ederede di iche iche dika, "anyị achọghi atụmatụ atụmatụ a" , "ọkụ adighi n'Enugu", "ụkọ mmiri di n'Enugu", "akwubegi ndi lara ezumike nka n'Enugu ụgwụ ruoro ha", "ọrụ adighi gbanye na atụmatụ a abụghi maka ọdinma ndi Enugu".
N'okwu ha gwara onye ntakụkọ anyi gbara ha ajụjụ ọnụ, ndi ntorobia Enugu kpọrọ oku ka a dọka ya bụ atụmatụ ma tufuo na ime ọhịa. n'ihi na-ọchataghi aja ọbụla.

Ebe foto si, Enugu State House of Assembly
Ụfọdụ ihe dị n'ime akwụkwọ atụmatụ iwu ahụ
N'ime ya bụ akwụkwọ, ọ bụrụ na ndị omeiwu ahụ mere ya ka ọ bụrụ iwu ndị niile chiburu steeti ahụ mbụ na nwunye ha kwesiri;
- Inweta ụgwọọnwa ezumike nka tutu ha nwụọ bụ nke ha gana adọrọ n'ego gọọmentị etiti na-enye kwa ọnwa.

- Ha gana erikwa ụgwọ itiaka n'obi ndị ọzọ.
- Ọ sịkwa na gọomentị ga-ahụ maka olili ndị gọvanọ ahụ maọbụ osote ha.
- Gọomentị kwesikwara ịkwụ ndị ọrụ ha ụkwọ dịka akwụkwọ kwụrụ.
Na ya bụ akwụkwọ onye ndụ ụlọomeiwu ahụ bụkwa isi ahụrụ kwawa okpu ya bụ akwụkwọ, Ikechukwu Ezeugwu, tinyere aka, ọ na-akọwa na e wepụtara akwụkwọ iwu abụghị na-etinyela ya aka ma na-arịọ ndị mmadụ ka ha nwee ndịdị.

Ka ọ dị ugbua, ya bụ ngagharịiwe ụmụntorobịa amitala mkpụrụ dịka "Speaker" ya bụ ụlọomeiwu budagoro ya bụ atụmatụ iwu ruo mgbe ha ga-agbakọ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Nke a bụ akwụkwọ onye ndụ ụlọomeiwu ahụ wepụtere maka igbo ndị mmadụ ọgụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Onye nnọchitere anya ndị ntorobịa ahụ sị na "anyị anụla ihe ha kwuru. Anyị ga-ala, mana ọ bụghị na e meriri anyị. Mana anyị gana egentị. Ọ bụrụ na ha mete ihe anyị ga-eji lọghachị, anyị abịa ọzọ.










